Nigeria Police recruitment: Ị chọrọ ịbụ onye uweojii? Lekwa usoro ndenye aha ọhụrụ

Ndí uweojii

Ebe foto si, Nigeria Police Force

Ndị uweojii Naịjirịa ekwuputala usoro ndị mmadụ gafere agba nke mbụ na njem iwe ọrụ ha nọ n'ime ya ugbua.

N'agba nke a nọ ugbua, ọ bụ nke ndị mmadu ga na-etinye asambodo ha n'akara ịntanetị ndị uweojii ji ahazi iwe ọrụ a.

Dịka ngalaba na-ahụ maka mmekọ ndị uweojii na ndị ọha siri dee na soshal midia n'ụbọchị 31 nke ọnwa Jụlaị, ndị na-achọ ọrụ ga-abanye n'ọba ịntanetị www.policerecruitment.gov.ng ma mee ihe ndị a:

  • Tinye akara njirimara a kpọrọ National Identity Number (NIN) n'ebe o kwesiri
  • Zaa azịza e kwesiri ịza
  • Tinye foto asambodo dịka: Asambodo ngụcha akwụkwọ, Asambodo ngosi oge a mụrụ mmadụ nakwa asambodo gosiri ebe onye si, nke Bekee kpọrọ "Certificate of Origin".
Usoro eji ewe ndi uweojii

Ebe foto si, Nigerian Police

Ihe ọzọ onye ahụ na-achọ ọrụ ga-eme iji hụ na a nabatara nke ya bụ:

  • Ịpị ebe gosiri na i kwenyere n'ihe a na-eme
  • Ibipute akwụkwọ ga-egosi na a nabatara ihe i mere
  • Ibipute akwụkwọ onye ga-aṅụrụ gị iyi nkwado ga-ebinye aka.

Ọ bụ na Fraịde ka ndị uweojii Naijirịa kwuru na ha ga-abanye agba ọzọ n'atụmatụ iwe ndị mmadụ n'ọrụ nke afọ 2020.

Ha sị na onye nwere nsogbu kpọọ ekwentị ha bụ 08100004507, maọbụ zie ozi n'email ha bụ [email protected] maọbụ [email protected].