Orji Uzor Kalu, Dino Melaye, Deiziani Allison-Madueke na dị ọzọ dara ọrịa mgbe akpụpụrụ ha n'ụlọikpe maka nrụrụaka

Ndị rụbụrụ ọrụ na gọomentị Naijirịa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka Oji Uzor Kalu tinyere akwụkwọ ka enye ya ohere ka ọ gaa ụlọọgwụ maka na ahụ esighi ya ike.

Ka ụlọikpe tọbara Kalu na mkpọrọ, ihe ọzọ a nụrụ bụ na ọ na-ayọ ka ụlọikpe tọhapụnụ ya ka ọ gaa ụlọọgwụ leta onwe ya.

Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, Orji Uzor kalu

Nke a abụghị ihe ọhụrụ na ntị ụfọdụ ndị Naijirịa, ihe kpatara ya bụ na enweela ụfọdụ ndị gọọmetị akpọpụrụ ụloikpe natara ohere maka ọrịa igbanahu ikpe dịrị ha.

Lee ndị ọzọ ji maka ahụ esighi ike gbanahu ikpe dịrị ha:

Diezani Alison-Madueke

Akụkọ ikpeazụ ndị Naịjirịa nụrụ maka oriakụ Alison-Madueke bụ na ọ na-arịa ọrịa kansa.

Diezani Alison-Madueke

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Diezani ka na-ago ebubo dị ya n'isi

Diezani bụ onye bubu Minista na-ahu maka mmanụ agbịdị na gọmenti etiti site afọ 2017 na 2015.

Mana n'afọ 2015, ọtụtụ ebubo nrụrụ aka pụtara n'isi Deziani.

Gọọmentị Naịjirịa kpachiri ego ruru ijeri 7.6b nke a na-ebo na ọ bụ ego Diezani.

Dino Melaye

Dino Melaye

Ebe foto si, @Sumner_Sambo

Nkọwa foto, Dino Melaye ji akwa ọrịa wuchie ụloikpe

Dino Melaye bubu onye Omeiwu ukwu nọchitere anya 'Kogi West' n'ụlọ omeiwu site n'afọ 2015 ruo 2019.

A kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo na o ji egbe na ngwa agha ụfọdụ.

Lee etu ọ dị mgbe awuchịrị ya:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Okaikpe ya bụ Mike Ozekhome gwara ụloikpe na site na ikike dịrị onwe, na Dino Melaye kwesiri ka enye ya ohere ịkwu ụgwọ mgbapụta ka ọ gaa leta onwe ya anya.

Ụlọikpe nyere ya ikike ka ọ gaa leta onwe ya.

Abdulrasheed Maina ji oche nkwọgharị bịa n'ụlọikpe

Abdulrasheed Maina onye rụburu ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahu maka ụgwọ ndị ezumike nka bụ 'Pension Reform Task Team' wuchiri n'ụlọikpe n'oche nkwọgharị ka e boro ya ebubo nrụrụaka ruru ijeri naịra abụo na ndị ọzọ.

Maina

Ebe foto si, Twitter

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Olisa Metuh bịara ụlọikpe n'akwa a na-ebugharị

Olisa Metuh

Ebe foto si, Twitter

E ji akwa mbugharị buru Olisa Metuh bata n'ụlọikpe n'ụbọchị ikpe ya.

Olisa Metuh bụbụ onye odee akwụkwọ mgbasa ozi ndị PDP, o nwekwara mgbe ọ dara n'ụlọikpe n'ụlọikpe n'Abuja.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Gọọmentị kpụgara Metuh ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya banyere nde naira anọ ha sị metụtara ego onye bụbụ onye ndụmọdụ Naịjirịa maka nchekwa bụ Sambo Dasuki .

Bello Haliru Mohammed

Bello Haliru Mohammed

Ebe foto si, EFCC

Nkọwa foto, Bello Mohammed wuchiri ụlọikpe n'oche nkwagharị

Oche nkwọgharị ka e jiri buru Bello Haliru Mohammed bata n'ụlọikpe.

Maazị Mohammed rụburu ọrụ dịka minista na-ahụ maka nchekwa obodo.

Gọọmentị Naịjirịa kpọpụruụ ya n'ụlọikpe maka nrụrụaka.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ụdịrị Biafra ndi Igbo kwesiri ịnwe olilanya ya - Tony One Week

Gee akụkọ Nkeji :

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile