Barcelona vs Real Madrid: Ha kere onwe ha agbụ

Barcelona na Real Maadrid

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

'O ji onye n'ala ji onwe ya' bụ ihe Barcelona Real Madrid mere onwe ha n'asọmpi El Clasico.

Barcelona nabatara Madrid n'ụlọ ha bụ Camp Nou buru n'obi ịkwọ ha ara mana Madrid gosiri ihe ha ji bụrụ dimkpa.

Onweghi onye ike dị inye ibe ya goolu agbanyeghi mbọ otu abụọ ndị a gbara.

Dịka ọ dị ugbua ha abụọ nọ n'otu akara iri atọ na isii na tebụlụ mana Barcelona ji ọnụọgụgụ goolu kara Real Madrid.

rụ akwụna emegideghi iwu

Akwụna adịghị njọ

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ekpebiela ikpe otu nwaagboghọ bụ Constance Nkwocha na mmadụ iri na ise ndị ọzọ gbara ụlọọrụ Ministrị Abuja na ndị otu ha maka ịwakpo ha.

Ikpe a nke ọkaikpe Binta Nyako kpebiri kwuru na ịgba akwụna emegideghị iwu na Naịjriịa dị ka akwụkwọ iwu kwuru na agba nke iri atọ na asaa 'Section (37)'.

Nke a pụtara na ndị uweojii enweghi ike ịwakpo ha n'ụdị ọbụla.

Ụlọikpe ahụ dara Ministri Abuja na ndị otu ha nha otu nde naịra na ụma ise (N1.6M) maka ịwakpo ụmụnwaanyị ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa akpọọla oku maka ọgbaaghara na Ghana

Ụlọọrụ ndị Sineti Naịjiria

Ebe foto si, @NGRSenate

Dịka ụlọomeiwu ukwu na-akpọ oku maka itinye anya n'okwu gbasara ndị mba Ghana Ịkpọchị ụlọahịa ụmụ Nịajirịa na mba ahụ ha jikwa anya nke ọzọ ebe akwa maka onye otu ha nwụrụ.

Akụkọ na-ekwu na onye na-anọchite anya Okigwe North Senitorial District n'Imo steeti bụ Ben Uwajimogu lara mmụọ n'abalị bọtara Wenezde.

Ụlọikpe ebiela ikpe ndị ọchịchị

Ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images

Ọzọ, ụzụ ọṅụ na-akpọtụọla n'obi gọọmentị dị iche iche taa ka ụlọikpe kpebiri ikpe ntuliaka ndị ọchịchị.

Ndị na-enwe ya bụ ọnụ bụ...

El-Rufai nke Kaduna

Abdullahi Sule nke Nasarawa

Udom Emmanuel nke Akwa Ibom

Sanwo Olu nke Legọs

Na Aminu Masari nke Katsina Steeti

Trump ga-amata ebe ọ kwụ taa

President Donald Trump ends a news conference in New York on September 25, 2019

Ebe foto si, Reuters

Nwanna taa ka a ga-ama ma onyeisiala Donald Trump aga-anọ ka ọ ga-apụ.

Ntuliaka na-aga n'ihu ugbua n'ụlọomeiwu nta n'Amerịka maka nke a.

Nke a mere ịchụpụ ya bụ onyeisiala mba Amerịka ji enwu enwu na Naịjirịa too bụ Wenezede nke bụ na ihe karịri mmadụ puku anọ nọ na ya bụ akụkọ na Twitter.

Ihe Reinhard Bonnke ruru n'Afrịka

Reinhard Bonnke

Ebe foto si, EVANGELIST REINHARD BONNKE - FACEBOOK

Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ otu nde na ụma bịara ọgbakọ Reinhard Bonnke na Legọs n'afọ 2000

Ọnye ọzụzụ atụrụ, Reinhard Bonnke bụ nwaamala mba Jamani wetere ihe dị iche n'usoro e sị efe Chineke na mbaụwa nke mere o jiri nwee ọtụtụ ndị nso bụ ndị nke na-eru uju ya ugbua ka ọ nwụrụ n'afọ 79.

Bonnke puruiche ma ya na ndị ọzọ busara ozi Krist n'Afrịka maa aka, site na Bill Graham nke Amerika ruo na Charles Spurgeon nke Briten.

Ọ bụ nwaamadị a mere ka enwee nnukwu ọgbakọ ndị ụka nke nwere ike ị nọrụ otu izuụka n'ọgbọ nke sara mbara buru sọ mma.

Mgbe ụfọdu ọ kpọtakwa ndị asụsụ dị iche iche maka ịtapịa okwu ya.

Ọ mechere nwe ndị oziọma na-ejije ya ka o sị ezisa ozi chukwu.

Tupu o mechie oziọma ya, ọ na-ajụ sị " kedu onye ometutere n'obi ịbịa were igweokwu a bịa zie ozi chineke?"

Oziọma ya maka ịgba ndị nọ n'ahụhụ ume n'Afrịka puruiche, ọkacha mba nọ na ahụhụ na ụka.

Onye Bụ Reinhard Bonnke?

  • A mụrụ ya n'afọ 1940 na Königsberg, Germany
  • Ọ meghere ụka Christ For All Nations (CFAN) n'afọ 1974
  • Ndị ụka ya kwuru na Bonnke kpọbatara mmadụ nde 79 n'ụka Kristi
  • Ọ nwụrụ na ụbọchị asaa nke Disemba, 2019

Ụfọdụ na-ekwu na mmadụ dịka TB Joshụa na ndị ozi Chineke ndị ọzọ n'Afrịka so nzọụkwụ Bonnke.

Real Madrid na Barcelona ga-akwata

Real Maadrid

Ebe foto si, AFP/Getty Images

N'egwuregwu, Barcelona na Real Madrid ga-akwata n'elekere asatọ nke abalị a.

Onyenkuzi Real Madrid kwenyere na ya bụ asọmpi ga-aga n'ihu agbanyeghị ngagharị iwe na-eme na Barcelona.

Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Nyocha usoro atụmatụ 'Visa free' - Abaribe

Senator Eyinnaya Abaribe

Ebe foto si, NASS

Nkọwa foto, Senator Enyinnaya Abaribe

Enyinnaya Abaribe akpọọla oku ka enyocha ọfụma usoro ga-enye ndị mba Afdrịka niile ịbata Naịjirịa ka o si sọ ha bụ 'Visa on Arrival' na Bekee nke onyeisiala Naịjirịa kwuru na a ga-amalite n'oge adịghị anya.

Abaribe bụ onye omeiwu na-anọchite anya Abia South n'ụlọomeiwu kọwara na ọ dị mma ịleta ụmụ Naịjirịa tupu eletaba ndị mbịara mbịara.

37 billion na-ese okwu

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ọ na-akpọtụrụ ụmụ Naịjirịa na soshal midia dịka ha na-akatọ ijeri naira iri atọ na asaa bụ nke ụlọomeiwu ukwu mapụtara iji ruzi ụlọọrụ ha.

Ụmụ naịjirịa na-ekwu na ego ahụ kwesiri ịbanye ebe ndị dị mkpa dịka agụmakwụkwọ, nwulite ahụike nakwa ịrụzi okporo ụzọ.

Mana ihe ha amaghị bụ na ego ahụ esighị na bọọjetị Naịjirịa kama n'ime bọọjetị Abuja.

ISWAP na ọdịnihu Afrịka

Abubakar Shekau

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Abubakar Shekau kwuru na ọ chọrọ ịkewara obodo nke aka ya ebe onye ọbụla ga

Ọchịagha ndị agha mba Fransị na-alụso ndị oyindụ egwu ọgụ n'Afrịka adọọla aka na ntị na ọ bụrụ na amaghị ihe e mere, otu ISWAP nwereike ịnọchị mba ndị dị na mpaghara Sahel Afrịka.

Francois Lecointre kwuru na ekwesịghị inye gbagharịa dapụtara na ọgụ ahụ ohere n'ihi na ISAWP ga-ewere ọnọdụ na ya.

Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ọkụ latrik adọgbuola ụmụaka abụọ na MacDonald's

Ụlọoriri Mikidees

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọoriri MacDonalds agbachiela ụlọọrụ ha niile n'abalị abụọ iji kwanyere ndị ntorobịa nwụrụ n'ụlọọrụ ha dị na mba Peru ugwu ikpeazụ.

Alexandra Inga na Gabriel Zapata nwụrụ mgbe ọkụ latrik dọgburu ha n'usekwu McDonalds ka ha na-arụ ọrụ n'abalị.

Akụkọ kwuru na ọku ahụ bu ụzọ jide Alexandra nke mechara jide Gabriel mgbe ọ gara ịnye ya aka.

Ngalaba na-ahụ maka nchekwa n'ụlọọrụ na Peru amalitela nyocha banyere ya bụ okwu.

Afọ isii? Mba!

Ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, HouseNGR/Twitter

Ụlọomeiwu nta agbajọọla mgbanwe iwu ala ga-enye onyeisiala nakwa ndị Gọvanọ sọsọ otu ikikere afọ isii ịnọ n'ọkwa.

John Dyegh nke Benue steeti chepụtara mgbanwe a kwuru na ọ ga-enye aka ịbelata oke tigbuo zogbuo na-arị ibe ya elu n'oge ntuliaka.

Naịjirịa na Hyundai enweela nkwekọrịta

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Onyeisiala Naịjirịa ekwuola na Naịjirịa nakwa ụlọọrụ nrụpụta ụgbọala bụ Hyundai ga-etikọta isi ọnụ ịhibe ụlọ nrụpụta ụgbọala ha na Naịjirịa.

Nke a pụtara n'akara Twitter onye eyemaka ya na mgbasaozi bụ Garba Shehu n'abalị Tusde.

Cheta na ndị mmadụ malitere ịjụ ajụjụ maka ọnọdụ Naịjirịa n'ọnwa Ọgọst mgbe Toyota kwuru na ha ga-ehibe ụlọọrụ ha na mba Gana

N'egwuregwu,

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ekwe kụrụ n'isi otu Liverpool mgbe Aston Villa ji ọkpụ goolu ise asataghị otu dọka neetị ha n'asọmpị Carabao Cup.

Cheta na ọ bụ otu abụọ nke dị obere Liverpool zutere Aston Villa Tusde.

Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile