Sinach songs: 'Ụfọdụ anaghị aghọta na aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ' - Sinach
Sinach bụ otiegwu a ma ama nke ezigbo aha ya bụ Osinachi Joseph (na-azabu Kalu) kọwara maka ndụ ya na mkparịtaụka pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere.
Ọ gwara BBC etu o si malite iti egwu, ọrụ ụkọchukwu Chris Oyakhilome rụrụ na ndụ ya iji mee ka ọ bụrụ onye a ma ama ugbua.
Sinach kwukwara etu o si zute di ya n'ụlọụka nakwa etu nwaanyị ọbụla kwesịrị isi na-ekpe ekpere inweta ụdịrị di Chineke nyere ya.
N'ihe gbasara etu o si bụrụ onye a na-anụ aha ya n'ụwa ugbua site n'egwu ya nakwa etu ndị na-etolite etolite ga-esinwu dị ka ya, o kwuru sị na ụfọdụ ndị na-ahụ naanị ebube ọ nọ n'ime ya ugbua, na ha anaghị ahụ ahụhụ a tara.
O kwuru sị na "Ụfọdụ anaghị aghọta na aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ".
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: