Ifeyinwa Fidelia Ezeiruaku: 'Onyeagha a mere m akaje n'ihi na m kelere ogbo ya nwoke'

'Corper' Ifeyinwa Ezeiruka na Lt Chika Anele

Ebe foto si, Ifeyinwa Ezeiruaku

Ifeyinwa Ezeiruaku, nwada ji otu afọ efe ala nna ya onye agha nwaanyị mere akaje na nsonso a akọwaala na ọ bụ maka na ya kelere onye agha nwoke butere nghọtaghie n'etiti ya na Lt Chika Anele.

Inye onyonyo wuru na soshal midia n'abalị Septemba 23, afọ 2021 gosiri ebe Lt Chika Anele o ji efere na-eku mmiri ọjọọ na-awụ nwaada Ifeyinwa Ezeiruaku ahụ ma na-akụ Ezeiruka efere ahụ o ji awụ ya mmiri n'isi dịka o sekpu ala.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Tuzde (sept 28), Ezeiruka kọwara na ọ bụ ekele ya kerele ndị ogbo Lt Anele ndị nwoke n'otu mmemme asọmpi ndị agha nke yanwa bụ Ifeyinwa rụrụ ọrụ dịka ka otu n'ime ndị na-anabata ndị ọbịa butere okwu.

"E kwere onye agha mụ na ya na-adị mma n'aka, Lt Chika Aniele baara m mba sị na onye nkịtị anaghị ejide onye agha aka ma ọ nọrọ n'uwe agha."

"E mechara, oge e kere ihe mmegharị ọnụ, otu onye agha welitere isi gwara m na ihe oriri e nyere ya daara n'ala, m nye ya ọzọ, akọwara m ya na ọ gwụla, na nke fọrọ bụ nke naanị ndị na-egbu asọmpi ahụ."

Nwada Ifeyinwa Ezeiruaku
Nkọwa foto, Nwada Ifeyinwa Ezeiruaku gụrụ 'Linguistitics na Lagos State University ji otu afọ efe ala nna ya na 13th Brigadier, Calabar ebe onyeagha nwaanyi ji mmiri ụrọ saa ya ahụ

"Oge onye ahụ siri ọnwụ, agakwuru m Lt Chika Anele gwa ya ya ihe onyeagha ahụ kwuru, ya malite ịkpọrị m, sị na m enweghị uche?"

"Ọ bụ na agwaghị na ọ bụ naanị ndị na-egbu asompi ka ihe mmegharị ọnụ nke ha fọrọ?"

Ifeyinwa kọwara na ka mmemme ahụ gachara, na Lt Anele kpọrọ ndị 'corper' ọgbakọ, oge ya rutere ọ gwara ya ga yite uwe o ji efe ala nna ya.

"Mgbe m laruru ebe ndị cọrper bi, m were hụ na m abanyelea na nso m, were gaa ịsa ahụ s m sachaaa ahụ, ka m tiri uwe ahụ gawa." Anọ m ebe na-asa ahụ Lt Anele zite ndonye ogbo m ka ọ bịa kpọọ m."

'Corper Ifeyinwa Ezeiruka na Lt Chika Anele

Ebe foto si, Agba Jalingo

"Oge m rutere, chọrọ ịkọwara ya ihe ji m, o nyeghị m ohere."

O nye ndị otu ya iwu ka ha chute mmiri ma kpote aja nke ọ gwakọrọ were n'awụ ya ahụ ma n'akụ ya efere ahụ n'isi ma na-akpọrị ya."

"Ọ gwara m m jee kpọọ ndị m jiri biri na ya ga-akpọkwa ndị ya jiri biri."

O kwuru na tupu Lt Anele emee nke a, na o sesekpuwere ya ala ma bunye ya okwute nke ya buru were rue mgbe ike gwụrụ ya.

Na nkọwa Ifeyinwa, ihe mere na o megwaraghị Lt Chika bụ ugwu ọ na-agwanyere uwe ndị agha o yi.

Ihe ndị Agha Naijiria kwuru

Ka ọ dị ugbua, ndị agha Naijria kwuru na ha ga-ekpe onye otu ha mere nwada ji otu afọ efe ala nna ya akaje ikpe maka ịdajọ n'ọrụ dịka onye agha.

N'akwụkwọ ozi mgbasaozi ndị agha wepụtara, ụbọchị Tozde, nke ọ nụ na-ekwuru ha bụ Onyema Nwachukwu binyere aka, ha rịọrọ Nwaada Ezeiruka nakwa ụmụ Naijiria mgbaghara.

Mana arịrịọ ha na-abịa ihe karịrị otu ọnwa onye otu ha kpachara agwa ahụ.

Ozi si n'aka ndị agha Naijiria

Ebe foto si, HQ Nigeria Army/Facebook

Ozi si n'aka ndị agha Naijiria

Ebe foto si, HQ Nigeria Army/Facebook

Mana nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ya bụ ihe mere n'ọnwa Julai mana o nweghị okwu si na ya pụta ganye oge ihe onyonyo ahụ gbara n'ịntanet nke mere ka ọtụtụ ụmụ Naijiria katọọ agwa onye ahụ kpara.

Josephine Effa Chukwuma
Nkọwa foto, Josephine Effa Chukwuma bụ onye na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụaka nwe ụlọọrụ Project Alert

Otu onye na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụaka bụ Josephine Effa Chukwuma kwuru na Lt Anele tebọrọ ndịagha.

"Ọ bụrụ na ọ kpara ụdị agwa ahụ dịka leftụnant, gịnị ga-emezi ma o ruo ọkwa Brigedia maọbụ mejọ?"

Onye bụdị Ifeyinwa?

Ifeyinwa Ezeiruaku
  • Ezeiruaku Ifeyinwa Fidelia bụ ji otu afọ efe ala nna ya n'Ogige ndị agha "13 Brigade headquarters" dị na Calabar
  • Ọ gụrụ 'Linguistics na mahadum Lagos State university, Ojo, Legọs
  • Nwada Ifeyinwa bụ Anambara steeti mana o tooro na Legọs

Onye bụdị Lt Chika Viola Anele?

  • Onye agha nwaanyị na-arụ na 13 Brigade dịkwa na Calabar
  • O gara mahadum ma fee ala nna ya afọ atọ gaara aga