Nigerian in Pandora papers: Peter Obi na ndị ọchịchị ndi ọzọ ekwuola na aka ya dị ọcha dịka a gbara ama a

Ebe foto si, Getty Images
Aka chịbụrụ Anambra Steeti bụ Peter Obi gwara ụlọ ntaakụkọ Premium Times na ya amaghị na atụmatu ya ji ebupu ego ya etinye n'ụlọ akụ n'obodo oyibo mejọrọ iwu Naịjirịa.
Maazị Peter Obi sọ n'ime ndi ọchịchị mba ụwa a gbara ama n'isi dịka eweputere akwụkwọ nde iri na abụọ bụ ama kachasị n'ụwa.
Akpọrọ akwụkwo ndị a "Pandora Papers".
Onyeisiala Vladimir Putin na Eze Jọda bụ Abdullah II bin Al-Hussein so n'ime ndị chịbụrụ nakwa ndị ka na-achị aha ha dị n'ime akwụkwọ ndị a.
Mmadụ abụọ a ekwuola na aka ha dị ọcha.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Premium Times siri kwuo, Peter Obi hibere ụlọ ọrụ mbụ ya mba British Virgin Islands n'afọ 2010. O ji aha nwa ya nwaanyị Gabriella Nwamaka Francis Obi buo ụlo ọrụ ahụ.
Ụlọ ntaakụkọ ahụ sị na ọ bụ ụlọ ọrụ Acces International ka Maazị Obi gwara ka o nyere ya aka hibe ụlọ ọrụ a.
Premium Times depụtere iwu atọ ha sị Maazi Obi dara.
Ebe ama a sị?
Akwụkwọ a si n'aka otu International Consortium of Investigative Journalists (ICIJ) nọ n'obodo Washington DC.
Otu a na ụlo ọrọ ntaakụkọ 140 so nyochaa akwụkwọ a. Nnyocha bụ nke kachasị kemgbe ụwa.
Ọ bụ BBC Panorama na ụlọ ntaakụkọ Guardian nọ n'isi nnyocha na Briten.
Ndi ọzọ aha ha pụtara n'ime nnyocha gụnyere:
- Onyeisiala Czech Andrej Babis, bụ onye a na-eche na ọ gbaghị ama na o goro ụlọ nde pound iri na abụọ na France.
- Onyeisiala Kenya bụ Uhuru Kenyatta, Bụ onye a na-ebo ya na ndị ezinaụlọ ya isii
- OnyeisialaChile bụ Sebastián Piñera, onye ide ego, a na-ebo ebubo na o resiri enyị ya nwoke ebe a na-egwụpụte copper na igwe.
Onyeisiala Czech dere na Twitter na ebubo ahụ na usoro ejiri chọọ ịfanye aka na ntuliaka ha kwesiri ime n'izu a. Ọ sị na onweghi ihe o mere.
Maazi Kenyatta n'onwe ya sị na nnyochaa "ga-enye aka gaa iji ego achụ ego n'anwụ na Kenya nakwa ụwa dum" ma kwụkwaa na ya ga-ekwu okwu maka ya ma ya lọta njem ọ gara.
Akwụkwọ Pandora egozighi na ezinaụlọ Kenyata zuru oshi maọbụ zoo akụnaụba gọọmentị n'ụlọ ọrụ ha hibere n'ofesi.
Ụlọ ọrụ Maazị Piñera wepụtere ozi na ọ sị na aka ya adịghị n'orure ụlọ ọrụ Dominga.
Onyeisiala Pakistan bụ Imran Khan ekwuola na ọ ga-enyocha ndị mba ya agụnyere n'akwụkwọ Pandora. Nari kwuru nari ndị Pakistan, gụnyere ndị na-arụ ọrụ na gọọmentị Maazị Khan.

T













