BBC Igbo Exclusive: Agbanyeghi na a na-akpọ ụfọdụ n'ime anyị 'terrorist lawyer' anyị ga na-arụ ọrụ anyị ọfụma - Aloy Ejimakor

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu Trial: Ahụbeghị m Kanu kemgbe abalị itoolu gara aga - Aloy Ejimakor

Ọkaiwu onyeisi otu Ipob bụ Aloy Ejimakor kwuru na ọ tụrụ ya n'anya dịka ha ahụghị Nnamdi Kanu n'ụlọikpe n'ụbọchị Monde bụ nke 26 n'ọnwa Jụlaị.

O kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere ebe o kwuru na o ruola abalị itoolu kemgbe ọ hụdebere Kanu.

Dika ọ si kwuo, nke ahụ agaghịzị eme dịka Ọkaikpe Binta Nyako enyela iwu ka enye ha ohere ị na-ahụ ya ugboro abụọ kwa izu ụka.

Ọkaiwu Ejimakor kwukwara na agbanyeghi na mba Briten kwuru na ha ga-enye Nnamdi Kanu nkwado dịka nwa afọ mba ha, o nweghị ihe ya hụrụ makana ndị uweojii DSS ekwebeghị ka Kanu binye aka n'akwụkwọ ga-eme ka enyemaka malite.

Ejimakor tinyekwere ọnụ na njem mwereonwe, bụ nke ọ sị adaghị iwu ọbụla.

Ọ sị na onye ọbụla nwere ikike ịgba egbe ọnụ, mana ọ bụ mmegide iwu obodo ma ndị mmadụ malite iji egbe maọbụ mma achụ nta nwereonwe ha.