Nnamdi Kanu: Orji Uzor Kalu kwesịrị ịkọwa etu o si mịbanye ga hụ Kanu - Ejiofor

Orji Uzor Kalu na Ifeanyi Ejiofor
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu sị na sịnetọ Orji Uzor kweịrị ịkọwa etu o si mịbanye n'ụlọmkpọrọ ndị DSS ga-ahụ Kanu.

Ọ sị bụ eziokwu na o debara aha Orji Uzor dịka ndị ga-eso hụụ Kanu na 29 Nọvemba 2021 mana mgbe o jizi aghụghọ banye ga-ahụ Kanu.

N'okwu ya "e nwetere m ozi na Orji Uzor chọrọ ịga hụụ Kanu , m wee tinye aha n'akwụkwọ ndị ga-eso hụụ ya.

Mgbe ndị ọkaiwu anyị ruru n'ụlọọrụ DSS, a gwara ha na agaghị ịbanye ịhụ Kanu maka na aha Orji Uzor bụ nke e tinyeghi n'oge."

Ejiofor sị na e gbochiri ndị ọkaiwu ịbanye ibe ruo ihe dịka awa abụọ. Na ọ maghị na Orji Uzor Kalu esila n'azụ banye ga hụ Nnamdi Kanu.

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Ọ sị na ọ bụzị mgbe ndị ọkaiwu machiri banye ịhụ Kanu, ka Kanu gwara ha na Orji Uzor Kalu abịabuola hụ ya.

Ọ sị ka ọ dị ugbua na ọ maghị onye dunyere Orji Uzor Kalu mere o jiri were ụzọ aghụghọ gaa hụ Kanu.

Ejiofor gara n'ihu kwuo na Kanu enweghi ntụkwasị obi n'ebe Orji Uzor nọ. Na ọ kpara ụdị agwa n'afọ 2017 n'ụzọ iji zọọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ọ sị na onye ọbụla torola eto maara akụkọ banyere Orji Uzor Kalu nke ọma.

Ihe Nnamdi Kanu gwara anyị oge anyị gara leta ya na November 29 - Ejiofor

Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Facebook

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya n'ime ụlọikpe 'Federal High Court' Abuja

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor kwuru na nleta ha gara leta Mazi Kanu n'ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Nọvemba gara nke ọma.

N'akwụkwọ ozi o zipụtara n'ụbọchị Tuzde, Ejiofor kwuru na ya bụ nleta mịtara nnukwu mkpụrụ na-agbanyeghị ụfọdụ ihe nhịahụ ha hụrụ.

O kwuru sị: "Onye anyị na-anọchite anya ya (bụ Nnamdi kanu) ka na-arịọkwa ndị nkwado ya ka ha nọrọ n'udo, ma nwekwaa obi isi ike."

"Ọ bụ eziokwu na ndị ọ tụkwasịburu obi mechara gharịpụ ya, mana nke a emeghị ka obi lọọ ya mmiri."

"Uche ya dịsị ike n'ebe ọ na-elekwasị anya. Ọ makwanụ ihe ọ na-eme."

Ejiofor kwuru na ha tulekwara usoro niile etu ikpe gbasara Nnamdi kanu si aga, iji hụ na ndị ji ya emekpaghị ya ahụ.

Nleta Orji Uzor Kalu gara leta Nnamdi Kanu megidere iwu - Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor

Ifeanyi Ejiofor, Nnamdi Kanu, na Orji Uzor kalu

Ebe foto si, Facebook

Nkọwa foto, Ifeanyi Ejiofor, Nnamdi Kanu, na Orji Uzor kalu

Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor katọkwara etu ndị uweojii nzuzo si nye Orji Uzor Kalu ohere ka ọ hụ Mazị Kanụ n'ụlọ mkpọrọ.

Ejiofor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'Abuja taa bụ Tuzde.

Cheta na Orji Uzor Kalu, aka chịburu Abia steeti, kwuru na ya gara leta Mazi Nnamdi Kanu na mkpọrọ ndị DSS n'ụbọchị Mọnde.

Ejiofor kwuru sị: "Etu ndị DSS si nyere onye ọzọ aka ka ọ ga leta onye anyị na-anọchite anya ya (bụ Nnamdi Kanu) gbagwojuru anyị anya."

"Ndị DSS agaghị asị na ha amaghị usoro ụlọikpe depụtara gbasara ileta Nnamdi Kanu."

"Ọtụtụ oge ka DSS gbadoro ụkwụ n'usoro ndị a iji gbochie ndị enyi nakwa ndị ọkaiwu Kanu ịbịa leta ya."

Aha onyonyo, Ọ bụrụ na Gọọmentị akpụtaghị Nnamdi Kanu n'ụlọikpe echi ... - Ifeanyi Ejiofor

"Mana ụnyaahụ, kama DSS ga-akwụdosi ike n'usoro nleta ahụ, ha hapụrụ ka mmadụ gaa leta Kanu ebe ha ma na orubeghị oge eji aga eleta ya, bịa bụrụkwa na onweghị onye ọkaiwu ya so gaa nleta ahụ."

"Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ọkaiwu Kanu, ụmụnne ndị ọbara jikọrọ ha na ya, nakwa nwunye ya, na-eso usoro ụlọikpe tinyere iji ga leta Kanu, gịnị mere ndị DSS ji nye onye ọzọ ohere ka ọ gaa leta Kanu na-agbasoghị usoro ụlọikpe nyere?"

"Ọ bụ eziokwu na e tinyere aha Orji Uzor Kalu n'aha ndị ọkaiwu kwesịrị iso gaa nleta ahụ, mana o bu ụzọ gawa ebe ahụ n'azụ anyị, na-esoghi usoro iwu."

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Ndị aka ha dị na nwuchigharị ya ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor

"Enwere ihe nzuzo dị n'okwu a nke DSS kwesịrị ịkọwara anyị."

"Anyị amalitela usoro iji nyochaa ihe a merenụ nke ọma, anyị agaghịkwa egbu oge ịkọrọ ụwa niile gbasara ya ma ọ bụrụ na ha chọọ imenyụ okwu a ka ọkụ."

Aga m aga n'ihu na-enye Nnamdi Kanu ndụmọdụ - OUK

Orji Uzor Kalu na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Senator Orji Uzor Kalu/Facebook

Aka chiburu Abia Steeti bụ Sịnetọ Orji Uzor Kalu sị na ọ gaara hụ Nnamdi bụ onye ndu Ipob n'ụlọmkpọrọ ndị DSS.

N'ozi o wepụtara n'akara Facebook ya, Kalu sị na ọ hụrụ Kanu n'ọnọdụ dị mma dịka ha gbara nkata ka ụmụnne.

Ọ sị na mgbe ọ bụ gọvanọ Abia n'afọ 2001 na ọ bụ ya chiri nna Kanu bụ Eze Isreal Okwu Kanu ndị Eze ndị obodo ha bụ Afara Ukwu. Na kamgbe ahụ na ezinaụlọ ha bụ ndị enyi.

Kalu gaara n'ihu kwuo na ọ bụ eziokwu na Kanu nwere ọtụtụ ndị na-achọ ka a tọhapụ ma ọ na-enye ndụmọdụ ka ọ tụlee ụfọdụ agwa ndị ọ na-akpa na ihe ndị o nwereike ibutere ya.

Kalu na Kanu

Ebe foto si, Getty Images/Uzo Kalu

N'okwu ya "Ọ bụ eziokwu na echiche mụ na ya dị iche, mana Chineke emeela anyị ụmụnne, anyị agaghị agbara onwe anyị ọsọ."

"Ma ya na ezinaụlọ ya o gere m ntị maọbụ ha egeghi m, aga m na-aga n'ihu na-enye ha ndụmọdụ dịka m na-eme na mbụ.

Ihe anyị chọrọ karịsịa bụ obodo nwere udo na ezi nchekwa".

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Kamgbe a nwụchiri Nnamdi Kanu n'ọnwa Juun, afọ 2021, Orji Uzor ga-abụ onye mbụ na-abụghị nwanne ya maọbụ ọkaiwu ya gara hụ ya n'ụlọọrụ ndị DSS.

Sịnetọ Ifeanyi Ubah nke ji ọkọlọtọ YPP zọọ ọkwa gọvanọ Anambra Steeti gbara mbọ ịhụ Kanu site n'akwụkwọ ọ gbara n'ụlọikpe ka e nye ya ikike mana ụlọikpe enyeghi ya.