Nnamdi Kanu: Ihe ọ gwara m ka m gara hụ ya taa - Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Bar Ifeanyi Ejiofor/Facebook
Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola na Kanu na-ebunye nde kwulu nde ndị na-eso ya ụkpa ekele maka nkwado ha.
Ejiofor gbaara ama n' ozi o wepụtara ụbọchị Tọzde dịka ọ gachara zute Kanu na mkpọrọ ndị DSS.
Ozi ahụ nke isi okwu ya bụ "Njem ileta onye anyị n'anọchite" o wepụtara n'akara Facebook ya na mgbede Tọzde, o kwuru sị, " Obi adaghị ya mba, Obi ka siri ya ike".
O kwukwara sị, " Kanu na-ezịgara ndụ kwuru nde bụ ụmụchineke na ndị nsọnsọ ya nọ na mba ụwa niile ozi ekele".
"Obi dị Nnamdi Kanu ụtọ maka etu esi kwado ya ma rịọ mmadụ niile ka ha tachie obi ma banye n'ekpere ọkachasị oge dịka nke ugbua".
O kwukwara sị, "Anyị ga-enwe mmeri n'oge na-adịghị anya. Ekpere gị dịkwa oke mkpa".
Ejiofor kwuru na ihe ndị ọzọ ya na Nnamdi Kanu kpara bụ ihe gbasara ọrụ dịka ọkaiwu nke ọ gaghị ekwuputa n'ọha.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Stanley Okoro, onye ihe ejije a ma ama alaala mụọ
- Ihe ndị mmadụ gwara Simon Ekpa dịka ọ sị na agaghị eme ntuliaka n'Anambara n'afọ 2021
- Akwadoghị m ụdị ego emefuru n’Oba na mmemme akwamozu – Bishọpụ Chukwuma
- Lee obodo ụmụnwaanyị ji aramara echere ọbịa ọjị
- Ọba ala Yoroba anapụla Rochas Okorocha ara n'ọnụ










