Man United vs West Ham: Man. Utd alaala na nta n'Old Trafford

Manchester United

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pogba gbakpuchara goolu ha abụọ

Chi ndị Manchester United mụ anya taa ebe ha ji nwapem gbalahụ mmeri n'Old Trafford.

Ọ bụrụ na Chi ha enyeghi ha penariti abụọ mere ha ji merie West Ham, aha ha gaara abụ "Mmeregịnị".

Nke a bụ makana West Ham ekweghi ha kuru ume n'ime nkeji iri itoolu a gbara bọọlụ.

Paul Pogba ji ike dimkpa tinye penariti abụọ na mpio na nkeji 19 na nkeji 80, ebe West Ham si n'aka Felipe Anderson dọbiri otu goolu ha nyetenwuru na nkeji 49.

Iji gosi ka ya bụ egwu si taa akpụ, otu egwu bọọlụ abụọ ahụ jikwa mpempe akwụkwọ ịdọ aka na ntị otu otu were laa.

Mmeri a ebugoola Man Utd n'ogogo ise na tebulu Premier League ugbua.

Ihe ndị ọzọ gbatara na Premier League taa:

N'asọmpi ndị ọzọ, Tottenham and Bournemouth ji nkata bunye ndị ọbụ ha na ha goolu.

Etu a ka egwu siri kwuru n'abalia:

  • Man Utd 2-1 West Ham
  • Fulham 2 - 0 Everton
  • Tottenham 4 - 0 Cardiff
  • Burnley 2- 0 Cardiff
  • Southampton 3 - 1 Wolves
  • Brighton 0 - 5 Bournemouth

Akụkọ ga-amasị gị