Ebonyi State Crisis: Etu e si wakpo, gbuo mmadụ abụọ ma tọrọ mmadụ ise n'Edda di na Ebonyi steeti

Aha onyonyo, Etu e si wakpo ma gbuo mmadụ abụọ ma tọrọ mmadụ ise n'Edda di na Ebonyi steeti

Kenneth Okoro Agha bụ onyeisi ndị ntoroọbịa n'obodo Okoli Agha dị n'okpuru ọchịchị Afikpo South kọwaara BBC Igbo etu ndị ekperima si gbuo mmadu abụọ ndi obodo ha ma tọrọ mmadụ ise.

Maazị Agha sị na nsogbu a malitere na afọ abụọ gara aga oge esemokwu dapụtara n'etiti ha na ndị agbataobi ha bụ Egbọm dị n'okpuru ọchịchị Biase di na steeti Kross Riva.

O kwuru sị: "Ọ bụ gọọmentị Owụwa Anyanwụ kụrụ nkwụ n'ala na-esere anyị na ndị agbataobi anyị.

"Ọdọ nkwụ a banyere ala Kross Riva, Abia nakwa Ebonyi.

"Kemgbe anyị niile na egbukọta nkwu ebe ahụ mana n'ime afọ abụọ gara aga, ndị agbataobi anyị resiri otu nwoke Anambara ọdọ nkwụ ahụ."

Ọ sị na esemokwu pụtara kemgbe e rere ya bụ ọdọ nkwụ kpatara ogbugbu mmadụ abụọ n'ime afọ abụọ gara aga.

"Agbagburu otu onye na Julaị 12, gbagbuo onye nke ọzọ na Decemba 4."

Maazị Okoro-Agha si na ọ bụkwa ndị Egbọm a wakporo ndị be ha gara igbu akwụ na ọdọ nkwụ ahụ ma gbuo mmadụ abụọ.

Ndị e gburu bụ Ndukwe Okoroafor, dị afọ 55, na nwunye ya bụ Paulina Ndukwe, dị afọ 49.

Nwa Ndukwe Okoroafor bụ Kalu Ndukwe, onye hụru oge ihe a mere, bu mgbo egbe gbalaa.

Ndị mwakpo a kpụụrụ Esther Ikwo, Elizabeth Ikwo, Chinecherem Nnachi, Ogbonna Aku na Sunday Ogbuu Ama gbalaga.

Ha bukwa ozu mmadu abụọ ahu ha gburu.

Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ebonyi gwara BBC na okwu ahụ ka kwụ otu ọdi oge ahụ o mere.

Ọ sị: "Anyị na-eme nchọpụta ma na-agba mbọ ịhụ na-enwetere ndi kpara arụ a."

Odah kwenyere na ọ bụ ọzịzọ ọdọ nkwụ butere esemokwu a ma kwuo na ọ dị mkpa itinye ndi uweojii ebe ahu ịhụ na ọzọ emeghị.