Priest killing: Ụka Katọlik Enugwu ji ofufe nru pụrụiche ruo uju ụkọchukwu egburu egbu

Bishop Callistus Onaga
Nkọwa foto, Bishop Callistus Onaga
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mmiri zoro n'Enugwu n'ụtụtụ Sọnde egbochighi ndị Katọliki ijupụta na n'ụlọọka 'Holy Ghost Cathedral' maka ụka iru uju ụkọchukwu Paul Offu ndị ụkọchukwu ndị ọzọ e gburu egbu.

Onyeisi ụka Katọlik n'Enugwu bụ Bishop Callistus Onaga bụ onye doro ụka a pụrụịche.

Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fụlanị ọchịehi gbagburu Paul Offu n'ụbọchị Tọọzde nke mere ka ndị ukọchukwu ibe ya mee ngagharị iwe n'ụbọchị Fraidee.

N'okwuchukwu ya, Bishop Onaga gwara ndị ntoroọbịa ka ha bilie ma chekwaa gburugburu ha site n'aka ndị ogbu mmadụ kpọrọ onwe ha ndị ọchịehi.

Onaga gbarụkwara ihu kwuo na onweghi ihe gọọmentị na ndị uweojii na-eme iji kwụsị mkpamkpa a ndị ọchịehi na-akpa na Naịjirịa.

Ndị mmadụ na-egosiputa iwe ha maka ọnwụ Fr Paul Offu
Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-egosiputa iwe ha maka ọnwụ Fr Paul Offu

Narị kwụrụ narị ndị mmadụ gbakọrọ n'ụlọụka Holy Ghost Enugwu, jigaasị akwụkwọ e dere ihe na-egosi ka iwe si dị ha n'obi.

Ufọdụ ihe e dere na bekee gunyere" killer herdsmen must go", "our roads are no longer safe", "our villages are no longer safe", "enough is enough", dgz.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Lee foto otu ụka akwa ahụ sị ga:

Ndị ụka katọlik na eru uju maka ụkọchukwu ha e gburu egbu.

Cheta na onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu nyere ndị otu ya iwu na Satọde, ka ha sie imi n'ala ma chọpụta ndị gburu ụkọchukwu Paul.

Ndị ụkọchukwu

N'otu aka ahụ kwa, onyeisiala Muhammadu Buhari katọkwara ogbugbu ụkọchukwu ahụ ma kwee nkwa na ọchịchị ya ga-agba mbọ ịchekwa ndụ na akụnaụba mmadụ niile.

Ndị "Rev Sisters"
Ndị ụka KAtọlik n'Enugwu steeti.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: