Insecurity in the South East: Ọ bụghị eziokwu na a napụrụ ndị ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ ndị uweojii na-eche ha nche - Uweojii Delta Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na Delta Steeti ekwuola na ọbụghị eziokwu na ha wepụrụ akwụkwọ ntuziaka kwuru ka ndị uweojii ghara ịrụ ọrụ ichekwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchi isi ha gbagotere n'Ọwụwa Anyanwụ.
N'ozi Bright Edafe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta Steeti binyere aka, ndị uweojii sị na ozi ha zipuru nke akụkọ a siri pụta kwesiri ido ndị mmadụ anya ọfụma.
Maazị Edafe sị: "akwụkwọ ahụ ekwughi na a ga-anapụ ndị isi gbagotere n'Ọwụwa Anyanwụ ndị uweojii na-echekwa ha. Dịka o si n'aka ngalaba na-ahu maka ọrụ ndị uweojii, ọ bụ ntụziaka nye ndị na-arụ ọrụ ịchekwa ndị mmadụ ịgbado anya maka mkpa mkpa na-akpa na mpaghara ndị ahu a kpọrọ aha."
Ọ sị na ndị mmadụ ghọtaghere ihe a.
Mana, akwụkwọ BBC hụrụ nwere ebe e dere "suspended" nke pụtara ịkwụsị n'ọnọdụ nwamgbenta.
Dịka akukọ banyere atụmatụ a pụtara, ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo katọrọ atụmatụ ịnapụ ndị ọchịchị ndịda anyanwụ ndị nche ha ọkachasị ugbua tigbuo zọgbụọ na-arị ibe ya elu na mpaghara ahụ.
Goddy Uwazuruke bụ onye bụbu onyeisi Aka Ikenga kwuru na agbanyeghị na gọomentị etiti nwere ikike ịnapụ ndị ọchịchị ndị nche ha mana na ọbụghị naanị na ndịda anyanwụ ka ekwesiri ịnapụ ha ya maka na ọbụghị naanị na ndịda ka ndị omekome na-ebuso ndị uweojii agha.
Uwazuruike na-akọwa na ya bụ atụmatụ na-egosi na "Naịjirịa abụghị otu dịka e chere maka na nke a pụtara na-enwere iwu abụọ na-achị na Naịjrịa".
Nelson Nwafo nke Foundation for Environmental Rights Advocacy and Development (FENRAD) bụ onye kwuru na ya bụ atụmatụ jọgburu onwe ya.

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Kedụ ihe dị n'ozi a na-ese okwu?
Ihe a dị n'akwụkwọ ozi nwere akara CB: 0900/DTS/DOPS/VOL.47/812X nke onyeisi na-ahu maka ọrụ ndị uweoji na Delta Steeti degaara onye na-ahu maka ncheka n'obi gọọmentị na Asaba kwuru na ya bụ atụmatụ bụ maka mwakpo a na-eme ndị uweojii ma na anara ha nwaọgụ ha nke a na-enyo na ọ bụ ndị otu Ipob na-akpa ya mkpamkpa.
Ndị ọ degara akwụkwọ ahụ bụ onyeisi ọrụ nchekwa nke gọomentị steeti ahụ, Onyeisi ndị uweojii, ngalaba ọrụ dị icheiche dịka Department of Operation, Delta State Oil Producing Areas Development Commission, Ụlọomeiwu ndị Delta steeti, Nigerian National Petroleum Corporation annex nakwa ndị ọzọ.
BBC gbara mbọ ịnụ onu ndị uweoji site n'akara ekwentị Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ha, mana ọ bụụrụgị ekwe ntị ya.
Ebe Kọmisọna mgbasa ozi Delta steeti bụ Ehiedu Charles Aniagwu sị na ya amaghị maka ya bụ akụkọ, Don Adinuba bụ nke ndị Anambra steeti sị na ha ka na-ele ya anya.
Ọ kwere nkwa ịgwa anyị okwu mgbe ha lebechara ya anya.
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akatọọla ya bụ











