Nnọọnụ na peeji anyị taa!
Unu asaala chi?
Igbo turu ilu sị na onye wetara ọjị wetara ndụ. Kedụ ihe ị na-ewetara ezinaụlọ gị taa?
Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steetị sị na a ga-agba aha ndị na-enye steetị ya nsogbu n'anwụ.
Chioma Obianinwa
Unu asaala chi?
Igbo turu ilu sị na onye wetara ọjị wetara ndụ. Kedụ ihe ị na-ewetara ezinaụlọ gị taa?
Unu emeela n'isonyere anyị taa, ka chi foo.

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodimma sị na ndị ọrụ nchekwa achọpụtala ndị niile na-enye nsogbu na steetị ya.
O kwuru nke a mgbe a na-efe ofufe n'ụlọụka dị n'obi ọchịchị gọọmentị n'Owere n'ụbọchị ụka.
Ọ sị na ụbọchị ole na ole na-abịa na a ga-agba aha ndị dị etu a n'anwụ nakwa agwa ọjọọ ha ka e nwee ike taa ha ahụhụ.
Ọ kwere nkwa na ọchịchị ya ga-eme ihe niile o nwereike iji hụ na ọ zachara ma kpochaa mpụ n'Imo Steetị, na ha na ndị ohi na ekperima enweghi okwu ọbụla.

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Ọ dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla aka ya dị na mpụ na-eme n'Imo Steetị wepu aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ.
O kelere ndị Imo Steetị na ntụkwasị obiha nwere n'ebe ọchịchị ya nọ nakwa n'oge nsogbu nchekwa.
Ọ sị na ndị aka ha dị na nsogbu nchekwa a gụnyere ndị ohi, ekperima, ụfọdụ ndị IPOB nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado tigbuo zọgbuo iji kwatuo gọọmentị nọ n'ọchọchị.

Ebe foto si, Nigerian Police
Ndị uweojii egbuola ndị o ji egbe ezu ohi dị mmadụ atọ n'Ebonyi Steetị.
Ndị a e gburu so n'ime otu na-akpa ike ọjọọ bụ ndị bịara izu ohi n'ụlọakụ dị n'Onueke nke steetị ahụ n'ụbọchị Tusde.
Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa sị na ndị a e gburu gụnyere nwoke abụọ na otu nwaanyị n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị ụka.
Ọ sị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa nke kọmishọna uweojii n'Ebonyi Steetị bụ Aliyu Garba nọ n'isi ya wakporo ogige nzuzo ndị ohi a dịka nyocha si rụọ ha aka.
Ọ sị dịka ndị ohi a hụrụ ndị uweojii na ha malitere gbawa ha egbe nke mere ha na ndị uweojii ji na-akwakọrịta onwe ha mgbọ.
Nke a mere e ji gbagbuo ndị ohi a mmadụ atọ ebe ndị ọzọ riri mbọmbọ ọsọ.
Ndị uweojii kpachiri ọtụtụ ngwongwo ndị a ji arụ ọrụ gụnyere egbe, mgbọ ya, mma, ụgbọala na ihe ndị ọzọ.
Ndị uweojii mechara nwuchie mmadụ ise so n'otu gbara ọsọ ebe ha nọ n'ụlọ dibia anya nzụ na-agwọrọ ha 'ọdeshi'.
N'aka nke ọzọ, Mba sị na ndị uweojii kpachikwara otu ụgbọala bu ngwa egbe ruru 753 si Abakaliki n'Ebonyi Steetị na-aga Umuahia nke Abia Steetị.
Ọ sị na nyocha tara ọchịchị na-aga n'ihu ịnwụchi ndị omekaome niile na-akpa ike n'obodo Naịjirịa gbaa gburugburu.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

Akụkọ na-ekwu na ndị o ji egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo Abaomega nke okpuruọchịchị Onicha, Ebonyi Steetị.
Nke a mere n'ihe dịka elekere asaa nke abali Satọde ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ 2021.
Kọmishọna na-ahụ maka okeala n'Ebonyi Steetị bụ Stanley Okoro sị na ndị a gbara ụfọdụ akụkụ ụlọ ndị uweojii a ọkụ ebe ọtụtụ ndị uweojii merụrụ ahụ.
Okoro ekwughi ma o nwere onye uweojii nwụrụ n'ihi mwakpo a mana ọ sị na ndị ọrụ nchekwa ewerela ọnọdụ ebe ahụ.
Otu onye obodo Abaomega hụrụ ka ihe si mee gwara BBC Igbo na otu onye uweojii nwụrụ na mwakpo ahụ ebe ọtụtụ ha merụrụ ahụ.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii ka ihe a si mee dịka ọnụ na-ekwuru ha na kọmishọna ha anaghị aza oku n'ekwentị ha.
Akụkọ ka na-abịa...

Gọọmenti etiti amachiela ndị na-abụghị ndị Naịjirịa gara mba Brazil, India maọbụ Turkey n’izu ụka abụọ nso nso a ịbata Naịjirịa.
Onyeisioche Presidential Steering Committee ehibere maka COVID-19 bụ Boss Mustahpha kwuputere nke a n'akwụkwọ ozi o zigara ndị ntaakụkọ.
O kwuru na mkpebi na-abịa dịka ọnụọgụ ndị bu ọrịa ahụ na-arị elu n’ike ike na mba ndị ahụ.
Mmachị a ga-amalite bido na Mee 4, 2021 ebe a ga-eleba ya anya ma izụ ụka anọ gafecha dịka akwụkwọ ozi ahụ si kwu.
Boss Mustapha kwuru na ya bụ mmachị emetụtaghị ndị njem na-agafe agafe n'obodo ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu Nigeria Labour Congress bụ Ayuba Wabba ekwuola na ya na ndị ọrụ niile nọ na Naịjirịa ga-agba abụbụ ọrụ maọbụrụ na iwu nke kwadoro iwepụ ụgwọ opekatampe n’akwụkwọ iwu nke gọọmenti etiti bekee kpọrọ ‘Executive list’ tinye na ‘concurrent list’ gara n’ihu.
Wabba kwuru nke a n’emume e hibere iji icheta ndị ọrụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa May dịka ụlọ ọrụ Channels si depụta.
Nonyere anyị taa ka ịmata nke na-eme n'ala Igbo nakwa mba ụwa niile.
Daalụ nụ maka isonye anyị na peeji anyị taa.

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma bunyere ndị ọrụ n’Imo steeti ụkpa ekele maka etu ha jisike n’ọrụ n’agbanyeghị ahụhụ ọrịa covid-19 butere
O kwuru nke a n’ozi o zipuru dịka a na-echeta ụbọchị ndị orụ taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee.
Ihe ọzọ o kwuru bụ na oge ndị ekperima nọ na steeti ahụ ji akpa mkpamkpa abịala na njedebe.
Uzodimma tụrụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọ kpọghị aha aka ma kwuo na ha so na ndị na-ebute ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ iji me ka ọchịchị raara ya ahụ.
"Gọọmentị m na ndị ọrụ nchekwa zuru ka e mee n'ichekwa ndụ na akụnaụba ndị Imo steeti" ka o kwuru.
Cheta na ndị amaghị ndị ha bu wakporo ụlọ obodo Hope Uzodimma n'izuụka gara aga ma gbaa ụgọdụ ụgbọala nakwa obere ụlọ nchekwa dị ebe ahụ ọkụ.

Ebe foto si, Imo Police Command
Ihe ruru ụmụnwaanyị abụọ anwụọla n'Imo steeti dịka gwongworo bu aja enweghi 'brake' kwọgburu ha n'ehihie ụbọchị Satọde n'Imo steeti.
Ozi ndị uweojii kwuru na gwongworo ahụ kụnyekwara ụfọdụ ụgbọala n'ime mmiri ma danye kwa n'ọnwe ya n'ahịa Nkwommiri dị n'obodo Umuozu bụ ebe ihe a mere na steeti ahụ.
E kwukwara na ọ bụ mgbe ụgbọala ukwu ahụ si ugwu arịdata ka brake ya mebiri ọ we kụọ ụgbọala dị icheiche dị ya n'ihu tupu ọ gbuo ụmụnwaanyị ahụ.
Onye gwara BBC Igbo okwu n'ekwentị achọghị ka akpọọ aha ya kwuru na ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe mberede a eruola iri abụọ.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ikeokwu Orlando kwuru na ọ bụ naanị mmadụ abụọ nwụrụ n'ihe ahụ ebe e buuru mmadụ asatọ gawa ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.
Anwụchiri ọkwọụgbọala bu gwongworo ahụ dịka ndị uweojii malitere nyocha ha banyere ihe mere.

Ebe foto si, Sukanmi Ogunmuko

Ebe foto si, Daily Trust
Gọọmentị Zamfara kwuru na Auwalu Daudawa bụ onyeisi ndị omekome tọrọ ụmụakwụkwọ Sekọndịri na Kankara anwụọla.
Abụbakar Muhammad Dauran bu Kọmịshọna na-ahụ maka nchekwa na Zamfara gwara BBC na ọ bụ ka otu ya na otu ọzọ na-alụ ọgụ ka e gburu Daudawa.
Ọ sị egburu onye omekome a na ụfọdụ n'ime ndị otu ya.
Maazị Dauran sị: "Abalị ụnyaahụ anyị nwetere ozi na-egbuola Auwalun Daudawa. Ọ bụ n'ọgụ ka ọ nwụrụ."
Ọ sị na ha amabeghi ndị mere ihe a, "mana anyi na-eme nyocha."
Maazị Dauran sị na ha amaghị ebe ozo onye omekome a dị, mana ndị hụrụ oge ọ nụrụ sị na ụfọdụ ndị otu nakwa ndị ha na-alụsị ọgụ nwụrụ.
Ọ sị na Daudawa gara Zamfara maka alụmnwaanyị nwanne ya nwoke.
Auwalu Daudawa sibu na ya akwụsịla ohi na ntọrị mmadụ.
O sikwa na ọ bụ ya bụ onyeisi ndị omokome tọrọla ụmụakwụkwọ na Kankara n'ọnwa Decemba 2020.
Ntọrị ụmụakwụkwọ a butere okwu na Naịjirịa, n'agbanyeghị na Governor Zamfara bụ Bello Muhammad Matawalle gwara BBC na Miyetti Allah na ọ bụ ndịn̄ nọ n'isi mkparịta ụka ịzọpụta ụmụaka.
Njem iwetere unu akụkọ si ụwa dum eruola.
Ya gazie!

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na o nweghi Ipob maọbụ ESN ọ bụla na-achụ ya ọsọ.
O kwuru nke a ka ọ na-ekenye ndị otu Ebubeagu ụgbọala ọrụ ha n'ụbọchị Fraịde n'Abakaliki.
O kwukwara na ọ dịghị mma etu ndị mmadụ sị etinye anya na ntụliaka afọ 2023 ka ala Naịjirịa si dịrị n'ọnọdụ ọjọọ ọ dị.
"O nweghi onye na-achụ m bụ Gọvanọ Ebonyi steeti n'ihi na arụrụ m ọrụ m ọfụma" ka o kwuru.
Ụgbọelu Peace bụ ụgbọelu mbụ dara n 'Anambra Cargo Airport' n'ihe dịka elekere 2.05 nke ehihie ụbọchị Fraide (30/4/2021).
Ụgbọelu Peace abụọ dara n'obodo Umueri bụ ebe e wuru ọdọụgbọelu ahụ dịka igwe mmadụ gbakọrọ ịhụ ofe ahụ nke gọọmentị steeti ahụ na-ete.
N'igosi obiụtọ ha, otu n'ime ndị biara ije ahụ bụ onyeisioche Okpuru Ọchịchị Onicha kwuru na ọdọụgbọelu ahụ ga-enye aka ime ka ịtụbata ahịa dịrị ndị Ọwụwa Anyanwụ mfe.





Ebe foto si, Getty Images
Ezinụlọ Eze ndị Zulu na mba Saụt Afrịka ekwupupala na Eze nwaanyị ha bụ Shiyiwe Mantfombi Dlamini Zulu anwụọla dịka emechara ya Eze n'ime otu ọnwa.
Eze nwaanyị Mantfombi gbara afọ iri isii na ise bụ Eze obere oge nke ndị Zulu dịka di ya bụ Eze Goodwill Zwelithini nwụrụ.
Eze Nwaanyị Mantfombi banyere n'ụlo ọgwụ maka ọrịa ha na-ekwuputeghi.
Ọ mụrụ ụmụ asatọ nke ọpara ya bụ Miszulu ka a na-atụanya na ọ ga-anọchị dịka Eze.

Ebe foto si, EPA
Opekata mpe, mmadụ iri anọ na anọ anwụọla dịka ọgbaaghara dapụtara n'oge emume Lag B'Omer na mba Izrel n'ụbọchi Frịde.
Ndị ọrụ gbata gbata na-anwa ike ha dịka ha kwuru na mmadụ iri atọ na asatọ ọzọ nọ n'ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma.
Akụkọ na-akọwa na igwe mmadụ bịara ya bụ emume.
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị