Ihe ndị mere e ji achọ ịkagbu atụmatụ NYSC

Ndi na efe ala nna ha n'atụmatụ NYSC

Ebe foto si, TWITTER/@NYSC_NG

Iwu nke ga-ahụ na akachapụrụ atụmaatụ National Youth Service Corp agafeela agba nke abụọ n'ụlọomeiwu nta Naịjirịa.

Awaji-Inombek Abiante na-anọchịte anya ndị obodo Opobo/Nkoro n'ụlọomeiwu kwadoro iwu ahụ.

Ọ gbadoro ụkwụ n'ihe ndị a ma ma wepụta iwu ahụ;

  • E nweghi ezi nchekwa na Naịjirịa ugbua
  • Oke ogbugbu a na-egbu ndị a na-efe ala nna ha n'ụfọdụ akụkụ Naịjirịa nke ndị o ji egbe, ndị bu okpukperechi n'isi na ndị ntọrị na-eme.
  • Etu ụlọọrụ gọọmentị na ndị nkịtị si e ji agba odibo, akwụghị ha ezi ụgwụ
  • Ihe e ji hiwe ya abụghịzi ihe a na-eme ugbua, ndị mmadụ na-efezi ala nna ha n'obodo a mụrụ ha, hapụ ị gaa n'obodo ọzọ ka iwu si kwuo.

Dịka ọ dị ugbua iwu a agafeela ngụpụta nke abụọ dịka ndị omeiwu ka na-arụka ụka ma a ga-akachapụ atụmaatụ a ka ọ ga-aga n'ihu.

Gịnị ka NYSC pụtara na Naịjirịa?

Ndị na-emega ahụ

Ebe foto si, NYSC

Atụmaatụ National Youth Service Corp bụ nke ndị ntoroọbịa na-efe ala nna ha na-eme ruo otu ọnwa.

Onye ntoroọbịa gụcharala mahadum na Naịjirịa , na-erubeghị afọ iri atọ na-esonye ya bụ atụmaatụ.

A na-ewega ha n'ngalaba na-abụghị ebe ha si dịka onye si mpaghara ọwụwa anyanwụ ga-aga mpaghara ugwu awụsa ga fee ala nna ya, etu a ka ọ dịkwa ndị ọzọ si ebe dị iche iche na Naịjiria.

Ndị ntoroọbịa ga-eme ọzụzụ pụịrụiche n'ime ogige NYSC tupu e wega ha n'ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ nakwa ụlọọrụ dị iche iche ebe ha ga-eme ọrụ mbụ ha.

Kedụ uru na ọgbọm dị na NYSC?

Otu onye ọkaiwu bụ Chukwuemeka Eze sị na uru dị n'iji otu afọ efe ala nna karịrị ọghọm dị na ya nke gụnyere;

  • Ịdị n'otu nke agbụrụ dị iche iche na Naịjirịa.
  • Ọlụlụ agbụrụ na ibe ha na Naịjirịa - Ndị gara ife ala nna na-esi ebe ahụ lụrụ onye a gbụrụ ọzọ.
  • Ọ na-ewete ohere ọrụ.
  • Ọ na-enye ohere ka mmdụ hapụ mpaghara ya gaa ebe ọzọ mụta omenala, nri, ejiji ha dgz.

Ọkaiwu Eze sị na ọghọm dị na ya akarịghị ọghọm ọtụtụ ndị Naịjirịa ọzọ na-agabiga.

Ọ sị na a na-atọrọ ma na-egbukwa ndị ọzọ na-abụghị ndị ji otu afọ efe ala nna ha na Naịjirịa n'oge ọbụla ma na ntuliaka.

Eze sị na ndụmọdụ ọ ga-enye gọọmentị bụ ka ha nyekwuo ndị NYSC ọzụzụ tara ọchịchị iji chekwaa onwe ha n'oge dị njọ.

Tinyekwuoro ha ego n'elu ego a na-akwụ ha ma rọpụtara ha ọrụ ndị ntoroọbịa ndị ọzọ ọrụ.