Jim Iyke and Uche Maduagwu: Ọ chọọla Jim Iyke okwu ọzọ ka otu izu gachara

Ebe foto si, Instagram
Ọ dị ka ihe na-ebe ka na-ebekwa dịka Uche Maduagwu kwukwara okwu ọzọ nwereike ikpasu Jim Iyke iwe.
Nke a na-abịa n'ihe erubeghi otu izuụka mmadụ abụọ a lụchara ọgụ gbasara ihe Maduagwu kwuru megide Jim Iyke.

Ebe foto si, Instagram screenshot
N'onyonyoo o tinyere n'akara Instagram ya, Uche Maduagwu kwuru na ya gara n'ụlọ 'cinema' ebe Jim Iyke na-egosi ejije ọhụrụ o mepụtara a na-akpọ 'Bad Comment'.
O kwuru na Jim Iyke bịara n'ụlọọrụ ya kụọ ya ihe, mana ọ gaghị eme ka ọ kwụsị ihe ọ na-ekwu.
Maduagwu jụrụ sị: "Gịnị ka Jim Iyke na-eme o ji nweta otu narị nde naịra (N100 million) o jiri mee ejije 'Bad Comment'?
"EFCC ga-anwuchi Jim Iyke n'oge adịghị anya ka ọ kọwaa ihe na-enye ya ego."
"Lee ọnọdụ akụnụba Naịjirịa nọ ugbua, ebee ka Jim Iyk siri nweta otu narị nde naịra o jiri mee ejije?"
Ihe a sị mere Jim Iyke ji tie Uche Maduagwu ihe

Ebe foto si, Alamy
Dịka okwu dị n'etiti Jim Iyke na ogbo ya bụ Uche Maduagwu ka na-ekpo ọkụ, lee ihe echere butere ya bụ ihe ebe a.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na esmokwu a malitere mgbe Uche Maduagwu boro Jim Iyke ebubo ịme ọgwụ ego
Lee ihe onyonyo ahụ n'uju ebe a:
Maduagwu sị "Jim Iyke bụ onye ọgwụ ego, ọ bụrụ na ọ bụghị onye ọgwụ ego. kedụ etu o si enweta ego"
"A nụrụ m na mba Amerịka amachiela ya ịbata be ha, ọ bu maka na o gwuru ndị mmadụ wayo"
"E jidela Hushpuppi, a ga-ejide Jim Iyke" ka o kwuru n'ime ihe onyonyo ahụ.
O nweghi osisa Jim Iyke sara Maduagwu maka ihe onyonyo ahụ ma rue ugbau o nweghi ihe ọzọ o kwuru maka ya.
Ihe ndị Uche Maduagwu amaghị maka Jim Iyke- Daddy Freeze

Ebe foto si, Jim Iyke, Daddy Freeze na Uche
Onye ntaakụkọ redio bụ Ifedayo Olarinde a ma dịka 'Daddy Freeze' ekwuola na ọ bụrụ na Uche Maduagwu maara Jim Iyke ọfụma, ọ gaghị ekota ya okwu.
Daddy Freeze, onye kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'akara Facebook ya ụbọchị Wenzde obi bụ ya pọlina pọlina na ihe Jim Iyke tiri Uche Maduagwu kwuru na Ijim Iyke bụ anụntị ma bụrụ onye iwe ọkụ.
Ọ sị, "Ọ gaara akara Uche Maduagwu mma na ọ chọrọ Buhari okwu karịa na ọ chọrọ Jim Iyke ."
"E nwere ndị i kwesighị ị na-adanye na nsogbu ha, Jim Iyke so na ha.
"Ịkụ 'gbas-gbos' na-atọ ya ụtọ, tinyere na ọ na-ewe iwe oku."
Daddy Freeze kwuru na dịka onye na-arụ ọrụ redio na ya adanyebuola na nsogbu Jim Iyke mana Chineke zọrọ ya.
"N'ebe ihe dịka 2017-2018, a mara Jim Iyke njakịrị na redio, oge ahụ mụ ya na ezutebeghị ihu na ihu."
"Mụ na ya were zute na 'lift' oge mụ na ya na-agakọ ụka na Muson o nweghị ụdị ekpere m ekpeghị."
Daddy Freeze kwuru na o nweghị ihe Jim Iyke mere karịa na o lere m anya, gawara onwe ya.
Gị na-esere Jim Iyke na Uche Maduagwu?

Ebe foto si, Jim Iyke/Uche Maduagwu Instaggram
Onye ihe ejije Nollywood bụ Jim Iyke na ogbo ya bụ Uche Maduagwu abụrụla isi akụkọ na soshal midia dịka akụkọ banyere ha malitere wube n'ịntanet ụbọchị Tuzde.
Nke a malitere dịka ihe onyonyo ebe Jim Iyke banyere Uche Maduagwu ọgụ, maka "ebubo ọjọọ o kwuru Uche Maduagwu na-ebogharị ya na soshal midia.
N'ihe onyonyo ahụ, a hụrụ ka Jim Iyke na-ajụ ndị nwe ụlọrụ Akụkọ Naija Hood, ihe mere ha jiri nye Uche ohere ịbata n'ụlọọrụ ha, n'otu aka ahụ Uche gwara ya na EFCC na-achọ ya.
Jim Iyke makwuru Uche, kụọ ya dukaduka.
O dobeghị anya na ya bụ onyonyo abụ ejije ma na ọ bụghị kama na abalị atọ gara aga, Uche wepụtara ozi n'Instagram yaebe ọ na-ebubo na ọ maghị ebe Jim Iyke si enweta ego o ji azụ akwa na-daara oke ọnụ ahịa.
Uche Maduagwu , onye kwuru na ya ma ejike, ma na-etikwa akwa na akpụkpọụkwụ dị mma, na ya amaghị ihe mere na ọ bụ naanị ndị dịka Jim Iyke, Obi Cubana na Husphpuppi ka ndị ntaakụkọ na-ede maka ha.
O wepụtakwara edemede na-ekwuo otu okwu ahụ.
Mbọ BBC Igbo gbara ịmata ma ihe onyonyo ahụ ọ bụ ejije maọbụ ihe mere n'ihe amịtaghị mkpụrụ dịka mmadụ abụọ ndị ahụ asabeghị ozi anyị zigara ha na soshal midia oge anyị wepụtara akụkọ a.
Onye bụ Uche Maduagwu?

Ebe foto si, Uche Maduagwu/Instagram
- Nwa amadi a bụ onye ejije Nollywood a maa ama
- Uche Maduagwu bụ onye Anambara steeti
- A mụrụ ya n'ala Igbo mana ọ bụ na Legọs ka ọ nọ gụtopụ akwụkwọ
- Ọ gụrụ 'Sociology na mahadum 'Lagos State University'.
- A ma Uche ama maka ịkọ okwu na ụka na soshal midia .
- Ọ kpọrịala ọtụ ndị ama ama gụnyere otiegwu Davido, o me ihe ejije ndị Yoroba bụ Moyo Lawal na ndị ọsọ.
- O nweghị onye ma ma Uche ọ lụọla nwaanyị maọbụ ma ọ mụtala nwa n'ihi na ọ naghị ekwu banyere ezinaụlọ ya nke ọ na-etinye foto ha n'ọba ozi ya na soshal midia
- N'afọ 2020, Uche wuru ewu na soshal midia maka ikwu na ya bụ nwoke nwoke ibe ya na-amasị mana o mechara kwuo na ya ji ya bụ okwu egwu egwu
Onye bụ Jim Iyke?

Ebe foto si, Alamy
- James Ikechukwu Esomugha a ma dịka 'Jim Iyke' bụ onye ihe ejije Nollywood a na-anụ aha ya.
- Ama Jim Iyke maka ime agwa 'anụntị' n'ihe ejije ụfọdụ
- o sonyela n'ihe ejije karịrị otu narị nke gụnyere ; "Last Flight to Abuja", "Stalker", "Set-up"wdg.
- O hiwere ụlọọrụ na-emepụ ihe ejije nke ya n'afọ 2007
- Ọ bụ onye Anambara steeti mana a mụrụ ya na Gabon
- Ọ gụrụ "philosophy na Mahadum 'University of Jos'















