Nwoke a na-ebo ebubo igbu ma gbaa nwanne ya ọkụ maka esemokwu ala
A na-atụ otu nwoke aka maka ebubo igbu ma gbaa nwanne ya nwoke ọkụ n’okpuruọchịchị Aguata nke Anambra steeti maka esemokwu ala.
Ka akụkọ si kwuo, nwoke a nọ n’ụlọ ya mgbe nwanne ya a na-enyo n’okwu ọnwụ ya bịara be ya gbuo ya ma gbaa ya ọkụ n’ụbọchị 30 nke ọnwa Jenụwarị, 2022.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na anwụchịela nwoke a a na-enyo n'okwu a ma malite nnyocha ime ihe mere n'ezie.
Kirie ihe onyonyo a ka ịnụrụ ihe nwanne ya nwoke gwara BBC Igbo.