Mr Ibu: Ihe nwa ya kwuru maka ‘ọrịa ọjọọ' ọ na-arịa ugbua

Ebe foto si, Chioma Jasmine Okafor
Chioma Jasmine Okafor bụ nwa onye na-eme ihe nkiri bụ John Okafor e ji Mr Ibu maara akọwaala ọnọdụ ahụike nna ya.
O kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya ịjụ ya banyere ahụike nna nke Mr Ibu ji aka ya kwupụta na soshal midia.
Jasmine kwuru na ọ bụ eziokwu na nna ya nọ n’ute ọrịa n’ụlọọgwụ ugbua mana na ọ gaghị ekwunwu etu ọ dị ya ugbua maka na ọ nọghị nna ya nso.
“A mabeghi kpọmkwem ihe na-arịa nna m, ka na-eme nyocha ịchọpụta, tinyekwara na anọghị m ya nso ugbua.”
Jasmine kwuru ka anyị kpọghachị ya echi mgbe mpụtara nyocha ahụ ya ga-apụta.
Cheta na Mr. Ibu bụ onye gbara afọ iri isii na abụọ n’ụbọchị Tuzde nọ n’ụlọọgwụ mee ncheta ụbọchị ọmụmụ ya.
Mana ụbọchị Tuzde ka ihe onyonyo na-efegharị na sohal midia ebe o di na n’ute ọrịa na-arịọ ka ndị mmadụ kpeere ya ekpere mgbake.
Ibu kwuru na ọ nọ n’ụlọogwụ n’ihi ‘ọrịa ọjọọ a na-amabeghi ihe ọ bụ’.
Ọnọdụ ahụike Mr Ibu adịghị mma n’ime ihe onyonyo ahụ.
Onye bu Mr ibu?
Ezi aha ya bụ John Ikechukwu Okafor mana e ji 'Mr Ibu' bụ agwa o mere n'ihe onyonyo wuru ewu n'afọ 2004 a kpọrọ 'Mr Ibu' were mara ya.
Onye Eziokwu dị n'Okpuru Ọchịchị Nkanu-West n'Enugwu steeti, John Okafor bụ ọkpachi e ji ime iberibe mara.
Ejije o sonyerela gụnyere 'Hotel De Jordan', 'Agony', 'Rolling Stone', 'FourFourty' dgz.
Okafor bụkwa onye ọtụtụ ụlọ ahịa dịka Glo,Gotv jirila ihu ya ree ahịa
Okafor lụrụ nwaanyị ma jidekwa ụmụ









