Mr Ibu: E beela nna m otu ụkwụ iji dowe ya ndụ- Nwa ya nwaanyị

Ebe foto si, Mr Ibu/Instagram
E beela onye ejije Nollywood a ma ama bụ John Okafor a ma dịka 'Mr Ibu' ụkwụ dịka a na-azọ ndụ ya n'ụlọọgwụ.
Nwa ya nwaanyị bụ Jasmine Okafor bụ onye gbara ama a n'ozi o nyere BBC Igbo n'akara ọbaozi ya n'Instagram n'ehihe taa bụ Monde(6/11/2023).
Ozi ahụ kwuru sị, "Dịka a wara 'Mr Ibu' ahụ ugboro asaa, n'ehihie taa n'ebe Elekere Mbu nke ehihie, e bepụrụ ya otu ụkwụ iji zọọ ya ma gbatịa ndụ ya."

Ebe foto si, Mr Ibu/Instagram
O doghị anya ọrịa Mr Ibu na-arịa mana nwaamadi ahụ dara ahụ na nsonso a nke bugara ụlọọgwụ kemgbe izu ole na ole gara aga.
Dịka ezinaụlọ ya sibu kwuo, a waburu Mr Ibu ahụ ugboro ise dịka ndị dọkịta na-azọ ndụ ya.
Nke a abụghị mbụ Okafor na-arịa nnukwu ahụ.
Cheta na n'afọ 2022, Mr Ibu dara nnukwu ọrịa ma mechaa si n'ute ọrịa kulie.
Ọ gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ka nke ahụ mechara sị, "Ihe m gabigara n'ute ọrịa, ọ bụrụ n'ọnwụ, mmadụ anwụchaala mana Chineke ekweghi ka ọ dị etu ahụ."

Ebe foto si, Getty Images
N'ebe nile, akụkọ ọtụtụ ụmụ Naijiria bi n'ọhịa ma n'ụlọ kpụ n'ọnụ bụ akụkọ na-ebepụrụ ụkwụ John Okafor, ome ihe ejije Nollywood a ma ama dịka 'Mr Ibu.
Mana dịka ya bụ akụkọ na-akpọtụ, lee ụfọdụ ọrịa nwere ike idunye ndị dọkịta ibepụ ụkwụ mmadụ iji zọọ ndụ ya dịka Dọkịta McGinger Ibeneme sị kọwaara BBC Igbo na mkparịtaụka:
1. Ọrịa shuga
Ọrịa shuga nke Bekee kpọrọ Diabetes bụ ọrịa bụ mmadụ inwe oke shuga n'ọbara dịka akụkọ ahụ na-agbanwe shuga mmadụ riri na-gba anyụba n'ọrụ ya.
Dkta Mcginger Ibemene kọwara na ọrịa shuga bụ ọrịa mbụ n'oge ugbua nke kachasị eme ka ebepụ ụkwụ.
Ọ kọwara sị," Ọrịa shuga na-akpata ọnya mee mmadụ, ọ bụrụ na agbasighị ike gwọo onye ahụ, ụkwụ ya erewe."
"O nwere ka ụkwụ ahụ ga-esi rewe, ihe fọdụrụ a ga eme ya ka onye ahụ ghara ịnwụ bụ ibepụ ya ụkwụ."
Emeghị etu ahụ, nje ga-abanye onye ahụ n'obi (chest infection) maọbụ n'isi ( meningitis/brain infection) nke nwere ike igbu onye ahụ."
Dkta Ibeneme , onye kwuruna ọrịa suga nwere ike ibute nsogbu ndị ọzọ dịka ọrịa imeju(liver), ụkwụ ọzịza,ihe nwoke ekelinwughị elu,na ọrịa ndị ọzọ, tụrụ arịrị na ọtụtụ mgbe, ndị be anyị na-ekwu na-enyere ha nsị, na-aga n'ụlọekpere nakwa ebe a na-eme anwansi, kama ịga ụlọọgwụ n'oge nata nleta zuru oke maka ọrịa na-enye ha nsogbu.

Ebe foto si, Getty Images
2. 'Varicose veins'
'Varicose veins' bụ ọrịa akwara ntụrịkọ. Nke a bụ ọrịa na-emetụtakarị ụkwụ mmadụ, mee ịkwụ ọtọ maọbụ ịga ije.
Dkta Ibeneme sịrị, " Ọ bụrụ n'akwara ọbara suchie, ọbara enweghịkwa ike na-aga n'akụkụ ụkwụ maọbụ mkpisi ụkwụ. O nwere ike ime ka akụkụ ụkwụ ahụ bido rewe erewe."
3. 'Lymphatic blockage'
'Lymphhactic blockage' bụ mkpọchị ọwa na-ekesa mmiri n'ahụ mmadụ . Otu n'ime njirimara ọnọdụ ahụ bụ na ụkwụ maọbụ aka o metụtara na-aza aza nke nwere ike ibute ahụ ụfụ maọbụ mgbakasịahụ..
Dịka Dkta Ibeneme si kwuo,ọrịa 'lymphatic blockage bụkwa ọrịa ọzọ nwere ike ime ka e bepụ ụkwụ mmadụ.
Ọ sịrị, "Lymph bụ ebe mmiri si agagharị n'ahụ mmadụ.Ọ bụrụ u na

Ebe foto si, Getty images
4.'Ọrịa ụkwụ aba shoe'
Ọrịa ' 'ụkwụ aba shoe' nke Bekee na-akpọ ya 'lymphatic filariasis' maọbụ 'elephantiasis, bụ ọrịa nke anwụnta9Culex, anopheles /aedes mosquitoes) na-ebute nke na-emetụta ọwa na-eke mmiri n'ahụ mmadụ.
Ọrịa nke mmadụ ruru nde 120 na-arịa n'ụwa, dịka WHO si kwuo, nwere ike banye mmadụ n'ahụ na nwata nọọ ogologo oge n'ahụ onye ahụ tupu ọ pụta ihe.
Ọ pụta ihe, njirimara ọrịa 'ụkwụ aba shoe' gụnyere ụkwụ, aka nakwa ihe mmadụ ji bụrụ nwoke maọbụ nwaanyị ịza aza.

Ebe foto si, Getty Images
5. Ihe mberede metụtara ọkpụkpụ
Ihe ọzọ nwere ike ibute na ndị dọkịta ga-ebepụ ụkwụ mmadụ bụ ma ọ bụru na mmadụ adaa ada, gbajie ụkwụ maọbụ ndanye n'ihe mberede okporoụzọ maọbụ merụọ ahụ dịka o na-eme egwuregwu nke butere mgbaji ọkpụkpụ n'ebe ọ dị ọjọọ.
Dkta Ibeneme kọwara sị, "Onye gbajie ụkwụ, ọ bụrụ na agwọghị ya ọfụma, ụkwụ ahụ nwere ike rewe."
Dịka o siri kọwa, ụkwụ rewe ma ebepụ ya, nje nwere ike ịba ya( nke bekee kpọrọ 'sepsis maọbụ Septiciama', nke nwere ike butere onye ahụ ọnwụ.












