Israel-Gaza crisis:'Ndị nchekwa nzuzo Izrel kpọrọ m n'ekwentị si anyị pụọ ebe anyị nọ na ha ga-atụ ogbunigwe n'awa abụọ'

Ebe foto si, Getty/BBC
Otu nwoke onye Palestine bụ dọkịta eze akọwaala etu ndị uweojii nzuzo nke mba Izrel si kpọ ya n'eekwentị gbara ya ama na ha chọrọ ịtụ ogbunigwe na mpaghara evbe obi.
Mahmoud Sasheen kwuru na ya bụ ihe mere na Tọzde,abalị 19 nke ọnwa Oktoba n'ebe Elekere isii na ọkara dịka mba Izrel tụọọrla ogbunigwe na Gaza ezughị ike abalị 12.
Saheen , onye bi n'ogogo nke atọ n'otu ụlọelu dị na al-Zahra, na mpaghara Ugwu Gaza kwuru na kemgbe ịtụ ogbunigwe malitere na atụbeghị na mpaghara ebe ahụ tupu ozi ahụ abịa.
Dịka Mahmoud si kwuo, ozi ahụ nke si otu olu enweghị akara sịrị, " Esi m na ngalaba uweojii nzuzo Izrel akpọ gị."
"Oku ekwenti ahụ nke nọrọ ọkara awa bụ ihe kachasị tụọ ya egwu na ndụ ya.
Olu ahụ nke kporuru Mahmoud aha ya n'isi kwuru n'asụsụ Arabic sị, " Anyị ga-atụ ogbunigwe na''Three Towers'.''

Ebe foto si, Reuters
Ọtụtụ mba nakwa otu 'United Nations' akpoola oku ka a gbanyụọ ọkụ ọgụ (ceasefire) na-ada n'etiti ndị Izrel na ndị Hamas nọ na Gaza.
Mana ụfọdụ dịka mba Briten, Amerịka na otu European Union akwadoghị atụmatụ ahụ, si na ọ ga-abara ndị Hamas bụ ndị gọọmentị mba dịka na Ọdịda Anyanwụ Yurop gunyerela dịka ndị oyindụegwu.
Kedụ ihe dị iche?
Dịka anyị na-ewetara gị akụkọ, mba Amerịka na-akpo oku ka e nwee njide ume nwa mgbe nta maka ọrụ ebere.( humanitarian pause).
E were ya tụgwara ịgbanyụ ọkụ ọgụ, injide ume nwa mgbe nta na-adị naanị nwa obere oge, ihe dịka awa ole ma ole- ọ na-abụkarị oge nakwa ebe e kwubiri.
A na-eme ya iji nwee ohere ikesa ngwa enyemaka. Nke a dị iche na igbo mkpa ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị , dịka otu United Nattion si kwuo.
N'aka nke ọzọ ịgbanyụ ọkụ ọgụ(ceasefire) na-ewe ogologo oge. A naemekarị ya iji nye ohere ka ndị na-ese okwu kpaa ụka, ọkachasị nwee ohere ịkpa etu ha ga-esi nwee ndozi tọọrọ atọ, dịka United Nations.

Ebe foto si, IDF
Ụlọọrụ ekwenti kachasi na Gaza bụ "Paltel’’ ekwuọla na ekwenti ga-akwusi iru ọrụ na Gaza.
Nke a ga-eme ya mgboro abuọ ekwenti na-akwụsị ịrụ ọru n’ime izuụka gara-aga na Gaza.
Ugbua, ụlọọru na-ahu maka mgbasaozi n'ekwenti nke mbauwa nile agbaala akaebe na Gaza ga-enwe nsogbu ekwenti nke ga-emetuta ulọekwenti ha bụ ‘’Paltel’’
N’otu aka ahụ, ndiagha Israel ekewapụtala ’websaitị ebe ha na-edetu ndi otu ha ole nwụọla n’agha ha na Hamas kemgbe a wakporo ha n’ubọchị asaa nke ọnwa Ọktọba, afọ 2023.
Ha tinyere fọtọ ndi nwụrụ nakwa afo ole ha gbara n’websaitị ahu.
Mmadu 11 nwụrụ ụnyahụ(Tuzde) nọ n’agbata afo iri na itoolu nakwa iri abụọ na anọ, dị ka ha sịrị kwu.
Israel kwuru na mmadu 326 anwụola n’agha,kemgbe 7 Ọktọba Hamas wakpọrọ ha.
Na Gaza,ụlọọrụ ahuike nke Hamas na-enye ọnụọgụgụ mmadu ole na-anwụ kwa ụbọchị kemgbe abalị asaa nke ọnwa Ọktọba a malitere agha.
Mgbe edere akukọ a ihe rurụ mmadu 8,525 anwuọla.

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Praịm Mịnịsta mba Israel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na ha agaghị akwụsị ibuso otu Hamas agha dịka ọtụtụ mba na-akpọ oku ka a kwụsị ịkwa mgbọ.
N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Mọnde, Netanyahu kwuru na ọ bụghị Israel bidoro agha ahụ, mana ọ bụ Israel ga-emeri ya.
"Dịka mba US agaghị ekwe ịkwụsị ibu agha oge a tụrụ ogbunigwe na 'Pearl Harbour' maọbụ dịka e mechara mwakpo 9/11, Israel agaghị ekwenye ịkwụsị ibuso Hamas agha dịka ha mechara mwakpo ọjọọ nke ụbọchị Ọktoba 7," ka o kwuru.
"Ịkpọ oku ka anyị kwụsi ibuso Hamas agha bụ ịkpọ oku ka Israel chiliere Hamas aka elu, ka anyị chiliere ndị na-eyi ndụ egwu aka elu."
"Bible kwuru na 'e nwere oge udo, nwekwaa oge ịlụ agha;, ugbua bụ oge ịlụ agha."
"Agha anyị na-alụ bụ maka ọdịnihu anyị niile. Taa ka anyị na-akapaụta okeala n'etiti ndị chọrọ ọganihu na ndị chọrọ nlaghachi azụ.
Netanyahu kwuru na mwakpo Hamas mere na mba Israel n'Ọktoba 7 na-echetara anyị niile na anyị agaghị enwe ọdịnihu dị mma n'ụwa ma ọ bụrụ na ụwa niile agbakọtaghị aka buso ndị 'barbarian' agha. Ha onwe ha dị njikere ibuso anyị agha."
Agha a agaghị adị mfe - IDF

Ebe foto si, Reuters
Mkparịtaụka a Netanyahu na ndị ntaakụkọ nwere na-abịa dịka akụkọ kwuru na ndị agha mba Israel, bekee na-akpọ 'Israel Defence Force' abanyela na Gaza.
Mana Mịnịsta nchekwa mba Israel bụ Yoav Gallant kwuru na "agha a agaghị adị mfe, mana anyị dị njikere ịlụ ya ma nweta mmeri iji gbapụta ndị nke a nyị e ji eji".
Ha kwuru na ha azọpụtala otu nwaanyị onye agha Israel aha ya bụ Ori Megidish, bụ onye ndị Hamas kpụụrụ na mwakpo nke ụbọchị 7 nke Ọktoba.
Netanyahu kwuru n'akara Twitter ya na obi dị ya ụtọ na onye agha ahụ nọ n'ahụike.
Mana akụkọ apụtakwala na mmadụ abụọ ndị mba Tanzania so na ndị ndịagha Hamas kpụụrụ n'ụbọchị 7 nke Ọktoba.
Aha mmadụ abụọ a bụ Joshua Loitu Mollel na Clemence Felix Mtenga, ụmụakwụkwọ abụọ gara mba Israel maka atụmatụ mmụta ịkọ ọrụ ugbo nke a kpọrọ 'agricultural internship programme'.














