Ben Nwabueze: Ihe Ohaneze, Obi,Uzodimma, ndị ọzọ na-ekwu maka ọnwụ Nwabueze

Ben Nwabueze: Ihe Ohaneze, Obi,Uzodimma, ndị ọzọ na-ekwu maka ọnwụ Nwabueze

Ben Nwabueze

Ebe foto si, Ben Nwabueze Centre

Otu Ohaneze Ndigbo, onye zọrọ ọkwa onyeisala na Ntuliaka 2023 n'aha Labour Party bụ Peter Obi na aka na-achị Imo steeti maburukwa onyeisi otu jikọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ(South-East Governors Forum) bụ Hope Uzodimma, atụọla arịrị maka ọnwụ nnukwu ọkaiwu nwere agba bụ Ọkammụta Ben Nwabueze.

Ọkammụta Nwabueze nwụrụ Ụbọchịụka ka ọ gbachara afọ 94.

N'ozi ha wepụtara na mgbede Ụbọchị Monde, Ohanaeze Ndigbo kwuru na ọnwụ Nwabueze bụ "nnukwu ihe obi mgbawa".

Onyeisi Ohaneze bụ Ichie Emmanuel Iwuanyanwuonye kọwara Nwabueze dịka nnukwu ọkaiwu, onyenkuzi nakwa onye bụbu Mịnista na Odeakwụkwọ Ukwu mbụ nke otu ahụ tụrụ arịrị maka ọnwụ "otu n'ime Igbo ji eme ọnụ".

N'ozi ahụ nke ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnia binyere aka ma wepụta sịrị na ihe mechara ka ọnwụ ya dị mwute karịa bụ na o sochiri ọnwụ ndị ndu Ohaneze abụọ Ọkammụta Joe Irukwu na George Obiozor.

Peter Obi, onye kowara Nwabueze dịka onye ihe metụtara Naijiria na-anọ ọkụ n'obi, kwuru n'ozi o wepụtara n'akara X(Twitter) sị," Ọnwụ nwafọ Naijiria a na akwanyere ukwu ma bụrụ onye m hụrụ dịka nna gbajọrọ m obi."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

N'otu aka ahụ, Gọvanọ Uzodinmma nke Imo steeti kwuru na ọnwụ Nwabueze bụ "nnukwu ihe furu ndị Anambara nakwa Naijiria nile."

Ben Nwabueze, ọkaiwu nwere agba alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 94
Ben Nwabueze

Ebe foto si, Screengrab/Channels Youtube

Nkọwa foto, Ọkaiwu Ben Nwabueze lara mmụọ n'ụbọchị Sọnde, Ọktoba 29, 2023

Ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa bụ Ben Nwabueze, onye bụkwa nnukwu ọkammụta na ngalaba mmụta iwu, alaala mmụọ.

Nwabueze nwụrụ n'ụbọchị Sọnde, nke bụ ụbọchị 29 nke ọnwa ọktoba afọ 2023. Ọ dị afọ 94, dịka otu n'ime ndị ezinụlọ ya bụ Eni Nwabueze si zitere BBC ọkwa ọnwụ ya.

Ozi ahụ ekwughị ihe kpatara ọnwụ Ọkammụta Nwabueze, kama o kwuru na "a ga-ewepụta ozi maka usoro olili ya n'oge adịghị anya".

Ihe ndị dị mkpa i kwesịrị ịma maka ndụ ọkaiwu Ben Nwabueze

Ben Nwabueze na Atiku Abubakar

Ebe foto si, PDP

Nkọwa foto, Ben Nwabueze bụ onyeisi ndị ọkaiwu nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP n'ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere n'afọ 2019
  • Ọkaiwu Nwabueze, onye obodo Atani n'Anambra Steeti bụ onye ọkaiwu mbụ si na nkuzi nweta ọkwa 'Senior Advocate of Nigeria' n'afọ 1978 n'ihi ọtụtụ akwụkwọ o dere maka ngalaba mmụta iwu. Mara na ndị na-enwetakarị ọkwa SAN na-abụkarị ndị na-agakarị ụlọikpe.
  • O so na ndị hibere otu Ohaneze Ndigbo n'afọ 1976, ya na ụfọdụ ndị Igbo ndị ọzọ dịka Akanu Ibiam, Michael Okpara, K.O Mbadiwe, P.N. Okigbo, na ndị ọzọ.
  • Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisi Ohaneze ndị Igbo n'afọ 1978. "N'oge ahụ, enwebeghị ọkwa 'President General' n'otu Ohaneze Ndigbo, ọkwa kachasị oge ahụ bụ 'Ezecutive Secretary," ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze Ndigbo ugbua bụ Alex Ogbonnia gwara BBC Igbo.
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Disemba ebe a ma ugbua dịka okpuruọchịchị Ogbaru, n'Anambra Steeti.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị na CMS Central School Atani 1938-45), gụọ Sekọndịrị na CMS Central School Ọnịcha (1947-50)
  • Ọ gụrụ Mahadum na Mahadum London, mechaa malite ọrụ nkuzi na Holborn College of Law na London
  • O mechara kuzie na Mahadum nke Naịjirịa dị na Nsukka, Mahadum Zambia, Mahadum Jos, Mahadum Lagos, Mahdum Ife, Mahadum Dar-es-salaam, Nairobi, Ethiopia, Lesotho, Botswana, na Swaziland, na ọtụtụ Mahadum ndị ọzọ.
  • O dere akwụkwọ karịrị 30 na ngalaba mmụta iwu na Naịjirịa nakwa Afrịka
  • O dekwaala akwụkwọ edide karịrị 200 ma nywka nkuzi n'ọgbakọ mmụta karịrị 100
  • O nwetara nkwanyeugwu nke Naịjirịa a na-akpọ 'Nigerian Order of Merit'
  • N'afọ 2019, ọkaiwu Ben Nwabueze bụ onyeisi ndị ọkaiwu nọchitere anya otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' na Abubakar Atiku bụ onye zọọrọla ha ọkwa onyeisiala n'afọ 2019.
  • Ọkaiwu Nwabueze so na ndị gbara mbọ ikwuchite ọnụ nke ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob n'ịchafụ n'afọ 2018 oge gọọmentị Naịjirịa kpọpụtara otu ahụ dịka ndị na-eyi ndụ egwu.