Gịnị mere Ụlọikpe Mkpegharị jiri kwado mmachibido otu IPOB?

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe Mkpegharị nọ n'Abụja akwadola mmachibido gọọmentị etiti machiri otu Indigenous People of Biafra (IPOB) dịka otu na-eyi ndị mmadụ egwu.
E kpebiri ikpe ahụ n'ụbọchị Tọzde 30 Jenụwarị 2025 dịka ọ gara ọtụtụ afọ a na-ekpe ikpe ahụ malitere n'afọ 2017.
Dịka ụlọikpe kwetara na ikpe ahụ enweghị ume, ọ gara n'ihu iwepụ mkpesa ndị IPOB ma gbado ụkwụ na ọ bụ n'ihi nchekwa obodo na ihe mberede mere o jiri kwado mmachi gọọmentị etiti machiri ya.
Mana Ọkaikpe Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor kwuru na mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị agaghị enwe mmetụta ọbụla n'okwu Mazi Nnamdi Kanu, n'ihi na mkpebi ahụ abụghị nke ikpeazụ, maka ndị otu ahụ na-akwado ịga Ụlọikpe kasị elu nke bụ ebe a na-ekpe ikpe ikpeazụ.
Cheta na ndị Ọkaikpe IPOB tinyere akwụkwọ n'Ụlọikpe Mkpegharị n'ọnwa Ọktoba 2024 iji dogharịa mmachịbido gọọmentị etiti machiri otu ahụ.
Ha kwuru na usoro e jiri nye iwu mmachibido ahụ megidere ikpe ziri ezi, n'ihi na emeghị ka IPOB mara maka ọkwu ahụ, anụghịkwa ya tupu gọọmentị enye iwu mmachibido ahụ.
Ha kwukwara na gọọmentị etiti nwetere iwu mmachibido ahụ site na ngwa "ex parte" kama isite n'ikpe ozizi ziri ezi nke onye Ọkaikpe na-enye.
Ụlọikpe ewepula mmachi Ipob, kwuo ka enye Nnamdi Kanu ijeri 8

Otu ụlọikpe dị n'Enugwu ekwuola na mmachi amachiri otu Indigenous people of Biafra bụ Ipob n'ịchafụ agbadoghi ụkwụ n'iwu ala nke mere na akagburu ya akagbu.
Cheta na ọgbakọ ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ nke Dave Umahi bụbu onyeisi ha jikọrọ aka machie otu Ipob n'afọ 2017 nke mere ka gọọmentị etiti soro nzọmụkwụ ha ịkpọ Ipob aha dịka otu na-eyi ndụ egwu ka abalị atọ gachara.
Onyeisi otu ahụ bụ Nnamdi Kanu nke nọ n'aka DSS si n'ọnụ ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor gaa ụlọikpe ịtụgharị ya bụ mmachi.
Ọ kọwara na Ipob bụ otu "ụmụ Naịjirịa si ala Igbo na-egosi ọchịchọ ha ịnweta mwereonwe.
Ọ bụ Ọkaikpe A.O. Onovo nyere ikpe a ma kwuo na mkpebi ya na mmachi otu Ipob dara iwu ma megide iwu ala.
Ọ gwara gọọmentị etiti nakwa ọgbakọ ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ ha kwụọ Kanu ijeri naira asatọ iji ti ya aka n'obi ma rịọ ya mgbaghara n'ihu ọha.

Ebe foto si, AFP
Kedụ ihe ga-eme otu Ipob ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Nnmadi Kanu bụkwa onye nọchiri anya ya n'ikpe gwara BBC na otu Ipob nwereike ịgara onwe ha mkpa ha.
O kwukwara na ọ dịzị n'aka ndị gọọmentị etiti nakwa otu ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ isoro atụmatụ ga-atụgharị mmachi ahụ.
"Ha ka ọ dịịrị isozi ụzọ ga-atụgharị mmachi a n'ihi na ọ bụ iwu nyere ya" ka Ejimakor kwuru.
Ihe ọzo Ejimakor kwuru bụ etu mmachi Ipob dịka otu na-eyi ndụ egwu si metụta ndị otu ahụ.
Ọ sị na o nyere ndị ọrụ nchekwa dị icheiche ikike ijichi, nwụchi, megbuo maọbụ gbuo ndị otu Ipob etu o si sọ ha.
Ejimakor kwukwara na otu Ipob ndị ọzọ bi n'ofesi nọzị n'ụjọ ịnata Naịjirịa maka ihe nwereike ịme ha ma ha nata.
Ọ sịkwa na ọ bụ n'okpuru ikike ahụ ka gọọmentị etiti gbadoro ụkwụ iji nwụchi ma tụbata Nnamdi Kanu ala Naịjirịa.









