Nnamdi Kanu degaara ọkaikpe ukwu Naịjirịa akwụkwọ mkpesa maka ọkaikpe Binta Murtala-Nyako

Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor degaara ọkaikpe ukwu Naịjirịa akwụkwọ mkpesa maka ọkaikpe Binta Nyako.

N'akwụkwọ mkpesa ahụ, Aloy Ejimakor rịọrọ ka ọkaikpe ukwu Naịjirịa tinye anya n'etu ikpe Nnamdi Kanu na Goomentị etiti Naịjirịa si aga n'ụlọikpe dị elu.

Ejimakor kwuru na ihe mere ya ji dee akwụkwọ mkpesa ahụ bụ ka ọ nwere ikike o were nye iwu ka ọkaikpe kacha n'ụlọikpe dị elu mee ihe dị n'iwu Naịjirịa ma buru ikpe Nnamdi Kanu buga n'ụlọikpe were ikike ikpe Nnamdi Kanu ikpe.

Ihe mere tupuu Nnamdi Kanu edee akwụkwọ mkpesa ahụ

Aloy Ejimakor deputara ihe niile mere tupuu o dee akwụkwọ mkpesa ahụ ma rịọ ka a napụ ọkaikpe Binta Nyako ikpe Nnamdi Kanu.

Ihe ndị ahụ mere gunyere:

  • Na Ọkaikpe Binta Murtala-Nyako nwezugara onwe ya n'ikpe Nnamdi Kanu kemgbe Seputemba 24, 2024.
  • Ọzọ bụ na ihe mere Binta nyako jiri nwezuga onwe ya bụ na Nnamdi Kanu enweghị ntụkwasị obi n'ebe ọ nọ
  • Ọzọ bụ na ọkaikpe Binta Nyako kagburu iwu ịtọhapụ Nnamdi Kanu nke ụlọikpe dị elu nyerea.
  • N'agbanyeghị na e deela akwụkwọ sị ka e nwere ikpe Nnamdi kanu nye ọkaikpe ọzọ mana ọkaikpe kachasị n'ụlọikpe dị elu nwere ikpe ahụ nyekwa Binta Nyako ọzọ.
  • Nnamdi Kanu edeela akwụkwọ mkpesa degara National Judicial Council banyere etu Binta Nyako si ekpe ikpe ya.

Ejimakor kwuru n'ihe ndị a niile mere ha jiri dee akwụkwọ mkpesa degara ọkaikpe Kachasị na Naịjirịa ka onye iwu ka e ziga ikpe Nnamdi Kanu n'ụlọikpe ọzọ n'Abuja maọbụ buga ikpe ya na mpaghara n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Onye arịọla onye ọbụla arịrịọ n'aha m make na onweghị mpụ m mere - Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya Aloy Elimakor
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya Aloy Elimakor

Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) agawala ndị niile na-akpọ ka gọọmenti Naịjirịa tọhapụ ya ka ha ghara ịrịọ gọọmenti arịrịọ banyere ntọhapụ ya maka na enweghị mpụ ọbụla o mere.

N'okwu ọkaiwu na-anọchiteanya Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor wepụtara, o kwuru na Nnamdi Kanu kelere ọtụtụ igwe mmadụ na-akpọ oku ka a tọhapụ ya ma kọwaa mkpa ọ dị ka oku ntọhapụ ya bụrụ oku nke na-ekwu ka gọọmenti mezuo mkpebi ụlọikpe Federal High Court nke katọrọ nwụchi ya dịka nke megidere iwu ma kwuo ka a tọhapụ.

Nnamdi Kanu kwuru na ya anaghị achọ maọbụ arịọ ka gọọmenti Naịjirịa gbaghara ya kama na ọ bụ ka gọọmenti rube isi nye iwu ụlọikpe nyere nke kwuru na enweghị mpụ ọbụla o mere.

Cheta na gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ma kpọlata Naịjirịa kemgbe afọ 2021 ka nọ n'aka ndị uweojii pụrụiche bụ DSS kemgbe ahụ n'agbanyeghi mkpebi dị icheiche ụlọikpe nyere ka atọghapụ ya ma kwuo ya ụgwọ mmekpahụ.

E nyela Nnamdi Kanu akwụkwọ ịbịa ngwa ngwa n'ụlọikpe ọkaikpe Binta Nyako

Nnamdi Kanu na Ọkaikpe Binta Nyako

Ebe foto si, Getty Images / BBC

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na Ọkaikpe Binta Nyako
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọkaiwu Aloy Ejimakor agbaala akwụkwọ ka e si n'Abuja nwega ikpe Namdi Kanu na steeti ọbụla dị na ndịda ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa. Akara akwụkwọ ahụ Ejimakor gbara bụ FHC/ABJ/CR/383/2015.

Cheta na Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu gọọmentị Naịjirịa machịrị bụ Indigenous People of Biafra (IPOB) na-azọ nwere onwe ndị Biafra.

Ejimakor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu na-ekwu na ụlọikpe dị elu nyere Nnamdi Kanu akwụkwọ ịbịa zara ọnụ ya n'ụbọchị Mọnde 10 Febuwarị, 2025 n'ụlọikpe Ọkaikpe Binta Nyako.

Ejimakor mere ka a mata nke a oge ha gara leta Nnamdi Kanu n'ụlọnga ndị ọrụ nchekwa.

O kwuru na oku ụlọikpe ahụ na-abịa n'agbanyeghị na ha entinyela akwụkwọ ka ụlọikpe nwega ikpe Nnamdi Kanu na steeti dị na ndịda ọwụwa anyanwụ nke akara ya bụ FHC/ABJ/CR/383/2015 .

Ejimakor kọwara na "Binta Nyako na mbụ enwezugara onwe ya n'ikpe Nnamdi Kanu nke ndị bekee na-akpọ "recuse". Ọ sị na ọ bụ ihe mgbagwoju anya na ọ bụ n'ụlọikpe Binta Nyako ka ha sị Nnamdi Kanu bịa".

Ha kọwara maka na "kemgbe ọkaikpe Binta Nyako wezugara onwe ya n'ikpe ahụ na enweghị ọkaikpe ọzọ n'Abuja kwetere na ya were ohere ikpe ikpe ahụ, nke mere ha jiri chọọ ka e buga ikpe ahụ na ndịda ọwụwa anyanwụ".

Ejimakor na-akọwa na Binta Nyako bụ onye wezugara onwe ya enwehịzị ikike ikpe ikpe ahụ.

Ha na-arịọ ụlọikpe ka ebuga ikpe Nnamdi Kanu na ndịda ọwụwa anyanwụ tupuu o ruo n'abali iri nke ọnwa Febuwarị bụ ụbọchị kanu kwesiri ịbịa ụlọikpe.

"Recuse": Gịnị ka ọ bụ? Gịnị ka ọ pụtarala Nnamdi Kanu?

Ọkaikpe Binta Nyako na Onyendu IPOB bụ Nnamdi Kanu

Ọkaikpe na-ekpe ikpe Nnamdi Kanu bụ Binta Nyako ewepula onwe ya dịka ọkaikpe ga na-anụrụ ikpe ahụ.

Nke a mere mgbe Kanu bịara n'ihu ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Sepụtemba ma kwuo na o nweghizi ntụkwasị obi n'ikike Nyako ị nụrụ ikpe ahụ n'akpaghị oke.

Dịka Nyako si kwuo, ọ ga-enyeghachi akwụkwọ ikpe ahụ n'aka ọkaikpe kachasị na Naịjirịa ka o jiri aka ya nye ikpe ahụ n'aka onye ọzọ.

Ihe ahụ Nyako mere bụ ihe a kpọrọ 'Recuse' na Bekee nakwa asụsụ ndị ọkaiwu na ọkaikpe.

Gịnị ka 'recuse' pụtara?

Ọkaiwu Chidinma Okonkwo kọwara na mmadụ iwepu onwe a ma ka 'recuse' bụ mgbe onye ọkaiwu maọbụ ọkaikpe sepụrụ aka n'ikpe mgbe o doro anya na obi ya akwụghịzi ọtọ n'ihe gbasara ikpe ahụ.

"Ihe a na-emekarị ma ọkaikpe na-anụrụ ikpe maọbụ ọkaiwu na-anọchite anya mmadụ chọpụta na okwu a na-ekwu dị ya nso maọbụ na ọ metụtara onye dị ya nso dịka nne, nna, nwa, di, nwunye maọbụ ezi enyi onye ahụ".

"Ọ na-emekwa n'ihe gbasara agbụrụ, ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-adabere n'aka onye agbụrụ gị maọbụ onye okpukpere gị, ihe ị kwesiri ịme bụ iwepu onwe gị n'ikpe ahụ" ka Okonkwo kwuru.

Gịnị ga-emezi ikpe Nnamdi Kanu ugbua Binta Nyako wepụrụ onwe ya n’ikpe Kanu?

Dịka Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abụja wezugara onwe ya n’ikpe Onyendu IPOB bụ Nnamdi Kanụ, ihe ọ pụtara bụ na ọ ga-ebunye akwụkwọ ikpe ahụ n’aka Ọkaikpe kachasị nke Ụlọikpe ukwu etiti maka inyefe ya n’aka onye Ọkaikpe ọzọ.

Binta Nyako kwuru na ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe kachasị nke Ụlọikpe ukwu etiti anọghị n’ọrụ nke pụtara na mgbe ọ ga-enweta awụkwọ ikpe ahụ nwereike ịbụ n’ọnwa Disemba afọ 2024.

Dịka Binta siri kwuo, ọ bụrụ na akwụkwọ ikpe ahụ ruo Ọkaikpe kachasị nke Ụlọikpe ukwu etiti aka, o nweziri ike nyefee ya n’aka Ọkaikpe ọzọ ka amalite okwu ahụ n’isi. Usoro niile a nwereike ịkụrụ ọnụ n’ime ọnwa isii.

Ka o siladị, o kwuru na ọ bụrụ na Ọkaikpe kachasị nke Ụlọikpe ukwu etiti enyeghachi ya ikpe ahụ, na ọ ga-amalite n’ebe ọ kwụsịrị.

Cheta na Ọkaikpe Binta Nyako nọọrọ n’ụbọchị Tuzde 24 Septemba 2024 wezuga onwe ya n’ikpe Nnamdi Kanu oge nwaamadị ahụ kwuru na ya enwezighị ntụkwasịobi na ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi.

Ọkaikpe Binta Nyako ekwetala iwezuga onwe ya n'ikpe Nnamdi Kanu

Oge Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya wuchiri n'ụlọikpe ukwu Naịjirịa dị n'Abuja ụbọchị Tuzde 24 Septemba, 2024
Nkọwa foto, Oge Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya wuchiri n'ụlọikpe ukwu Naịjirịa dị n'Abuja ụbọchị Tuzde 24 Septemba, 2024

Ọkaikpe Binta Nyako ekwuola na ya ga-ewezuga onwe ya n'ikpe dị n'etiti onyendu Indeginous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu na gọọmenti Naịjirịa.

Ọkaikpe Nyako gbara ama taa 24 Septemba, 2024 ka Nnamdi Kanu kwuru na ya enweghị ntụkwasịobi na ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi ma rịọ ya ka o wezuga onwe n'ikpe ahụ.

Nnamdi Kanu gara n'ihu kwupụta na Ọkaikpe Nyako anaghị eso usoro iwu hibere nakwa iwu ụlọikpe kachasị na Naịjirịa.

Ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe Binta Nyako kwuru na ya ga-ewezuga onwe ya ma nyefee ikpe Nnamdi Kanu n'aka ọkaiwu ukwu gọọmenti etiti.

Ihe ga-eme n’ikpe Nnamdi Kanu taa

Onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu na Ọkaiwu ya bụ Nnamdi Ejimakor

A ga-anọ taa bụ ụbọchị Tuzde 24 Septemba 2024 leba anya n'ikpe onyendu Indeginous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu.

Nnamdị Kanu, onye a na-ebo ebubo iyi ndụ egwu na ịgba Naịjirịa mgba okpuru ka a ga-ekpe ikpe n'Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja.

Cheta na n'ụbọchị Mọnde 20 Mee 2024, Ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja jụrụ ịnabata mkpesa Nnamdi Kanu isi n'aka ndị uweojii pụrụiche bụ DSS pụọ gaa ụlọ mkpọrọ nkịtị.

N'ụbọchị ahụ, Ọkaikpe Binta Nyako kọwara na ọ dịla ugboro ugboro a na-eweta ikpe ahụ n'ihu ya ma kwusike ike na ọ gaghị agbanwe uche ya.

Ka e mesịrị, Nnamdị Kanu gbara akwụkwọ iji gbaa ụkwụ megide ebubo e boro ya gbasara ịgba Naịjirịa mgba okpuru.

N’ozi ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako bipụtara n’ọbaozi X ya n’ụbọchị Tuzde 21 Mee 2024, ọ sịrị na ha gbara akwụkwọ n’ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja iji gwa Ọkaikpe Binta Nyako ka o kwupụta na ya enweghị ikikere ileba anya n’ikpe Nnamdi Kanu.

Ka o siladị, Nnamdi Kanụ gbakwara Gọọmentị Etiti akwụkwọ n'ụlọikpe n'aalị 10 Ọgọst 2024.

N'ime akwụkwọ ahụ ka ọ rịọrọ ụlọikpe mkpegharị ka ha kwụsị ụlọikpe ukwu etiti ikpe ya ikpe maka ebubo dị icheiche e boro ya ọ kachasị ebubo iyi ndụ egwu.