Gov Fubara Impeachment plot: Etu mgbọ ndịuweojii si tugbuo okorobia so eme ngaghariiwe megide atụmatụ ichutu gọvanọ Rivers steeti

Ebe foto si, River State Govt/Clasta Ugiri
Otu nwaanyi aha ya bụ Calista Ugiri ebesaala Gọomentị Rivers steeti akwa ka ha bụnyeya ozụ nwa ya.
Nwa ya nwoke a kpọrọ Onyekachi Ugiri, gbara afọ 27, nwụrụ mgbe mgbọegbe ndi uweojii gbara n’ebe a na-eme ngaghariiwe megide atumatụ iwepụ Govano Rivers steeti bụ Simi Fubara tụrụ ya n’ubọchị Tuzde , abalị 31 nke ọnwa Ọktọba afọ 2023.
Calista kwuru na-enwere ndi uweojii bụru ozụ nwa ya.
Etu Onyekachi Ugiri siri nwụọ

Ebe foto si, Callista Ugiri
Calista kwuru na otu onye agbataobi ha aha ya bụ Chiwendu biara n’ụlọ ha kpọrọ nwa ya gaba ngagharịiwe a na-eme maka ịkwado Gọvano Rivers steetị .
O kwuru sị, ‘’Ka abalị ruru, a jụru m nwa m nwaanyi maka nwanne ya nwoke, ọ gwa m na ọ kabeghị lọta ngagharịiwe ya na Chinwedu gara.’’
‘’Ubọchị Wenede, Chinwendu gwara nwa m nwanyi na mgbọ tụrụ nwa m nwoke n ’ngagharịiwe ọ kpọ ya gaa, na Onyedikachi nwa m bu mgbọ ahu gbabaa n’ọtụ ụlọ, n’ime ụlọ ahụ ka ọ nọ ṅwụọ.
"Chiwendu na ndị ọzo gbafuru mgbe ndi uweojii na-agba egbe, ndi uweojii nwụchịrị ufodu ndi n’ime ha.’’
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Calista kwuru na mgbe ya nuru ihe mere, ọ gbagara ụlọọrụ ndi uweojii nọ na ‘’old GRA’’, ndi uweojii nọ ebe ahu gwara ya gaba nukwu ụlọọru ha, mgbe ya rutere ebe ahu, ha gwara ya na ha ahughị nwa ya.Ụlọọrụ ndi uweojii nile ọ gara kwuru na ha omaghị maka onyeobula nwụru n’egbe ha gbara n’ngaghiarị ịwe.
‘’N'ututu ubọchị atọ Nọvemba ka m huru ihe oyonyo n’egosi ebe nwa m tọgbọro n’ozụ, ahụ ya jupụtara n’ọbara’’
‘’Ana m arịọ ndi uweojii ka ha bunye m ozụ nwa m ebe ọbụla ha busara ya, na-akpọkụ gọvanọ ka ọgbatara m ọsọ enyemaka’’O kwuru n’anyamiri.
Kọmishọna uweojii Rivers steetị bụ Polycarp Nwonyi kwuru na o weghị onye ha maara nwụrụ n’ngaghịarịịwe emere n’31 Ọktọba.
CP Nwonyi dọrọ ndị mmadu aka na-nti ka ha kwụsị ngaghiarịiwe ndọrọndọrọ ọchịchị maka nchekwa ndu ha.Ọ kwuru na ha amaghị ihe ọbụla gbasara onye ahu ekwuru nwụrụ anwụ n’ngaghịarịiwe.
‘’Anyi akpọpụla mmadu nile anyi nwụchịrị ụlọọikpe, ọbụ ihe nwere ị kwu’’ CP Nwonyi kwuru nke a

Ebe foto si, Rivers State Govt/Rivers State Police Command
Komishọna ndịuweojii Rivas steeti bụ Emeka Nwonyi ekwuola na anwụchi ma kpụpụ ụlọikpe ndị aka ha dị na ọnọdụ ọgbaghara dapụtara nỤlọomeiwu steeti ahụ na mmalite izuụka.
Ndị agboro wakporo Ụlọomeiwu steeti ahụ sunye ebe ọgbakọ ndị omeiwu steeti ahụ ọkụ Ụbọchịụka, ebe Govano Fubara tụrụ ndị uweojii aka dịka a gbara ya egbe na mmiri dịka ọ na-aga Ụlọomeiwu steeti ahụ ụbọchị Monde ile ihe ndị mebiri.
Mana n'ozi, o wepụtara n'akara Twitter nke ndị uweojii steeti ahụ , Nwonyi kwuru sịrị," A ga-anwụchi onye obụla riri mperi ma kpụpụ ya ụlọikpe."
Komisọna ndị uweojii Rivas State kwukwara na ha amalitela usoro nchekwa iji gboo nsogbu nchekwa dapụtara na steeti ahụ.
Nke a na-abịa dịka Fubara rụrụ ndị uweojii aka sị na ha gbara nkịtị ma lee fuo anya dịka ọnọdụ nchekwa dara na steeti dịka ụfọdụ ndị omeiwu na-akpa nkata ịchutu Fubara n'ọkwa dịka Govanọ steeti ahụ.
Ihe anyi maa maka nkata ịchụtu Gọvanọ River state

Ebe foto si, Rivers State Government
Gọvanọ Rivas steeti bụ Siminalayi Fubara, aṅụọla iyi ịlụ ọgụ megide ndị chọrọ iji ụlọ ọmeiwu steeti ahụ chutuo ya n'ọkwa. na-emeghị eme.
Fubara kwuru nke a n'ụtụtụ taa bụ Monde so ụbọchị ndị ọrụ nchekwa na ndị Ụlọomeiwu steeti ahụ kwatara.
Nke a na-abịa dịka e sunyere ụlọomeiwu steeti ahụ ọkụ ọbụladi ka kepukepu na-efegharị na onyeisi Ụlọoemiwu ahụ bụ Martin Amaewhule, na ndị ogbo ya chọrọ ịmalite atụmatụ ịchụtu Fubara n'ọkwa Gọvanọ.
N'okwu ya, Fubara onye katọrọ ọkụ e sunyere ụfọdụ ọnụ ụlọ nke Ụlọomeiwu steeti ahụ, sịrị, "Enwetara m ozi adịghị mma ụnyahụ, m si ka bịa nwere anya m hụ."
"Onye ọbụla ma m, ma dịka onye udo, o nweghị ka m ga-esi maka ihe abụla ihe , ọbụladi dịka m ma na-akpa nkata ichutu , ọ dị m obi mwute na ụdị ewumewu a nke eji ego ndị na-atụ ụtụisi were wuo, iji meta otu onye mma."
"Adi m njikere ịnwụ iji chekwa ọchịchị Onyekwuouche ya."
“Ha pụta gwa ndị Rivas ihe m mejọrọ aga e ji achutu m n'ọkwa."

Fubara gara n'ihu taa ndị ọrụ nchekwa na steeeti ahụ ụta maka ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrị dika o boro ebubo na ndị ọrụ nchekwa gbara ya egbe.
Kepukepu na-efegharị na-arụ aka na ọ bụ nghọtahie dapụtara n'etiti Gov Fubara na nna ya ukwu nakwa aka chịburu steeti ahụ bụ Nyesom Wike butere nsogbu na-ada na steeti ahụ.

Ụbọchịụka ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsaa ndị ntorobia bịara ime ngagharịiwe megide ọgbakọ ịchụtụ Gọvanọ nke ndị omeiwu steeti ahụ malitere megide Fubara.
N'abalị ụbọchịụka(29/10/2023), ndị agboro amaghị ndị ha bụ wakporo ogige Ụlọomeiwu Steeti ahụ ọkụ mana ụlọọrụ mmenyụ ọkụ na ndị ọrụ nchekwa nyere aka menyụọ ọkụ ahụ.
Ndị omeiwu kwụsịkwara Onye ndu ọgbakọ ha bụ Edison Ehie na mmadụ atọ ndị omeiwu ọzọ ọrụ n'ike.
Ha na-ebo Ehie ebubo n'aka ya dị na ndị bịara n'abalị ụbọchịụka sunye ọbnọdụ ọgbakọ ha ọkụ n'abalị Ụbọchịụka.













