Ihe dị n'ime akwụkwọ ikpe Bruce Fein gbara Nyesom Wike

Bruce Fein bụ ọkaikpe Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor

Nkọwa foto, Bruce Fein bụ ọkaikpe Nnamdi Kanu

Mbido akwụkwọ ikpe nke Bruce Fein bụ ọkaikpe Nnamdi Kanu gbara Gọvanọ Nyesom Wike gosiri na o boro ya ebubo ikpochapu ndị 'Biafra' n'obodo Obigbo dị na Rivas steeti.

Ha gụnyere ịkpa nkata, igbu igwe mmadụ, imegide ikike ruru onye site n'atụmatụ:

- igbu n'ụzọ pụrụiche

- ịkwụ agụrụ

- igbochi ha ịnweta ọgwụgwọ ahụike

- ịnwụchi ha n'ụzọ megidere iwu

- ịmegbu ha

- idina ha n'ike

- izu ha ohi

- nakwa imekpa ha ahụ site n'ịkpa oke okpukperechi, ịkpa oke agbụrụ nakwa ịkpa oke nkwado ndọrọndọrọ ọchịchị.

Akwụkwọ ahụ kwuru na Wike ji ọnọdụ ya na ọkwa ya dịka Gọvanọ were nye ikike ka ndị mere nke a mee ya.

O kwukwara na ọ haziri ogbugbu ihe karịrị ndị Biafra 3800 n'obodo Obigbo dị na steeti ya.

Otu akwụkwọ n'ime nke Bruce Fein gbara Govanọ Nyesom Wike

Ebe foto si, Screenshot/Court document

Nkọwa foto, Ebubo ndị Bruce Fein boro Govanọ Nyesom Wike maka Obigbo/Oyigbo
Bruce Fein na aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/BBC

Nkọwa foto, Bruce Fein na-ebo Gọvanọ Nyesom Wike ọtụtụ ebubo maka imegide ikike ruru mmadụ

Ọkaikpe na-anọchi anya Nnamdi Kanu bụ Bruce Fein agbaala Gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike akwụkwọ ịkpụpụ ya ụlọikpe mpụ mba ụwa bụ International Criminal Court.

N'akwụkwọ ahụ ọ degaara onyeisi nyocha ụlọ pụrụiche ahụ o boro Wike ọtụtụ ebubo metụtara ịkpa nkata nakwa isonye megide ikike ruru mmadụ.

Akwụkwọ ahụ kwukwara na ọ bụ n'ebe akpọrọ Obigbo dị na Rivas steeti ka nke a mere ma metụtakwa ihe ruru mmadụ puku atọ na narị asatọ.

Ndị a gụnyere ịtọrọ ndị mmadụ, ịwụchi ndị mmadụ n'ike, ịdina ụmụnwaanyị ndị anwụchiri n'ike, igbu ndị mmadụ nakwa ndị ọzọ.

Ọ na-agwa ndị ụlọikpe ahụ ha nyochaa ebubo ndị ahụ ma mara ihe ha ga-eme maka ya.

Fein kwukwara na rue ugbua o nwebeghi nnyocha nke gọọmentị etiti Naịjirịa malitere maka ihe ahụ mere.

Wike ekwubuola n'ọnwa Nọvemba afọ 2020 na o nweghi mgbe o ji zịpụ ndị agha ịgbu, itọrọ maọbụ ịwakpo onye ọbụla n'Obigbo dị na steeti ya.