Senate impeachment threat: Lee etu e nwere ike isi chụtụọ onyeisiala maọbụ Gọvanọ

Ụlọomeiwu na Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, BBC/Muhammadu Buhari

Ụlọọrụ onyeisiala agbarụọla ihu na nkata ụfọdụ ndị Omeiwu Ukwu na-akpa ịchụtu onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọkwa n'ihi ndakpọ nchekwa.

Maka ndị okwu iwu Naijiria were anya na-ekwu na ịchụpụ onyeisiala n'ọkwa adịghị mfe n'ihi na Onyeisiala anọghị n'ọkwa n'aka nke onwe ya, ọ bu ọha ndị mmadụ tụnyere ya vootu.

Ụlọomeiwu Ukwu

Dịka Ọkaiwu Emma Duruigbo si kọwaa, Iwu Naijiria nke afọ 199,Akụkụ nke 143(1999 Constitution, Section 143), kwuru etu a ga-esi ewepụ onyeisiala.

Lee usoro ahụ dịka Durigbo si rụtụ aka

1. Mkpesa nke ndị omeiwu ga-edee ma binye aka

A ga-enwe ebubo mkpesa ihe mere na onye megide iwu Naijiria maọbụ ihe onye ahụ ekwesịghị mme n'akwụkwọ nke ndị omeiwu ga-ebinye aka.

Duruigbo sị, "Akwụkwọ mkpesa ahụ otu n'ime atọ n'ime ndị omeiwu Ukwu na ndị Ụlọnnochiteanya ga-ebinye ya aka."

2. Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu ga-ewegara akwụkwọ mkpesa

Onyeisi Ụlọomeiwu ga-ewegara Onyeisiala akwụkwọ mkpesa n'abalị asaa.

3. Onyeisiala nwere ohere ịsa mkpesa a

Onyeisiala nwere ohere ịsa mkpesa ahụ.

Ọ ga-asa ya ma nyekwa ndị omeiwu niile ọsịsa ya.

4. Onyeisi ụlọomeiwu ga-enyocha ebubo e boro onyeisiala

N'ime' abalị 14, Onyeisi Ụlọomeiwu ga-akpọ oku n'ụlọomeiwu ka ha kpaa ma a ga- enyocha mkpesa maọbụ na-agaghị eme ya.

Duruigbo kọwara na onyeisiụlọomeiwu ga-ajụ ndị ogbo ya n'ọgbakọ ha sị, "Ụnụ achọrọ ka e me nchọpụta ka ọ bụ na ha achọghị?"

" Ọ bụrụ na ndị chọrọ ka enyocha ebubo e boro Onyeisiala ruru oke abụọ n'ụzọ atọ ndị omeiwu, ha aga fee n'agba na-eso ya."

Mana ọ bụrụ na ha erụghị, ị mara na mbọ ichutu onyeisiala ga-anyụ ọkụ ebe ahụ."

Ahmad Lawan

Ebe foto si, NGRSenate/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"Mmadụ asaa ndị a ga-abụ ndị arụbeghị ọkwa gọvernment maọbụ nọrọ n'otu ndọrọndọọ ọchịchị ọbvụla ma bụụ ndị na-akwụwa aka ọtọ."

4. Onyeisi ụlọomeiwu ga-enyocha ebubo e boro onyeisiala

N'ime' abalị 14, Onyeisi Ụlọomeiwu ga-akpọ oku n'ụlọomeiwu ka ha kpaa ma a ga- enyocha mkpesa maọbụ na-agaghị eme ya.

Duruigbo kọwara na onyeisiụlọomeiwu ga-ajụ ndị ogbo ya n'ọgbakọ ha sị, "Ụnụ achọrọ ka e me nchọpụta ka ọ bụ na ha achọghị?"

" Ọ bụrụ na ndị chọrọ ka enyocha ebubo e boro Onyeisiala ruru oke abụọ n'ụzọ atọ ndị omeiwu, ha aga fee n'agba na-eso ya."

Mana ọ bụrụ na ha erụghị, ị mara na mbọ ichutu onyeisiala ga-anyụ ọkụ ebe ahụ."

5. Ihiwe komiti ga-enyocha ebubo e boro onyeisiala

Duruigbo kọwara na ọ bụrụ na e nwee oke abụọ n'ime atọ ndị chọrọ ka enyocha Onyyeisiala, onyeisi ụlọomeiwu Ukwu ga-akwa OnyeỌkaiwu Ukwu Naijiria ka o hiwe komiti mmadụ asaa.

" Mmadụ asaa ndị a ga-abụ ndị arụbeghị ọkwa gọvernment maọbụ nọrọ n'otu ndọrọndọọ ọchịchị ọbvụla ma bụụ ndị na-akwụwa aka ọtọ."

6. Komiti ga-enyocha ebubo e boro Onyeisiala

Komiti a nwere ọnwa atọ iji wepụta ihe ha chọpụtara na ncnnyocha ha mere ma zigara ndị ụlọomeiwu nile ihe ha chọpụtara.

DuruIgbo kwuru na " dịka komiti ahụ na-eme nyocha, onyeisiala nwere ohere ịga- zara ọnụ ya n'ebubo a na-ebo ya maọbụ họpụta ọkaiwu ga-anọchite ya."

7. Ihe a ga-eji mpụtara komiti mee

Ọ bụrụ na kọmiti mecha nnyochja, kwuo na ihe a na-ebo Onyeisiala na aka ya adịghị ọcha, Ụlọomeiwu nke Ukwu na nkke nta ga-atulee mp.ụtara komiti ahụ , Ọ bụrụ na ha nwee mkpebi nke abụọ n'ime atọ nabata ya, ị mar a na okwu ebiela, Onyeisiala iritu.

Duruigbo kwusiri ike sị, "O nweghị onye ọbụla pụrụ ịgbagha onyeisiala a chuturu n'ụzọ a.

"Naanị ihe e nwere ike ịgbagha bụ na esoghị usoro dịka iwu si kwuo."

Kedụ ihe bụ "gross misconduct?'

Duruigbo kọwara 'misconduct dịka "O nwere ihe ndị e dere sị na onyeisiala agaghị eme iji maatụ ime ihe iwu Naijiria megidere.