CAN ahọpụtala Daniel Okoh dịka onyeisioche ọhụrụ

Ebe foto si, Nation Builders Commonwealth
Otu Christian Association of Nigeria ahọpụtala Daniel Okoh dịka onyeisi ọhụrụ otu ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Bayo Oladeji gwara BBC Igbo n'ekwentị na nzụkọ akpọrọ 'The Assembly' kwekọrịtara na nhọpụta Okoh dịka onyeisi ọhụrụ ha.
Nke a pụtara na onyeisi ochie ahụ Rev Olasupo Ayokunle ga-enyefe ya ọchịchị n'aka n'emume a ga-eme n'ụbọchị Fraịde.
Onye bụ Daniel Chukwudumebi Okoh?
Daniel Chukwudumebi Okoh bụ ụkọchukwu kachasị n'ụlọụka Christ Holy Church a ma dịka "Nation Builders" maọbụ Odozi obodo.
A mụrụ ya na Kano na Nọvemba 12, afọ 1963.
Ọ bụ onye Ndoni dị n'okpuruọchịchị Ogba/Egbema/Ndoni dị na Rivers steeti.
Ọ lụrụ Ngozi dịka nwunye ya ma jirikwa ụmụ anọ.
Okoh arụọla ọrụ ihe karịrị afọ iri abụọ dịka onye na-ekwuchitere ndị ụka Kraịst n'ọgbakọ okpukpere ndị ọzọ.
Ọrụ ahụ ọ na-arụ gụnyere ma na Naịjirịa ma na mba dị icheiche n'ụwa niile.
Ụfọdụ ọkwa ọ nọrọla na ya gụnyere:
- Onyeisioche ọgbakọ ụlọụka okpukpere Kraịst dị na Afrịka bụ OAIC n'ịchafụ
- Onyeisi otu OAIC na Naịjirịa (2005 - 2014)
- Osote onyeisi CAN na Naịjirịa (2007 - 2013)
- Okoh so na mmadụ isii gọọmentị etiti họpụtara n'ọgbakọ idozi ndọrọndọrọ n'afọ 2005.
- Okoh so na ndị isi na-elekọta National Orientation Agency site n'afọ 2009 rue afọ 2011.

Ebe foto si, Facebook/Owerrianglican
Cheta na akụkọ fegharịburu n'ụbọchị Wenzde na otu jikọrọ ndị okpukpere Kraịst na Naịjirịa bụ CAN n'ịchafụ ahọpụtala onyeisioche ọhụrụ.
Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Bayo Oladeji, ọ gwara anyị na o nweghi eziokwu dị na akụkọ ahụ.
"Ọ bụ akụkọ ụgha, ihe mere bụ na ndị mmadụ wepụtara aha Daniel Okoh dịka onye nwereike ịbụ onyeisioche mana anyị emebeghi mkpebi maka ya" ka o kwuru.
O gara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde kpọm kwem ka a ga-akpọpụta onyeisioche ọhụrụ otu ahụ.
Onye bụbu onyeisi otu ahụ bụ Reverend Olasupo Ayokunle banyere n'ọkwa ahụ n'afọ 2016.
Gịnị bụ otu CAN?

Ebe foto si, CAN/Facebook
CAN bụ otu jikọrọ ụlọụka niile na-ekpere Kraịst n'ala Naịjirịa.
E hibere ya bụ ụlọọrụ n'afọ 1976 mgbe ọ bụ naanị ụka Katọlik, ụka Anglịkan nakwa ụka ukwu ndị ọzọ dịka Baptist na Methodist.
Ndị ụka Kraịsti hibere otu a iji kwụsịtụ njikọ ndọrọndọrọ na okpukpere alakuba na-aga n'ihu oge ahụ.
Ha pụtakwara katọọ ma megide nsonye ala Naịjirịa n'ọgbakọ mba ndị okpupere alakuba bụ OIC n'afọ
He mechaziri gaa n'ihu nabata obere ụlọụka ndị ọzọ n'ime ogige ha.
Ha nwere ngalaba nke ụmụ nwaanyị akpọrọ WOWICAN nke Oyin Mabel Sowoolu bụ onyeisi ha ugbua.










