Abụbu m ụkọchukwu n'ụka 'deeper life' tupu m banye okpukperechi Islam - Murtala Chukwuemeka
Murtala Mohammed Chukwuemeka Amaeze bụ onye Orlu n'Imo Steeti mana ọ bụ onye okpukperechi Alakụba, ma bụrụkwa onye tụgharịrị akwụkwọ nsọ ndị ha bụ Kọran n'asụsụ Igbo.
Amaeze sị na ya bụbu onye ụkọchukwu ụka 'Deeper Life' kama ọ hapụrụ ya were soro okpukperechi alakụba n'afọ 1989.
O so na ndị nchịkọta ụka 'Deeper Life' na mpaghara Ajegunle site n'afọ 1986 ruo 1988.

Amaeze gara n'ihu kọwaa na alakụba batara ala Igbo kamgbe afọ 1745.
Ọ kọwara na e nwere Koran n'asụsụ Awụsa na Yoroba kama enweghị ya n'asụsụ Igbo.
Ọ kwuru na ihe ọ mere kwesịrị inye ndị Igbo ọṅụ.
Amaeze gwara BBC Igbo na o were ya afọ ise ịtụgharị Koran n'asụsụ Igbo.
Onyeis ụlọ ofufe ebe Amaeze na-efe ofufe bụ Akinyemi Ibira kwuru na obi dị ya ụtọ na ọ bụ onye ụka ya tụgharịrị Koran n'asụsụ Igbo.
Amaeze kwuru na anaghị amanye mmadụ ịbụ onye alakụba kama na ọ bụ mkpebi nke onwe.
O kwukwara na ọ bụghị n'ihi ego mere ya ji tụgharịa Koran n'asụsụ Igbo, kama ọ bụ iji wulite okwukwe ndị Igbo ndị ọzọ bụ ndị okpukperechi alakụba.





