Ramadan Kareem: Ihe mere ụfọdụ ndị Igbo ji nabata okpukperechi 'Islam'

Onye Alakụba

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Dịka ụfọdụ ndị okpukperechi nke Alakụba nke bụ 'Islam' na Bekee na-eti mkpu na a na-akpagbu ha n'ọwụwa anyanwụ ọkachasị oge ngagharịiwe Endsars.

Ọtụtụ ndị mmadụ am,aghị etu maọbụ mgbe ha siri bata ala Igbo.

Dịka igbo si atụ n'ilu sị "Onye na-amaghị ebe eliri ozu na esi n'ụkwụ abọ ya", nke a mere ka anyị zọpụ ije ị mata etu okpukpere Alakụba siri bata ala Igbo.

Aha onyonyo, 'Na anyị bụ ndị Igbo emeghị ka anyị ghara ịbụ ndị ụka alakụba'

BBC garụrụ n'ụlọakwụkwọ maka okpukperechi Alakụba nke dị n'Afikpo, Ebonyi steeti ka ha kọwaara anyị etu ya bụ ofufe siri bata ala Igbo.

Ọ bụ Issa Friday Okonkwo bụ onyeisi nchịkọta ụlọakwụkwọ maka okpukpere Alakụba nke dị na Ebonyi steeti na Imam nke Owerri Shell Camp Central Mosque Imo steeti bụ Suleiman Yusuf Njoku tinyere ọnụ n'okwu a.

Kedụ etu Alakụba siri bata ọwụwa Anyanwụ?

Aha onyonyo, Anioha Nwagui:Lee onye Igbo bụ onyeisi ndị alakụba mbụ n'ala Igbo

Okpukperechi Islam nke ndị Igbo na-akpọ Alakuba abụghị taa ka ọ bidoro n'ala Igbo.

Aha Alakuba sitere na "Allah Hu Akbar" nke pụtara Chukwu Ebuka n'asụsụ Igbo dịka Onyeisi ndị Imam nke Owerri Shell Camp Central Mosque Imo steeti bụ Suleiman Yusuf Njoku siri kọwaa.

Njoku kwukwara na ya bụ Okpukpere sitere na onye ndị ofufe ahụ kwenyere na ọ bụ ozi nke ikpeazụ Chineke sitere bụ Abū al-Qāsim Muḥammad ibn ʿAbd Allāh ibn ʿAbd al-Muṭṭalib ibn Hāshim (Britannica).

Kama ọ bụ Muhammad ka ọtụtụ ndị mmadụ ji mara ya.

Ụmụakwụkwọ Alakụba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ Alakụba n'ụlọakwụkwọ ha n'Afikpo

Ngwa ka anyị banye akụkọ a n'uju.

Mazi Yusuf Njoku kọwara sị "ọ bụ n'ihe dịka afọ otu narị na iri ise na atọ ka Alakuba batara ala Igbo".

Ọ kọwara na ọ bụ Nwaafọ Nsukka nke dị n'Enugwu steeti bụ onye nwanne ya nwaanyị kpọrọ gaa ugwu awụsa oge ọ dị na nwata bụ onye jiri Okpukpere Alakuba were bata Ala Igbo.

Issa Friday Okonkwo kọwara sị "ọteela aka ofufe Islam jiri bata ala Igbo, ọtụtụ ndị mmadụ amaghị nke mere na ọtụtụ ha anaghị ekweta".

Onyeisi nchịkọta ụlọakwụkwọ maka okpukpere Alakụba nke dị na Ebonyi steeti
Nkọwa foto, Issa Friday Okonkwo bụ Onyeisi nchịkọta ụlọakwụkwọ maka okpukpere Alakụba nke dị na Ebonyi steeti

Okonkwọ kọwara na ofufe nke Islam bu ofufe nke Kraịst ụzọ bata n'ụfọdụ ebe n'ala Igbo.

O kwuru na ụfọdụ ebe n'Enugwu steeti dịka Enugwu Ezike, Ịbagwa Aka, Alaagu nke dị n'obodo Nsụkka bụ obodo ụfọdụ okpukpere Alakụba bu ụzọ bata tupu nke Kraịst abata.

Okonkwo kọwara na ọ bụ site n'azụm ahịa n'etiti obodo ndị a na ụfọdụ mpaghara nke ugwu kpatara ya.

Mpaghara ugwu dịka Nupe, Kogi na Sokoto bụ ndi ha na obodo ndị a zụkorọ ahịa.

O kọwara sị " Ọ bụ etu ndị a sị ebi ndụ nke ziri ezi mere ka ndị obodo ndị a jụwa maka ndị ha bụ na okpukpere chị ha".

Okonkwo kwuru na ọ bụ nke a mere ka ụfọdụ ndị obodo a gbanwee okpukpere chi ha ma zoro nke Alakụba.

O mere ka anyị ghọta na ọ bụ etu a ka okpukpere Alakụba siri gbasaa ruo ọtụtụ obodo n'ala Igbo ma ruo kwa taa.

Ọ kọwara na ebe dịka Enọọhia na ụfọdu ebe ka nsụka ka ị ga-ahụkarị ọtụtụ ndị ofufe Alakụba.

Ọ bụ Sheik Ibrahim Nwagui bụ onye mbụ webatara Alakụba n'Afikpo.

Ụlọakwụkwọ maka ọmụmụ Islam na asụsụ Arabic
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ maka ọmụmụ Islam na asụsụ Arabic

Kedụ onye na ebe o bu ụzọ bata n'Ọwụwa Anyanwụ?

Issa Friday Okonkwo kọwara na ọ bụ n'oge afọ ndị 1800 ka Islam batara ọwụwa anyanwụ.

Okonkwo kwuru na n'ebe dịka obodo Abiriba na Afikpo bụ n'afọ ndị 1930 na 1940 ka ọ batara obodo ndị a.

Aha onyonyo, Igbo culture: Egwuregwu ụmụaka Igbo jiri nwee aṅụrị oge gboo.

Kama o kwuru na ọmaghị onye bu ụzo webata ya n'obodo Nsụka kama o kọwara na ọ bụ Sheik Ibrahim Nwagui bụ onye webatara ya n'Afikpo.

Ọ kwukwara na ọ bụ na Nsụkka ka okpukpere alakụba bu ụzọ bata ọwụwa anyanwụ.

Akụkọ kacha sie ike bụ na ọ bụ n'Obodo Alaagu ka e nwere ndị mbụ bụ ndị Igbo bụ kwa ndị Alakụba.

Okonkwo kwuru sị, "Akụkọ kwukwara na ụfọdụ ndị a bụ ndị Alakụba gwara ndị enyi ha nọ obodo ndị ọzọ maka okpukpere Alakụba, mgbe ndị enyi ha nyochara agwa ha, ụfọdụ gbanwere ma soro okpukpere alakụba.

Ihe chere ndị Igbo na-ekpe okpukpere Islam aka mgba

Mazi Okonkwo zara sị, "Eeee, mgbagbu ndị mbụ bụ ndị alakụba dị njọ".

Ọ kọwara na mkpagbu a ka na-aga n'ihu ma ruo taa.

Okonkwo rụtụ aka were sị "n'oge agha Biafra, ndụ Igbo bụ ndị Alakụba lụụrụ Biafra ọgụ n'ihi na ha kwenyere na ha bụ ndị Igbo".

O kwukwara na oge alụchara agha, na egburu ụfọdụ n'ime ha n'ihi na ndị obodo ha kwenyere na ha na ndị agha Naijirịa bụ ụmunne.

Okonkwo kwuru si, " Ndị kacha bụrụ ndị udo n'ala Igbo bụ ndị okpukpere nke Islam".