'Na anyị bụ ndị Igbo emeghị ka anyị ghara ịbụ ndị ụka alakụba'

Aha onyonyo, 'Na anyị bụ ndị Igbo emeghị ka anyị ghara ịbụ ndị ụka alakụba'

Isa Friday Okonkwo bụ onye Igbo na-ekpe alakụba, arịọla ụmụ Igbo ka ha nabata ndị Igbo na-ekpe ụka alakụba dịka nwanne ha, n'ihi na ha bụ ndị na-achọ udo na ọganịhụ mmadụ.

O kwukwara na ihe mere o ji kpewe ụka alakụba bụ na ihe a na-eme n'ụka ahụ doro ya anya ọfụma.