Onyeisiala bụ Buhari kwuru na mwakpo ụmụakwụkwọ Dapchi bụ 'ọdachi mere ala anyị nile'
Ụbọchị ịrị abụọ na ise nke Febrụwarị
Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ha zipuru ụgbọelu na ndị agha ha ị ga chọọ ma gbapụta ụmụaka ahụ.
Ụbọchị iri abụọ na isii nke Febrụwarị
Ndị agha Naijiria gọọnarịrị ebubo Gọvanọ Yobe steeti bụ Ibrahim Gaidam boro na ha kpọpụrụ ndị agha n'obodo Dapchi tupu a tọrọ ụmụaka ahụ.Ndị agha kwetara na kpọpụrụ ndị otu ha maka na 'echekwara obodo ahụ'
Akụkọ kwuru na onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye bụ Aisha Wakil, nke a ma dịka ‘Mama Boko Haram' kwuru na otu Boko Haram nke Barnawi gwara ya na ha ji ụmụaka ahụ.
Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari mere njem ya nke mbụ na Dapchi, bụ ebe o kwere ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ nkwa na gọọmenti ga-azọpụta ụmụaka ahụ a tọrọ.