Ụmụ Naịjirịa ekwuola uche ha gbasara mmaja nchụda onyeisiala Naịjirịa
Ụmụ Naịjirịa kwuru uche ha gbasara mmaja nchụda onyeisiala Naịjirịa nke ụlọọmeiwu ukwu wepụtara ụnyahụ bụ Jụlaị 27, 2022.
Ndị otu pati na-anọghị n’ọchịchị n’ụlọ omeiwu Sineti nke Naịjirịa nyere onyeisiala Muhammadu buhari izuụka isii iji mee ihe a hụrụ anya gbasara ọnọdụ nchekwa ọjọọ na Naịjirịa.
N'ọgbakọ ahụ, Philip Aduda bụ onyeisi ndị pati ọnụọgụgụ ha dị nta n'ụlọ omeiwu, weliri aka ma kwuo na ha kwesịrị itinye ọnụ n'okwu ọnọdụ nchekwa ọjọọ na Naịjirịa, nakwa ihe onyeisiala na-eme maka ya.
Mana onyeisi ndị Sinet bụ Ahmad lawan gwara Aduda na okwu ya achịtaghị aja ọbụla.
Nke a mere ka Aduda na ndị otu ya niile bilie ma si n'ọgbakọ ahụ pụọ n'iwe.
Ha mechara kpọkọọ ndị ntaakụkọ ma kwuo na ha enyela Onyeisiala Buhari izuụka isii iji wulie ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa, ma ọ bụghị ya, ha ga-amalite atụmatụ iji chụtuo ya, nke bekee na-akpọ 'impeachment'.
Senate impeachment threat: 'Ihe mere anyị ji chọọ ịchụtu Buhari n'ọkwa - Sinetọ Chukwuka Utazi

Ebe foto si, Utazi /Buhari/Facebook
Onye omeiwu na-anọchite anya Enugu North senatorial District n'Ụlọomeiwu Ukwu bụ Chukwuka Utazi ekwuola na ihe mere ha ji chọọ ịchụda Onyeisiala Muhammadu Buhari ugbua bụ na ha enyela ya ohere ka ọ gbanwee ihe metụtara ọnọdụ nchekwa mana o meghị ya.
Na nsonso a ndị ụlọomeiwu pati anọghị nọ n'Ọchịchị ji iwe pụọ n'ọgbakọ ha dịka onyeisiụlọmeiwu jụrụ inye ohere ka ha tulee okwu ịchụtu Buhari n'ihi ọnọdụ nchekwa dakpọrọ na Naijiria.

Ebe foto si, Chukwuka Utazi/Facebook
Chukwuka Utazi, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere taa bụ Tọzde sị na "Anyị enyela Buhari ohere ka ọ gbanwee mana ọ gbanweghị."
Utazị sị na ọ teela ya na ndị otu gbawara izu, n'atụta alo ihe a ga-eme ka ihe dị mma na Naịjirịa.
O kwuru na mkparịta ụka ya na BBC taa bụ Tọzde na ọ chịchị APC nọ ugbua ejighị alọ ndị ahụ kpọrọ ihe ruo ugbua ya bụ mmiri gafewere obiọkpa.
O sị na "kemgbe anyị malitere ọchịchị nke ugboro itoolu a ka anyị banyere ọgbakọ ịmata ịhe a ga-eme ka ọrụ nchekwa dị mma na Naịjirịa. Anyị mekwara nzukọ maka ka ọkụ na ihe ndị ọzọ ga esi dị gbanyụụ na Naịjiria". Iwe ha bụ na ọnweghị okwu ndị a niile gọọmentị Buharị jiri kpọrọ ihe.
Na ọ bụ maka ya ka ha jiri tiwezie ka ụwa nụ olu ha.
Utazi jiri onu ike kwu sị, "ọ bụrụ na ya bụ orụ ekweghịzị ha arụ ha pụta ka ndị ọzọ rụọ".

Ebe foto si, Facebook
Ọ sị na ha nọ n'ime onwe ha na-agba izu ndị a mana na ọnweghị ihe gọọmentị na-achị ugbua jiri kpọrọ ihe.
"Anyị kwuche ha sị nwetụ ndidi. Mana ndịdị akarịala ugbua.
Mgbe a jụrụ sị na, ọ bụ na ọ dịghị mma ịhapụ ha ka ọchịchị ha gwụ.
Utazi zara na gọọmentị anaghị agwụ agwụ, na taa ka bụ gboo.
Adesina sị na ndị chọrọ iwepụ onyeisiala bụ ndị kacha dị nta n'ụlọomeiwu. Na ndị ahụ "nwere kwue okwu, mana ha enweghị ọnụ ọgụgụ ha ga-eji wepụ onyeisiala".
Mana Utazi sịrị na"Adesina bụ onye ọrụ oyibo a na-akwụ ụgwọ ọnwa na-amaghị ihe a na-eme n'ụlọomeiwu".
Adesina sị na ọ bụ maka na ya bụ ọdụ abatawala n'agada ndị omeiwu mere ha ji akpọkasị.
Utazi sị na enweghị ịkpa oke na ya bụ okwu iwepu onyeisiala, ndị pati niile so na ya.
Na ọ bụ naanị ihe erughị mmadụ ise bụ ndị ekwenyeghị.

Ebe foto si, Ulọomeiwu nta Naịjirịa
Mgbe a juru Utazị sị, ọbụ na uzi isii ha nwere Buharị ịgbaarụkwaghị ọ bụ n'ọkarịghị. Ọ sị na ọ bụrụgodị otu abalị fọrọ na Naịjirịa ga-amụta ihe.
Na taa ka bụ gboo.
Mgbe BBC Juru ya sị, ọ bụ maka ya bụ ikwe n'aka afeela nkoaka, bakwutewezie ha na obi ha mere ha jiri kulie n'ụra.
Utazi zara sị na "ọsịsọ na-agba ewo mana ajị ekweghị".
O kwuru na-enyela ya ohere niile a ga-enye ya.
Ọ sịkwa na o doro ha anya na onyeisi ha bụ Ahmed Lawan anaghị akwado ha mana na ọtụtụ mmadụ kwenyere na ya bụ ihe.











