Kedụ ihe na-eme n'Isreal na Gaza, gịnị mere o ji bụrụ ugbua?

Ndịagha Hamas nke Izzedine al-Qassam ka ha na-emebisi ngwagha ndị Isreal dị na Gaza n'ụbọchị 7 Ọktoba, 2023

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndịagha Hamas nke Izzedine al-Qassam ka ha na-emebisi ngwagha ndị Isreal dị na Gaza n'ụbọchị 7 Ọktoba, 2023

Ndịagha nnupuisi mba Palestine bụ Hamas wakporo mba Isreal na mberede n'ụbọchị 7 Ọktoba, gbuo mmadụ karịrị 1,400 ma jichie ihe karịrị 220.

Minista ahụike na Gaza kwuru na e gbuola ihe karịrị mmadụ 4,600 n'obodo ahụ kamgbe mba Isreal malitere ịtụ ogbunigwe n'imegwara ihe ndị Gaza mere.

Kedụ ihe na-eme na Gaza Strip kamgbe?

"A ka na-achọsi ndị enyemaka ike na Gaza" dịka United Nations si dọọ aka na ntị.

Opekatampe ụgbọala ukwu 34 bucha nri, mmiri na ọgwụ ahụike ka e nyere ohere ịbanye na Gaza site n'okeala Rafa nke Egypt na ngwụcha izuụka.

Mana nke a bụ otu mpekele n'ụdịrị enyemaka ndị mmadụ bi na Gaza chọrọ, ha na-enwetebu ụgbọala ukwu 400 ruo 500 kwa ụbọchị.

Ngalaba United Nations na-ahụ maka ndị gbara ọsọndụ na Palestine (Unrwa) kwuru na "inwete mmiri na-ara ezigbo ahụ ugbua, nke bụ na ọrịa mmiri ịkọ n'ahụ nakwa ọrịa ndị ọzọ ga-arị elu."

Ihe ruru mmadụ nde 1.4 ka a chụpụrụla site n'ebe obibi ha na Gaza, dịka UN si kwuo.

Ọtụtụ puku narị ndị mmadụ si na mpaghara Ukwu nke Gaza gawa mpaghara Ndịda, mgbe ndịagha mba Isreal gwara ha pụọ maka ọdịmma nke onwe ha.

Maapụ na-egosi Gaza Strip

Obodo Khan Younis nke mpaghara ndịda, nke ọnụọgụgụ ndị bi na ya dịbu 400,000 mana ugbua ọnụọgụgụ ahụ arịala elu karịa ọkara otu nde mmadụ. Ọtụtụ ezinaụlọ na-ekezi ụlọ, maọbụ n'ihu ụra n'akwa mgbochi dị n'ezi.

Mana mba Isreal agaala n'ihu n'ịtụ ogbunigwe na mpaghara ndịda Gaza bụ ebe ha sị na ndị Hamas jiri mere ọnọdụ.

Ọtụtụ ndị gbara ọsọ site na mpaghara ukwu nke Gaza na-alọghachite ugbua maka ọnọdụ ihe na-eme ndịda dị ọjọọ, dịka UN si kwuo.

Otu World Health Organization adọọla aka na ntị na "ọ gaghị adị mfe" ibupụ ndị ahụ na-adịghị nọ n'ụlọogwụ dị na mpaghara ukwu Gaza.

Israel ọ ga-awakpo Gaza?

Ebumnobi Israel bụ ịla Hamas n'iyi.

Minista nchekwa bụ Yoav Gallant kwuru na Sọnde kwuru na ogogo mwakpo ọzọ na Gaza - ga-abụ ịbanye ya mee mwakpo - "nke nwereike iwe otu ọnwa, abụọ maọbụ atọ, mana n'ikpeazụ agaghịzi enwe Hamas."

Isreal chọkwara ịkpọghachị ndị mmadụ ahụ Hamas kpachiri.

Isreal edosala ọtụtụ ndịagha n'akụkụ ahụ aja dị na Gaza dika bucha ngwagha dị iche iche. Ha dosakwara ndịagha nchereoge dị 300,000 tinyere ndịagha ha dị 160.000.

A na-eche na Hamas nwere ndịagha 25,000 a kpọro Izzedine al-Qassam Brigades.

Ndịagha mba Isreal na-akwado ịwakpo ọtụtụ ebe na Gaza site n'ịkwa ha mgbọ na ogbunigwe.

Otu ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha chọro ime bụ ịwakpo ọtụtụ nnọ ndị Hamas na-atụ bụ ebe isiụlọọrụ ngwagha ha nakwa ndị ndu ha.

Maapụ na-ego nnọ ndị Hamas tụrụ
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Hamas kwuru na nnọ ahụ dị ogogo kilomita 500 (310 maịlụ). O nwere ọtụtụ ọnụ e si abanye na ya nke dịcha n'ụlọ obibi, ụlọ okpukperechi, ụlọakwụkwọ nakwa ebe ndị ọzọ.

Ndịagha Isreal agaghị achọ ịbanye n'ime nnọ ndị ahụ kama ha ga-ei ogbunigwe na-agbarisi ha.

Nsogbu kachasị ha ga-enwe bụ ịlụ ọgụ n'ihu n'ihu dịka ọ bụ mpaghara ọtụtụ igwe mmadụ jupụtara. A na-atụ anya na Hamas ga-esiri ha ọnya n'ụzọ site n'itinyecha ogbunigwe n'ebe dị iche iche ha si abata ma n'okporoụzọ.

Na Mọnde, ndịagha Isreal kwuru na e gburu otu onye agha ha ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe ha mere mwakpo na Gaza ịchọ ozu ndị Isreal nwụrụ anwụ nakwa sụchasị ụzọ iji mee mwakpo ha.

Ndị ndu Amerịka, Briten, Canada, Germany, France na Italy "kwusiri ike na nkwado ha n'ebe Isreal nọ nakwa ikike o nwere ichekwa onwe ya megide iyi ndụ egwu" ma kpọọ oku ka ha "ubeisi n'iwu na-achịkwa mkpuchi ndụ nke gụnyere ichekwa ndụ ndị nkịtị."

Ọgbaghara adapụtakwala na West Bank nakwa mpaghara ukwu Isreal n'okeala ha na mba Lebanon, ebe ndịagha Isreal kwuru ha na-akwa mgbọ megide ndị Hezbollah nọ n'ogbe ahụ na nzaghachị ogbunigwe ha tụrụ ya.

Ndị mmadụ kwụ n'ahịrị na Gaza
Nkọwa foto, Ndị Gaza ka ha kwụ n'ahịrị inwete achịcha na mpaghara ndịda obodo Khan Younis dite n'iwu Isreal nyere ka e si na mpaghara ukwu Gaza pụọ

Gịnị bụ Hama ma kedụ ihe ọ chọrọ?

Hamas bụ otu agha nnupuisi na mba Palestine nke na-achị ogbe Gaza Strip kamgbe 2007. Otu ṅụrụ iyi ịla mba Isreal n'iyi ma chọrọ iji mba Alakụba (Islamic state) dochie ya.

Hamas na Isreal alụọla agha ọtụtụ oge kamgbe ha weere ọchịchị. Ọ tụọla ọtụtụ ogbunigwe maọbụ kwe ka otu ọzọ si n'ogbe ha tụọ ọtụtụ ogbunigwe n'Isreal ogbunigwe, ha emeela ọtụtụ mwakpo dị egwu.

Na nzaghachị, Isreal atụọla awakpoola Hamas site n'ịtụ ha ogbunigwe. N'afọ 2008 na 2014, ha zipụrụ ndịagha ha n'ime Gaza.

Ya na mba Egypt agbachiela Gaza Strip kamgbe 2007 maka ihe ha kpọrọ ọnọdụ nchekwa.

A kpọọla Hamas - maọbụ otu agha ha Izzedine al-Qassam Brigades - dịka otu na-eyi ndụ egwu n'ọnụ mba dịka Isreal, Amerịka, otu European Union nakwa Briten, tinyere mba ndị ọzọ nwere ọnụ n'ụwa.

Mba Iran kwadoro otu a, na-enye ha ego, ngwaagha nakwa ọzụzụ.

Gịnị mere Hamas jiri mee mwakpo ọhụrụ a?

Hamas ịbanye obodo dị n'Isreal n'ụbọchị 7 Ọktọba, gbuo mmadụ karịrị 1,400, bụ mwakpo ịgafe okeala mba Isreal nweterela kamgbe ihe karịrị otu ọgbọ, dịka onye ntaakụkọ BBC Jeremy Bowen kwuru.

Ndịagha nnupuisi a gafere ụdọ igwe kewara Gaza na Isreal n'ọtụtụ ebe.

Akụkọ gbara n'anwụ banyere ogbugbu ndị mmadụ n'otu obodo Kibbutz Kfar Aza nke Isreal.

Ndị zọrọ ndụ kwuru na e gburu ihe ruru mmadụ otu narị, ebe a nwụchiri ọtụtu ndị ọzo anwụchi. Ndịagha Isreal gwara Jeremy Bowen na e bepụla ụfọdụ ndị nwụrụ isi.

A wakporo ụlọ obidi dị na Kfar Aza kibbutz

Ebe foto si, Oren Rosenfeld

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọ obibi dị na kibbutz ka e mebichara

Ọtụ atụnanya na mwakpo a ndị Hamas mere agbataghị ndị Isreal n'uche na-agbanyeghi akụrụngwa agha ha nwere ka onye ntaakụkọ BBC bụ Frank Gardner kwuru.

Ọ bịara n'oge nsogbu dị n'etiti Isreal na Palestine na-arịelu.

Afọ a bụ afọ ndị Palestine bi na West Bank ebe Isreal jichiri kachasị nwụọ bụ nke nwereike ịbụ ihe kpalitere mmụọ ndị Hamas ịwakpo Isreal.

O nwekwara ike ọ bụru na Hamas chọro inwale etu ike ha n'etiti ndị Palestine iji bụrụ ndị a ga-amara nke ọma.

Nwụchi ndị Isreal nwereike ịbụ ụzọ Hamas ga-eji mee ka Isreal tọhapụ ndị otu ha ndị Palestine a sị ruru 4,500 nọ n'ụlọmkpọrọ n'Isreal.

O nwekwara kepukepu kwuru na ọ bụ mba Iran haziri nwakpo ahụ, na-agbanyeghi onye ndu kachasị n'Iran agọnarịla nke ahụ na aka ha adịghị na ya.

Gịnị bụ Gaza Strip ma kedụ ndị bi ebe ahụ?

Gaza Strip bụ mpaghara okeala ogologo ya dị 41km, ịsa mbara ya dịrị 10km nke dị n'etiti Isreal, Egypt nakwa Osimmiri Mediterrania.

Maapụ na-egosi Gaza Strip

Ndị bibu ebe ahụ bụ Egyot, mana Isreal malitere ibi ebe ahụ n'afọ 1967 n'oge agha a kpọrọ 'six Day war'.

Isreal wezugara ndịagha ha na ndị mmadụ ruru 7,000 n'afọ 2005.

Ọ bụ ebe ndị mmadụ dị nde 2.23 bi ma bụrụkwa otu n'ime ebe ndị mmadụ kachasị biri n'ụwa.

Ihe karịrị pasentị 75 nke bụ mmadụ nde 1.7 bi na Gaza bụ ndị gbara ọsọndụ maọbụ ndị agbụrụ ha, dịka UN si kwuo. Ihe karịrị mmadụ 500,000 n'ime ha bi n'ogige ndị gbara ọsondụ asatọ dị n'ogologo ụzọ ahụ.

Isreal na-ahụ maka njem ụgbọelu nakwa ihu eluigwe Gaza nakwa akụkụ mmiri ya ma na-achịkwa njem ndị mmadụ nakwa nri n'ebe ahụ.

Ugbua Isreal emechiela okeala dị n'Erez nakwa Kerem Shalom ma sị na ọ gaghị emepe ya ruo mgbe Hamas tọhapụrụ ndị Isreal ja ji eji.

Gịnị bụ Palestine?

West Bank, Gaza, tinyere East Jerusalem na Israel, ha niile mejupụtara obosara ala a kpọro Palestine site n'oge ndị Rome ruo n'etiti afọ 20th Century.

Nke a gụnyere alaeze ndị Jew dị n'akwụkwọ nsọ, nke ọtụtụ ndị Jew na-ahụta dịka ala nna nna ha ochie.

A kpọpụtara Isreak dịka mba n'afọ 1948, na-agbanyeghi na ụfọdụ ndị na-ekwenyeghi na Isreal ga-adị ire ka na-akpọ ala ahụ Palestine.

Ndị Palestine ji aha Palestine achịkọta mpaghara West Bank, Gaza na East Jerusalem ọnụ.

Onyeisiala mba Palestine bụ Mahmoud Abbas e ji Abu Mazen maara. O bi na West Bank, nke dị n'okpuru Isreal.

Ọ bụ onyendu Palestine kamgbe afọ 2005, ọ na-anọchiteanya otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Fatah bụ ndị na-ama Hamas aka.