Ụmụafọ Tanzania abụọ na otu onye Saụt Afrịka so na ndị Hamas ji eji - mba Isreal

Ụmụ Afrịka atọ so ndị otu Hamas ji eji

Ebe foto si, EPA

Ụmụafọ Tanzania abụọ na otu onye Saụt Afrịka so na mmadụ 224 ndị otu Hamas tọọrọ mgba ha wakporo Isreal n’ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba dịka gọọmentị mba Isreal si kwuo.

A kpọpụtabeghi aha mmadụ atọ ndị a.

Onye na-anọchiteanya Tanzania n’Isreal kwuru n’ezie na ụmụafọ mba ha abụọ so na ndị ahụ a ka ji eji.

BBC na nna otu onye Tanzania a sị na a na-achọ achọ n’Isreal ekwuola okwu – Joshua Mollel, bụ nwata akwụkwọ ngalaba ọrụ ugbo nọ na Kibbutz bụ ebe a wakporo.

Ọ gwara BBC n’ụbọchị Tọzde na ọ mabeghi maọbụ nwete ozi ọbụla banyere ọnọdụ nwa ya.

Na mbido izuụka a, o kwuru na ya na nwa ya ekwubeghi kamgbe ụbọchị 5 Ọktoba - ụbọchị abụọ tupu e mee mwakpo ahụ - na ezinaụlọ ha niile nọ n’ọnọdụ nwute ugbua.

“Anyị anaghị eri ihe maọbụ hie ụra – m gaa n’ahịa ndị mmadụ na-ajụ ihe mere m ji ata ahụ,” ka o kwuru n’ụbọchị Sọnde.

Gọọmentị mba Saụt Afrịka ekwubeghi okwu banyere akụkọ na otu nwafọ ha so na ndị e ji eji.

Ndị mbịarambịa si mba iri abụọ na ise bụ ndị otu Hamas jichiri dịka mba Isreal si kwuo.

Ha dị 135 n’ime mmadụ 224 e ji eji - ọnụọgụgụ ndị kachasị bụ Thailand, ha dị iri ise na anọ (54).

Ha tọọrọ ndị a mgbe ndịagha nnupuisi si Hamas – nke mba Isreal, Briten, Amerịka nakwa ndị ọzọ kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu – gafere ma banye Isreal site na Gaza, gbuo ihe ruru mmadụ 1,400.

Kamgbe ahụ Isreal emegwarala site n’ịtụ ogbunigwe na Gaza, nke ụlọọrụ ahụike ndị Hamas kwuru na ihe ruru mmadụ 6,500 anwụọla.

Mmanụ e ji amụ igwe ọkụ nwereike ịgwụ na Gaza taa - UN

Ogige ndi gbara oso ndu na Gaza

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

UN na adọaka- na-ntị na mmanu oku ha na enye Gaza nwere ịke ị gwụ na abalị a.

Onye ọrụ anyi n’Gaza kwụrụ na ọtụtụ ụlọọgwụ na ahọzị ndị ha na-enyere aka sịte na ị nyere nanị ndị ọnọdụ ha kacha njọọ aka.

Na abalị tụsde, UN kwụrụ na ụlọọgwụ otu ụzọ atọ nakwa abụọ n’ụzọ atọ ụlọọgwụgwọ emechiela ọlụ maka mmebi agha meree na ụkọ mmanu ụgbọala.

Cheta na Isreal kwụsịrị ọkụ eletrik na enye Gaza ọkụ ka Hamas wakpọchara ha n’ụbọchị 7 Ọktọba.

Ihe ọputara bụ na Gaza tụkwasara obi ha n’ iji igwe na-enye ọkụ latrik ahụ ụzọ.

Otu na ahụ maka ndi gbara ọsọ ndụ na Palestine nke ndi UN kepụtara bụ UNRWA, kwụrụ na ụlọ ha ejula.

Ha kwụru na ndị nọ n’ụlọ ha kariri ụlọ ha mgbọrọ anọ.

Otu a kwuru na ihe rụrụ mmadu 600,000 nọ n’ulọ 150,ha kwuru na ụlọakwụkwu na ụlọọgwụ sọ na ebe ndi mmadụ nọ-gasị

Ha dere na twitter na otutu mmadu ka na-ehi n’ọkpọrọ-ụzọ maka na ụlọ ejula.

Ụlọọgwụ Nasser di na Khan Younis bụ ụlọogwụ akacha mara na ndịda Gaza e kwuola na oge na-adighị anya na ha -ga akwụsị ị gwọ ndi mmadu n’ihi ụkọ mmanụ ụgbọala, ha kwurụ na ọbara na ihe ndị ọzọ ejị azo ndu akọọla ha.

Eji m anya m hụ ntị m -Nwaanyị ndị Hamas tọhapụrụ

Yocheved Lifschitz

Ebe foto si, Jenny Yerushalmi, Ichilov Hospital

Otu nwaanyị n'ime ụmụnwaanyị abụọ ndị Hamas tọhapụrụ akọọrọla ndị ntaakụkọ ije ya n'aka ndị agha nnupuisi ahụ.

Yocheved Lifschitz, gbara afọ 85, kọrọ etu ndị Hamas bụ ọgbatumtum si tọrọ ha "ịga ala mmụọ lọghachi".

O kwuru na ya merụchara ahụ, na-ekubi ume, dịka e bu ya si ọnụama Gaza bata.

Lifschitz kwuru na gọọmentị Israeli emefuola ijeri kwuru ijeri na ịrụ aja okeala mana ogbochighị ndị Hamas isi ya bata.

Lifschitz na Nurit Cooper mere ya mmadụ anọ ndị Hamas tọhapụrụla n'ime ihe karịrị mmadụ 200 ha tọọrọ n'Izrel, kpụrụ gaa Gaza.

Yocheved Lifschitz

Ebe foto si, Jenny Yerushalmi, Ichilov Hospital

Nwa ya nwaanyị bụ Lifschitz na-enye aka, kwuru na a manyere Lifschitz o gaa ije kilomita olemole tupu akpụba ya n'ime mpio dị n'okpuru ala.

A tọhapụrụ Lifschitz na Nurit Cooper n'abalị ụnyahụ mana a ka ji di ha abụọ.

Cheta na Hamas tọhapụburu ndị Izrel abụọ bụ ụmụafọ Amerika: Judith na Natalie Raanan, n'ụbọchị Fraide.

Ministrị Ahụike na Gaza nke Hamas na-ahazi kwuru na Israel gbuola mmadụ 5,000 kemgbe Oktoba 7 Oktoba, 2023.

Ndị Hamas gburu ihe karịrị mmadụ1,400 dịka ha wakporo Izrel.

Nwantịtị nri na mmiri dị na Khan Younis na Gaza - onye gbagara Gaza

Ebe ogige mgbaba dị na Gaza

Ebe foto si, reuters

Nkọwa foto, Puku kwuru puku ndịPalestaịn na-agbaba n'ụlọ ogige dị na Khan Younis na mpaghara ọdịda Anyanwụ Gaza ebe ha gbagara inweta nchekwa maka ogbunigwe

Kwa ntabi anya, kwa nkeji, ị ga na-anụ ụda ogbunigwe na gburugburu gị. Nke a bụ dịka Ghada Ouda onye ọrụ ntapịokwu n'asụsụ Palestaịn bụ onye siri n'ụlọ dị n'isi obodo Gaza gbapụ gbaga obodo Khan younis n'ọdịda anyanwụ Gaza.

N'olu o mere zigara BBC, Ouda kọwara ihe na-eme mpaghara ọdịda anyanwụ ahụ. N'okwu ya, "Anyị nwere ntakịrị ntakịrị nri na mmiri. Anyị na-ehikwa n'ala."

Ndị Palestaịn nọ ebe ahụ bụ "nri dị na mkpọ ka ha na-eri ya na obere akwụkwọ nri mana nke ahụ anaghị ezu."

"Ma achịcha adịghị, ọ na-ara ahụ inweta" dịka o siri kwuo. "Anyị na-aga ebe dị anya inweta achịcha, ọ ga-ewe gị ihe dịka awa ise inweta ya ma i nweta ya, ọ gaghị ezu otu ezinaụlọ."

Israel aṅụọla iyi ịtụsị ogbunigwe ike na Gaza dika Hamas sị na e gburu mmadụ 55 n'abalị

Gaza

Ebe foto si, Reuters

Ndịagha Izrel agwala ndị mmadụ ka fọrọ na Gaza ha gawa na Ndịda dịka ha nụrụ iyi ị ga n'ihu n'agha ha na-ebu ndịagha nnụụisi Hamas n'Ugwu Gaza.

Nke a na-abịa dịka otu alaka otu United Nations;WFP na WHO kpọrọ oku ka ọgụ dajụọ na Gaza iji nye ohere ka e kesaa ngwa enyemaka.

Izrel edowechala ụgbọaghanakwandịagha n'agbata ha na Gaza maka ịmalite agha megide Hamas n'elu ala.

N'ụbọchị Satode, ụgbọala ngwongworo 20 bụ ihe enyemaka si Ijipt bata nke mbụ ya n'izuụka abụọ.

Mana ndị otu ọrụ ebere kwuru na ihe ndị a batara si okeala 'Rafah Crossing' dịka otu mkpuru mirir n'ire onye akpịrị na akpọ nkụ, n' ihe a chọrọ.

Tupu ọgụ adaa, ihe dịka ụgbọala ngwongworo 500 na-abata Gaza dịka ọnụ na-ekwuru otu 'ActionAid Palestine' si kwuo..

Ngwa enyemaka batara na Gaza

Ebe foto si, Getty Images

Dịka UN si kwuo, ọtụtụ ndị bi n'ebe ahụ- bụ ndị ruru otu nde na ụma abụọ(1.2 million) bụ na ihe enyemaka ka ha si enweta ihe ha ji adị ndụ tupu ọgbaaghara nke ikpeazụ a adapụta.

Israel malitere ịbọ ọbọ ndị otu Hamas gburu n'abalị asaa nke ọnwa Oktoba site na isi n'elu atụ ogbunigwe na Gaza.

Ihe dịka mmadụ 1,400 bụ ihe nwụọ®ọla na mwakpo ahụ- ọtụtụ bụ ndị nọ n'ụlo ha dị nso Gaza maọbụ ndị gara mmemme egwu na Ndịda Izrel.

E gbuola ihe karịrị ndị Palestine 4,300 na Gaza n'izuụka abụọ gara aga, dịka Ministrị ahụike nke Hamasi na-achịkọta si kwuo.

Egypt emepeela okeala ha na Rafa ka ihe enyemaka nweeike ibanye n Gaza
Truck bu ihe enyemaka si Rafa na-abanye na Gaza

Ebe foto si, EPA

Ụgbọala nke otu United Nations bu ọtụtụ ihe enyemaka si mpaghara okeala Rafa wee banye na Gaza n'ụtụtụ Satọde, maka ikesara ya ọtụtụ ndị mmadụ na-agabiga nnukwu nhịahụ na mpaghara ahụ ebe mba Israel na-atụ ogbunigwe akwụsịghị akwụsị kamgbe izuụka abụọ ugbua.

Nke a na-abịa dịka mba Egypt kwetara imepe mpaghara ahụ nke mbụ kamgbe agha Israel na Hamas malitere n'ụbọchị asaa nke ọnwa ọktoba 2023.

Ihe ruru nnukwu ụgbọala truck 20 abanyela na Gaza ugbua, ha bu ọtụtụ ihe enyemaka nke gụnyere nri, ọgwụ, mmiri ọṅụṅụ na ihe ndị ọzọ.

Onyentaakụkọ BBC bụ Rushdi Abu Alouf kwuru na ọ bụ ndị ọrụ UN ga-ahụ maka ikesa ihe enyemaka ndị ahụ nye ndị ọ dị mkpa.

Ngalaba ahụike na Gaza na-ekwu na opekatampe mmadụ 4,385 anwụọla na mpaghara ahụ kamgbe Ọktoba 7; 1,756 n'ime ha bụ ụmụaka.

N'aka nke ọzọ, Israel na-ekwu na ihe karịrị mmadụ 1,400 nwụrụ na mwakpo nke otu hamas mere na mba ha.

Hamas atọhapụla ndị Amerịka abụọ ha ji eji na Gaza

Judith Ranaan na nwa ya nwaanyị Natalie

Ebe foto si, Ranaan Family

Nkọwa foto, Judith Ranaan na nwa ya nwaanyị Natalie so na ndị otu Hamas tọọrọ oge ha wakporo mba ISrael n'ụbọchị Ọktoba 7

Otu Hamas atọhapụla ụmụ nwaanyị abụọ ndị mba Amerịka bụ ndị ha tọọrọ na mba Israel oge ha wakporo mba ahụ n'ụbọchị 7 nke ọnwa Ọktoba 2023.

Ụmụnwaanyị abụọ a aha ha bụ Judie Raanan na Natalie - nne na nwa - gara njem ileta ndị ezinụlọ na Nahal Oz kibbutz nke mpaghara ndịda Israel, na nso Gaza, oge a tọọrọ ha.

Ndị agha Israel gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ abụọ ahụ enwerela onwe ha n'ezie.

Ozi si n'ụlọọrụ Praịm Mịnịsta mba Israel kwuru na ọchịagha Gal Hirsch ga-ezute ụmụnwaanyị abụọ n'okeala Israel na Gaza ma kpọga ha n'ogige ndị agha dị n'etiti mba ahụ, ebe ndị ezinụlọ ha nọ na-eche ha.

Ka ọ dị ugbua, ha ka ruru mmadụ 200 ka tọrọ n'aka ndị otu Hamas na Gaza.

A na-arụzị ụzọ dubara okeala Rafah iji buba enyemaka na Gaza

Ụgbọala gwongworo ndị kwụ eche n'okeala Rafah

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụgbọala gwongworo bụ enyemaka dị icheiche na-eche ịbanye Gaza n'okporoụzo Rafah

Naanị ụzọ esi abanye Gaza na-akwado imepe ọzọ mana ogbunigwe mebiri ya.

Ndị ọrụ ụzọ mba Ijipta na-egwuala ebe ahụ na-edozi ya dịka a na-atụ anya na ihe ruru ụgbọala gwongworo bụ enyemaka nwereike ịbanye na Gaza taa.

Mba Izrel na-ekwu na ọ bụ naanị nri, mmiri nakwa ọgwụ ahụike ka ha ga-ekwe ka ọ bata na Gaza. Ọ kweghi ka mmanụ ọkụ nakwa atụmatụ ihicha mmiri esoghi n'ihe ndị ga-abata.

Onyeisi ngalaba ọgbakọ mbaụwa bụ Anthony Guterres na-ekwu na enyemaka ndị ga-eru Gaza taa ga-ebelata ahụhụ na ihe mgbu ndị mmadụ na-agabiga n'ebe ahụ.

Mana ngalaba ndị enyemaka na-ekwu na ekwesiri ịnwekwa enyemaka zuruoke kwa ụbọchị iji hụ na ihe dị iche dị.

Gịnị bụ 'Rafah Crossing'?

Ụgbọagha a hụrụ n'okeala Rafah na-aga Gaza n'ụbọchị 19 nke ọnwa Oktoba

Ebe foto si, Getty Images

Oke ala Rafah bụ ebe kacha ndịda si Gaza rue Sinai dị na Ijipt.

E nwere naanị ụzọ mbata abụo ndị ọzọ banyere Gaza - otu bụ Erez bụ ndị mmadụ nọ n'Izrel na ugwu Gaza nakwa Kerem Shalom bụ ụzọ azụmahịa jikọrọ Izrel na ndida Gaza. Agbachiela ha abụọ

Rafah bụzi naanị ụzọ fọrọ ugbua esi ebubata enyemaka ndụ. Ọtụtụ ụgbọala gwongworo bu mmanụ ọkụ na ngwa enyemaka ndụ kwụ n'ebe ndị Ijipt na-eche ka agbapee oke ala ahụ.