Obibi ndụ na Gaza na ihe butere ọgbaghara ugbua
Anya ụwa dị na mpaghara Middle East ugbua bụ ebe ọgụ na-ada n'obodo Gaza n'etiti mba Isreala na ndịagha nnupuisi mba Palestine a kpọrọ Hamas.
Nke a na-abịa dịka minista nchekwa mba Isreal nyere iwu sị ka a gbakasịa mpaghara ahụ ndị Palestine bi n'ihi mwakpo ndịagha nnupuisi a mere na mba Isreal.
Mana kedụ etu Gaza si bụrụ obodo kachasị nwee ọnụọgụgụ ndị mmadụ bi na ya n’ụwa, kedụ etu obibi ndụ si dị n’ebe ahụ. Kedụ ihe na-ebutakaarị ọgbaghara n’etiti Izrelụ na Palestine n’obodo ahụ?
Akụkọ a sara ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n'uju.








