Alaba International Market: Gọọmentị Legọs emepeela ahịa a ha mechiburu n'ihi ebubo iru unyi

Alaba
Nkọwa foto, E mechiburu ahịa Alaba International kemgbe ụbọchị Monde

Gọọmentị Legọs emepeela ahịa Alaba International nakwa ahịa ndị ọzọ dị na mpaghara Trade Fair ne dị n'opuru ọchịchị Ojo na Legọs, bụ nke ha mechiburu n'ihi ebubo na ndị ahịa ahụ anaghị edebe mpaghara ha ọcha.

Tokunbo Wahab bụ kọmishọna gburugburu na Legọs kwuru na ha kpebiri imepe ahịa ahụ n'ihi na ndị isi ha emezuola ihe niila ha nyere ha n'iwu.

Wahab kwuru na mmechi ahịa ahụ abụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla, ọ bụghịkkwa iji mekpaa agbụrụ ọbụla ahụ, kama ọ bụ iji hụ na Legọs steeti na-adị ọcha oge niile.

Ọ bụghị eziokwu na anyị anaghị edobe Ahịa Alaba International ọcha- Amajuoyi, Onyeisiahịa

Ichie Camilus Amajuoyi

Onyeisi otu jikọrọ ndị na-azụ ahịa n'ahịa 'Alaba International Market',Ojo,Legọs ekwuola na ebubo nke Gọọmentị Steeti booro ha ji gbachie ahịa ha bụ ụgha.

Kọmishona na-ahụ maka mịnịstrị Gburugburu na steeti ahụ bụ Tokunbo Wahab kwuburu n' ụbọchị Monde na a gbachiri ahịa ahụ n'ihi ndị ahịa anaghị ekpofu ahịhịa n'ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa ndajọ iwu gburugburu ndị ọzọ.

Mana ọsịsa ya, onyeisi otu ahụ bụ Ichie Camilus Amajioyi gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ụbọchị Wednezde na ebubo ahụ bu okpotokpo asị.

Amajioyi, onye kpọrọ BBC gagharịa n'ahịa ahụ kwuru na ha nwere usoro mkpofu ahịa zuru oke ma na-akwụkwa ụgwọ nile metụtara mkpofu ahịhịa dịka ọ dị n'iwu.

Ichie Camilus Amajioyi

Ọ gara n'ihu kọwaa ihe mere sị, "Ụbọchị Monde, ebe Elekere Mbụ nke ụtụtụ,ka ndị na-echere anyị nche n'ime Alaba kpọrọ m n'ekwentị si na o nwere ndị kwụ n'ọnụama ahịa, na ha sị na ha si Alaụsa(state secretariat) bịa."

"Mgbe m bịaruru Alaba, m hụ na ọ bụ eziokwu na ha ji igodo gbachisịa ebe anyị si abanye n'ime ahịa. M hụ akwụkwọ ha mapanyere, hụ akara ha dere na ya, m were ekwentị m kpọwa ha. "

Mmiri a gbapuru n'Ahịa 'Alaba International'

"Nwoke m kpọrọ n'ekwentị zara m, m si ya na m bụ onye dị otu a ,na m bụ Ichie Camilus Amajioyi, na anyị pụtara n'ụtụtụ a, ọ bụru na e ji igodo gbachie ahịa anyị, gịnị ka anyị mere?

"Ọ sị m na ha ji 'drone', onyonyo na-efe n'elu fegharịchaa n'Alaba, hụ na o nwere ebe ahịhịa dị."

"Mgbe o wetara ya, anyị lere ya, ihe onyonyo ahụ abụghị Alaba."

"Nke bụ eziokwu bụ na ị na-akpagharị n'ime ahịa, ị ga-ahụ ebe a na-anyụ mamịrị. Anyị nwere ụlọ mposi ọha."

"Anyị nwere ụlọọgwụ nke anyị n'ime ahịa ebe a. Ya bụ anyị na-akpachapụrụ ndụ anyị anya. Anyị na-akpachapụrụ gburugburu anyị anya."

"Anyị ma na ahụike bụ akụ. Anyị nwere mmiri anyị gbapuru n'akụkụ ahịa nile. O nweghịkwa nke gọọmentị meere anyị o! Anyị nwere ụgbọala e ji agbanyụ ọkụ." "

Ụgbọ mmenyụ ọkụ Alaba International

"Ihe ọzọ bụ na anyị adịghị eru inyi. Anyị enweghị ọwammiri ebe a na-awụnyesị ahịhịa."

" Ahịa Alaba na-edobe gburugburu ọcha nke na ndị ọ dị na-aka ha ịhazi mkpofu ahịhịa(Lawma) nyere anyị asambodo nturuugo dịka "Ahịa Kachasị Adị ọcha n' Ọdịda Anyanwụ."

"Kedụ ka ndị nyere anyị nturuugo na anyị kachasị edobe gburugburu ọcha sị tụgharịa kpochie ahịa anyị sị na anyị anaghị edobe ya ọcha?"

Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Legos Steeti bụ Gboyega Akosile azaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwentị banyere ebubo ndịisi ahịa 'Alaba International Market',Ojo,Legọs ' bogara gọọmentị steeti ahụ.

Ihe anyị jiri gbachie Ahịa 'Alaba -LASG
Ọnụ ama Ahịa Alaba

Ebe foto si, Tunji Wahab

Gọọmentị Legọs steeti kwuburu n'ihe ha ji gbachie ahịa 'Alaba International n'Ojo dị na Legọs bụ n'ihi a naghị edebe gburugburu ahịa ahụ ọcha.

Ndị ọrụ Ministrị na-ahụ maka gburugburu na ndị ọrụ nchekwa gara gbachie 'Alaba International' n'Ojo, Legọs n'ụbọchị Monde.

Ndị ọrụ nchekwa so gaa dịka ndị ọrụ gọọmentị kpochiri ahịa Alaba international Legọs

Ebe foto si, Tunji Wahab

Kọmishona na-ahụ maka mịnịstrị ahụ bụ Tokunbo Wahab kwuru n'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya ụbọchị Monde sị na nke a bụ n'ihi na ndị ahịa anaghị ekpofu ahịhịa n'ụzọ kwesịrị ekwesị.

Ọ sịrị, "A kpọchiela ahịa "Alaba International Market" Ojo maka anaghị ekpofu ahịhịa n'ụzọ kwesịrị, anaghị akwụ ụgwọ mkpofu ahịhịa nakwa ịda iwu metụtara gburugburu n'ụzọ dị oke njọ."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Gọọmentị Legọs emechiri ụfọdụ ahịa ma kutuo ewumewu ụfọdụ ha sị dara iwu na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ nsonso a.

Ha mechiri ahịa Ladipo, Mile 12 nakwa Owode Onirin maka ebubo metụtara idebe gburugburu ọcha mana ha mechara gbapekwa ha.