Ihe Soludo, Peter Obi na onye nchịkọ ụlọakwụkwọ ebe egbeigwe gbagburu ụmụakwụkwọ kwuru maka ọdachi ahụ

Charles Soludo, Tansi College na Peter Obi

Ebe foto si, Soludo/BBC

Aka na-achị Anambra steeti bụ Ọkammuta Charles Soludo , na onye zọrọ ọkwa Onyeisial n'aha otu Labour Party bụ Peter Obi etiela ezinaụlọ ụmụ ha nwụrụ n'ọdachi dakwasara ụlọakwụkwọ Tansi International College , Ọka , isi obodo Anambara steeti na nsononso a.

N'abalị anọ nke ọnwa Novemba afọ 2023, egbe igwe gbagburu ụmụakwụkwọ atọ nke ụlọakwụkwọ' Tansi International College' ; Obi Francis Chukwunwuike gbara afọ 16, onye Nteje, Anambara Steeti, Obeta Michael Uchechukwu gbara afọ 16, onye Nsuka, Enugwu Steeti na Usulor Chidubem Emmanuel gbara afọ 19, onye Ezza dị n' Ebonyi Steeti dịka ya na ndị ogbo ha na-agba bọọlụ n'ogige ụlịọakwụkwọ ha.

N'ozi ya, Soludo onye nna ya gbara afọ 92 nwụrụ na nsonso a tiri ụlọakwụkwọ Tansi International College' ụmụakwụkwọ na-eru ụjụ nakwa ezinaụlọ ụmụ ha atọ nwụnarịị site n'amụma gbara n'ogige ụlọakwụkwọ' ahụ aka n'obi.

Onye nchịkọta ụlọakwụkwọ ahụ bụ Rev. Fr. Fidelis Izuakor gwara BBC n'ozi o nyere onye ntakụkọ anyị 'ekwentị, " N'ihi ọnọdụ iru uju anyị nọ na ya, enweghị ike inye gị ọsịsa arịrọ ka anyị kparịtaụka."

N'otu aka ahụm, Obi kwuru n'ozi o wepụtara n'akara ọba ozi ya n'X, sị, ""Ana m eti ezịnaụlọ mmadụ nwụnarịrị,ụmụakwụkwọ, na ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ aka n'obi."

" Ka Chukwu nye ha ike iji di ihe a fụnarịrị ha ma mee ka ndị merụrụ ahụ gbakee."

N'aka nke ọzọ, onye Nchịkọta ụlọakwụkwọ bú Fada Felix gwara BBC Igbo n'ozi o nyre onye ntakúkó anyí sí, @ n'ihi ónódú iru újú nke anyí nó na ya agahí m enwe here mkparítaúka.@

@Nke ka nke bú na Bishópú bú onye nwe ụlọakwụkwọ enenyegh ikike ime mkparítaúka."

Etu egbeigwe si gbagbuo ụmụakwụkwọ n'ogige ụlọakwụkwọ n'Anambara steeti

Tansi International College,Awka

Egbeigwe agbagbuola ụfọdụ ụmụakwụkwọ 'Tansi International College' dịka ha na-agba bọọlụ n'ama egwuregwu ụlọakwụkwọ ahụ na ngwụcha izuụka.

Tansi International College Awka (TICA) bụ ụlọakwụkwọ sekọndrị ụmụnwoke nke Ụka Katolik hibere n'Ọka, Anambara steeti n'afọ 1999 maka naanị ụmụakwụkwọ bi ebi n'ụlọakwụkwọ.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ ka ụmụaka ahụ na-agba bọọlu iji kwado maka asọmpi ha nwere ka mmiri ji amụma malitere izo.

Egbeigwe so mmiri ahu gbara ụmụaka ahụ, e buga ha n'ụlọọgwụ 'Regina Caeli Specialist Hospital' dị n'Ọka, ma donye ndị nwụrụ anwụ n'ụlọọzu ụlọọgwụ ahụ.

Oge onye ntaakụkọ anyị gara n'ụlọọgwụ ahụ n'ụtụtụ Monde, ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ kwuru na o nweghị nwata akwụkwọ ọdachi ahụ metụtara ka nọ n'ụlọgwụ ha.

Regina Caeli Specialist Hospital, Oka,isiobodo Anambra steeti
Nkọwa foto, Regina Caeli Specialist Hospital, Oka,isiobodo Anambra steeti

Otu onye ọrụ ụlọọgwụ ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya sịrị," E letara ha ụbọchị ahụ, ndị mụrụ ha kpọrọkwa ha lawa ụbọchị ahụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na nani ndị fọrọ n'ụọọgwụ ahụ bụ ndị nwụrụ anwụ bụ ndị o kwuru na e dowere n'ụlọozu ụlọọgwụ ahụ.

Oge a jụrụ ha, otu onye na ndị na-elekọta ozu n'ụlọọgwụ ahụ kwuru na ndị mụrụ ụmụaka ahụ abịala buru ozu ha.

Ọ sịrị,"E buru otu n'ime ha gawa Nsuka, ebe e bugara otu ozu Nteje."Mbọ nile BBC Igbo gbara ịnụta olu onyeiei ụlọakwụkwọ ahụ amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ekwentị ya.

N'otu aka ahụ, mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ndị uweojii Anambra steeti n'okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga azaghị ekwentị ya oge akụkọ a pụtara.