Imo Governorship Election: Ihe mere n'etiti Achọnụ na ndị uweojii Imo steeti

Aha onyonyo, Ihe mere anyị ji gbochie Athan Achonu - Ndị Uweojii
Athan Achonu ji ọkọlọtọ otu pati Labour azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti na ntuliaka ụbọchị 11 Novemba 2023
Nkọwa foto, Athan Achonu ji ọkọlọtọ otu pati Labour azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti na ntuliaka ụbọchị 11 Novemba 2023

Onye na-azọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti na Labour Party bụ Athan Achonu ebola ndị uweojii ebubo na ha na-egbochi ya igara mkpa ya n'achụmnta vootu nke ọ na-achụ.

Achonu kwuru na ya gara isonye n'ofufe nru n'ụlọụka Saint Peter's Anglican Church dị n'obodo Obibiezena, mana ndị uweojii bucha egbe yiri akwa na-eji oji jị ụgbọala 'Armored Personnel Carrier' nọchiere ya n'ụzọ.

"Ha bidoro ịgba egbe aghara aghara, nke mere ka ọtụtụ ndị nkwado anyị gbasasia," Achonu kwuru.

O kwuru na n'agbanyeghi na ya kpọrọ onyeisi ndị uweojii Imo Steeti n'ekwentị kọọrọ ya ihe na-eme, ndị uweojii ahụ nochiiri ya ụzọ ekweghi erube isi n'ihe onyeisi ha gwara ha.

N'ihi nke a, Achonu kpọkuru onyeisiala Bola Tinubu ka o wepu ndi isi ọrụ nchekwa niile n'Imo steeti ma tinye ndị ọhụrụ.

Gịnị ka ndị uweojii n'Imo steeti kwuru maka ebubo Achonu boro ha?

Henry Okoye

Ebe foto si, Henry Okoye/X

Nkọwa foto, Ihe mere anyị jiri gbochie Achọnụ ịga ụlọụka taata - Uweojii Imo steeti

BBC Igbo kpọrọ Henry Okoye bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti maka ebubo a, o kwuru na ihe Achonu kwuru abụghị ihe mere eme.

Okoye kwuru na Gọvanọ Hope Uzodinma eburula ụzọ gwa ndị uweojii na ya na-aga ọgbakọ ichụ nta vootu n'ebe ahụ, mana Achonu agwaghị ndị uweojii na ya ga agakwa ebe ahụ.

"Ndị uweojii mere ihe ha kwesịrị ime iji gbochie ọgbaaghara n'etiti ndị nkwado Uzodinma na ndị nke Achonu," Okoye kwuru.

O kwukwara na ọ bụghị eziokwu na ndị uweojii gbara egbe dịka Achonu si bo ebubo.

Okoye rịọrọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ ịkpa agwa nwereike ike ikụsa udo dị n'obodo.