NLC enyela iwu ụbọchị ise ka e wepụ kọmishọna uweojii n’Imo Steeti ma ọ bụghị ya...

Ebe foto si, NLC/Getty Images
Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) enyela iwu ka e wepụ kọmishọna ndị uweojii n’Imo steeti n’ime ụbọchị ise.
Iwu a bụ na nzaghachị mwakpo a wakporo onyeisi ha bụ Joe Ajaero n’Owerr isiobodo Imo Steeti n’ụbọchị Wenezde.
Ndị otu a kpọrọ oku a na mgbasaozi ha mere n’Abuja, isiobodo Naịjirịa n’ehihie Fraịde.
Ha kpọkwara oku ka a nwụchie onye ndụmọdụ gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodimma n’ọrụ pụrụiche ma ṅụọ iyi na ha ga-agba abụbụọrụ na Naịjirịa niile ma ọ bụrụ na e mezughi ihe ha chọrọ.
Ndị otu a na-ebo gọọmentị Imo steeti na ndị uweojii ebubo maka nwuchi nakwa iti onyeisi ha ihe.
Mana ndị uweojii na gọọmentị Imo steeti agọọla na aka ha adịghị n’ihe mere onye ndị NLC.
Aka anyị adịghị n'ihe mere Joe Ajaero bụ onyeisi NLC - Gọọmentị Imo

Ebe foto si, Andrew Ibe/Hope Uzodimma
Gọomentị Imo Steeti agọọla na aka ha adịghị na nwuchi nakwa iti onyeisi ngalaba Nigeria Labour Congress (NLC) bụ Joe Ajaero n’ụbọchị Wenesde n’Owerri.
Nke a dị n’akwụkwọ ozi kọmishọna mgbasaozi bụ Declan Emelumba wepụtara n’ụbọchị Tọzde ma sị na ndị ahụ na-ebo gọọmentị ebubo bụ ndị okwu asị.
“Gọọmentị asachapụla aka ya na nwụchi nakwa otiti ihe e tiri onyeisi NLC bụ Joe Ajaero n’Owerri n’ụbọchị Wenesde.”
Emelumba kwuru na abụbụọrụ ahụ ndị NLC chọburu ịgba na ụlọikpe adịla mbụ nye iwu ka ha ghara ime nke a.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ maghị ihe Ajaero na ndị otu ha chọọrọ si Abuja bịawa Imo Steeti ebe ndị NLC Imo adịla mbụ kwuo na ha esoghi n’abụbụọrụ ahụ.
Cheta na a nwụchiri ma tie Ajaero ihe n’Owerri na Wenesde mgbe ọ bịara idu ndị ọrụ bekee mee ngagharịiwe.
Ndị uweojii adịla mbụ kwuo na ọ bụghị ha nwuchiri Ajaero, ma sị na ha chekwara ya site n’aka ndị ekperima nọ n’eti ya ihe.
Joe Ajaero kwuru na e tiri ya 'ihe tinka tiri pan'

Ebe foto si, Andrew Ibe
Onyeisi ngalaba jikọrọ ndị ọrụ na Naijiria bụ NLC ekwuola ihe ọ gabigara n'ebe a nwuchiri ya.
N'ime ihe onyonyo BBC hụrụ anya Joe Ajero na mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ n'ime ụgbọala dịka Ajero na-akọwa ihe mere ya.
Onye nọ ya n'akụkụ jụrụ ya "ha tiri gị ihe"
Ọ sị "ha tiri m ihe..."
O dobeghi anya onye "ha" bụ n'akụkọ a dịka ọnụ na-ekwuru Ajero na-atụ ndị uweojii aka na ọ bụ ha nwuchiri Ajero ma megbuo ya n'ebe ha ji ya.
O kwuru si na ugbua, Ajero na-anata ọgwụgwọ dịka a na-agba mgba ịzọpụta anya aka nri ya.
N'ime onyonyo ahụ, Ajero kwukwara na ọ na-aga FMC ebe otu onye ọ mara ga-enye ya aka.
O gosikwara ebe anya ya zara aza na-acha mme mee ka ihe ọbara dị na ya.
Ndị uweojii agọọla akụko na-ekwu na ha nwuchiri Joe Ajero ma wakpo ya.
Gịnị na-eme n'etiti Ajero, NLC nakwa ndị uweojii?

Ebe foto si, NLC
Ngalaba NLC haziburu ngagharị iwe n'Imo steeti maka etu ihe si kwụrụ n'ebe ahụ.
Mana ndị ọrụ steeti ahụ so n'otu NLC zipụtara ozi na ha agaghị eso na ngagharị iwe ahụ n'ihi mkpebi ụlọikpe.
Ka nke a na-aga, ndị isi otu ahụ pụtara tie mkpu na Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo nakwa ndị uweojii steeti ahụ anwuchiela Joe Ajero.
N'ozi ha wepụtara ha kwuru na ndị uweojii chụsasịrị ndị pụtara ime ya bụ ngagharị iwe ma kwụrụ ebe ahụ mgbe ndị ọrụ Uzodimma kpụpụrụ Ajero mgbe ọ bịara ịhụ ihe mere.
Ndị uweojii steeti ahụ mechara ziputa ozi nke ha na-ekwu na ha anwụchighi Ajero kama na ha zọpụtara ya n'ọnọdụ ogbaghara ọ nọ na ya.









