Ihe i kwesịrị ịma maka 'Sam Daddy' ga-eji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa Gọvanọ Imo Steeti

Ebe foto si, Senator Samuel Anyanwu
Otu Peoples Demcoratic Party (PDP) ahọpụtala Sịnetọ Samuel Anyanwu dịka onye ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti nke a ga-eme n’ụbọchị 11 Nọvemba 2023.
A họpụtara Anyanwu na ntuliaka imeụlọ PDP Imo steeti mere n’ụbọchị Wenezde 12 Eprelụ 2023 n’isiụlọọrụ ha dị n’Owerri, isiobodo Imo Steeti.
Onyeisi kọmitii haziri ya bụ ntuliaka bụ Kenneth Okon kpọpụtara aha Anyanwu mgbe ndị ‘delegates si n’okpuruọchịchị 27 nke steeti ahụ jikọtara aka họpụta ya dịka ‘consensus candidate’.

Ebe foto si, Imo PDP Media
Na nnabata nhọpụta ahụ, Anyanwu kwuru na ọ na-azọ ọkwa gọvanọ iji chekwaa Imo ma gbapee ụzọ akụnaụba na nwulite ya.
O kelere ndị PDP nakwa ndị ‘delegates họpụtara ya maka nkwado ha ma sị ma nhọpụta ya gosiri nghọta dị n’etiti pati ha.
Cheta n'izu ole na ole gara aga ka aka chiburu Imo steeti n'aha PDP bụ Emeka Ihedioha sepuru aka n'izọ ọkwa ahụ.
N'ọnwa Jenụwarị afọ 2020, ụlọikpe kachasị na Naịjirịa chụpụrụ Ihedioha dịka gọvanọ ma nyefe ya Hope Uzodinma nke APC na-achị ugbua.
Ihe i kwesịrị ịma maka ‘Sam Daddy’

Ebe foto si, Imo PDP Media
- Sịnetọ Samuel Nnaemeka Anyanwu, onye e ji ‘Sam Daddy’ maara bụ nwafọ Umuduruanyanwu dị n’Obodo Amaimo nke okpuruọchịchị Ikeduru, Imo Steeti.
- A mụrụ ya n’ụbọchị 18 ọnwa Juun afọ 1965 n’ezinaụlọ Chief Sebastian na Ezinne Virginia Anyanwu.
- Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na Central School Amaimo, nke Sekọndịrị na Amaimo High School, gụọ mahadum na mahadum Portharcourt (ngalaba Political Science).
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisioche okpuruọchịchị Ikeduru, n’afọ 2004 ruo 2007.
- Ọrụrụ ọrụ dịke omeiwu nọchịrịanya ndị Ikeduru n’ụlọomeiwu Imo steeti n’afọ 2007 ruo 2015.
- Ọ rụkwara ọrụ dịka Sịnetọ n’ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa mgbe ọ nọchitereanya ndị Imo East n’afọ 2015 ruo 2019.
- Ọ zọrọ ọkwa na ntuliaka imeụlọ iji aha PDP azọ ọkwa gọvanọ n’afọ 2019 mana Emeka Ihedioha meriri ya.
- Tupu a họpụta ya, Sam Daddy bụ odeakwụkwọ pati ha bụ PDP.





