Amaechi Muonagor: Ihe e ji echeta omee ejije a ama ama na Nollywood lara mmụọ

Amaechi Muonagor: Ihe e ji echeta omee ejije a ama ama na Nollywood lara mmụọ

Ebe foto si, Amaechi Muonagor/Facebook

Nkọwa foto, Amaechi Muonagor: Ihe e ji echeta omee ejije a ama ama na Nollywood lara mmụọ
Amechi Muonagor

Ebe foto si, Amechi Muonagor/Facebook

Nkọwa foto, Amaechi Muonagor: Ihe e ji echeta omee ejije a ama ama na Nollywood lara mmụọ

Onye e ji ịkpa ọchi na ime ejije Nollywood maara bụ Amaechi Mounagor anwụọla dịka ọ gbara afọ 61.

Nwamadị a nwụrụ n’ehihie ụbọchị Sọnde 24 Maachị 2024 ka ọ rịachara ọrịa ọnwa ole ma ole.

Nwanne ya nwoke ma bụrụkwa onye oti egwu bụ Tony One Week Muonagor gwara BBC Igbo na ya bụ nnukwu mmanwụ anwụọla.

Mazi Tony one week kwuru na adọbala ozu ya n'ụlọ ebe a na-achekwa ozu.

Ndị omee ejije atọ lakwara mmụọ

Ebe foto si, Muonagor/Okafor Facebook

Nkọwa foto, Ndị omee ejije atọ lakwara mmụọ

Kedụ ihe ị ma maka Amaechi Muonagor?

Amechi Muonagor bụ onye Obosi nke dị na okpuru ọchịchị Idemmili North , Anambra steeti. A mụrụ ya na ụbọchị 20th August 1962, nke pụtara na ọgbara afọ 61 tupu ọlaa mụọ.

Ọ malitere ndụ ya site na ị ga akwụkwọ nke praimari na St. marys Praimari skuul Obosi. Onwetara nzere mmụta “BSC Economics” n’ụlọ akwụkwọ mahadum nke University of Naijiria Nsukka n’afọ 1987.

Maazi Amaechi Muonagor ji otu afọ fee ala Naijiria na mmemme NYSC na afọ 1989. Ngwa ngwa o fechara ala nna ya, onwetara ọrụ bekee na ụlọ ọrụ News Agency of Naijiria.

Mbata ya na Nollywood

O teghị aka na ya bụ afọ 1989, Amaechi Muonagor gbara ọrụ ya na NAN alụkwaghịm wee banye na Nollywood.

Ihe ejije izizi o mere bụ na Taboo nke ọzara Maazi Akụnatakasi.

Ụfọdụ ihe ejije eji mara Amechi Muonagor gunyere, Taboo 1989, Karishika 1998, Igodo 1999, Aki na Ukwa 2002, Evil Word 2015, ma akpọpụta naanị ụfọdụ n’ime ha.

Ọrịa na ọnwụ ya

Na afọ 2016 ka kepu kepu pụtara na soshal midia na Amaechi Muonagor ejighi ahụ nke mere ojiri pụọ na Nollywood ị ga zọọ ndụ ya.

Ọrịa mbụ ekwuru ọ na aya bụ ọrịa shuga akpọrọ diabetes, mana ọnwa ole ma ole gara aga ka nwanne ya bụ Tony oneweek Muonagor na ndị otu ya na Nollywood dịka Kingsley Orji Egbeigwe ji yọọ ohaneze ka ha tụọrọ nwa amadi ahụ ego n’ihi na ọrịa ya gunyere, ọrịa shuga, ọbara mgbali elu, ọrịa nkpọnwụ akụkụ ahụ nakwa ọrịa akụrụ nke akpọrọ kidney n’olu oyibo.

Ezi na ụlọ ya kọwara na ọbụzi ọrịa akụrụ ahụ nke akpọrọ “kidney failure” gburu Amaechi Muonagor n'ụbọchị 4 Maachị 2024 ka ọ gbara afọ 61.

Tony Oneweek Muonagor na Amechi Muonagor, mgbe ọ nọ n'ute ọrịa

Ebe foto si, Muonagor/Facebook

Nkọwa foto, Tony Oneweek Muonagor mgne ọ gara leta Amechi Muonagor n'ụlọọgwụ

Dika nchọpụta siri kwuo, nwaamadị ahụ na-arịa ọtụtụ ọrịa nke gụnyere nsogbu akụrụ (kidney), ọbara mgbali elu, ọrịa shụga nakwa mkpọnwụ ahụ.

Cheta na kamgbe ọnwa ole ma ole gara aga ka ọtụtụ ndị otu ya na Nollywood na-arịọ ego n’aha ya , n’ihi na ya bụ nwaamadị chọrọ enyemaka.

Onye ejije ibe ya bụ Kingsley Orji, Egbeigwe gosiri na soshal midia n'izuụka gara aga na Mazi Amaechi Muonagor anaghizi ekwu okwu nke maọbụ imegharị ahụ.

Ọnwụ Mounagor a na-abịa n'ime izuụka atọ onye otu ya n'ime ejije bụ John Okafor (Mr. Ibu) nwụchara site n'ọrịa.