Odira Nwobu: Ọ bụghị ya na nwaanyị nọ n'oge ikpeazụ ya - Ọkaiwu Chukwudi

Foto Odira Nwobu onye na-eme ejije nwụrụ na mba Saụt Afrịka

Ebe foto si, Odira Nwobu/Instagram

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Dịka akụkọ ọnwụ Odira Nwobu fesara ebe niile n'ụbọchị Mọnde 24 Nọvemba, 2025, ọtụtụ mmadụ ekwuola ihe dị iche iche banyere ihe gburu nwaamadị ahụ.

Iji chọpụta nke bụ eziokwu, BBC News Igbo kpọtụụrụ Ọkaiwu Chukwujekwu Chukwudi, otu onye so Odira Nwobu mee njem na mba Saụt Afrịka bú onye tupenyere anyị azụ ka ihe si wee gaa n'oge ikpeazụ nwaamdị a.

Ọkaiwu Chukwudi gwara anyi na ọ bụ n'ụbọchị Mọnde 17 Nọvemba 2025 ka ya na Odira Nwobu na mmadụ asaa ndị ọzọ hapụrụ Naịjirịa gawa Saụt Afrịka.

"Ụlọọrụ Nwaguatahihia Properties & Homes Ltd kwadoro njem ahụ maka na Odira bụ otu n'ime ndị 'amabassador' na-akwalite ụlọọrụ ahụ."

Odira Nwobu na ọtụtụ ndị ọzọ na-akwalite ngwaahịa bekee kpọrọ 'influencers' gụnyere Untouchable nakwa Ezeugo Global Tv so mee njem ahụ iji kwalite ma gbasaa ozioma ụlọọrụ Nwaguatahihia Properties & Homes Ltd na mba Saụt Afrịka.

Foto ikpeazụ Odira tinyere n'akara soshal midia ya tupu ọ nwụọ

Ebe foto si, Odira Nwobu/Instagram

Ihe mere oge anyị rutere Saụt Afrịka

"Oge anyị rutere Saụt Afrịka, anyị gara ebe nlegharịanya dị iche iche nakwa ebe ndị ọzọ ụmụafọ Naịjirịa bi iji gbasaa ozi ụlọọrụ Nwaguatahihia Properties & Homes Ltd."

"N'ụbọchị Wenezde 19 Nọvemba, 2025, anyị gara ebe nlegharịanya dị na mpaghara Midrand. Oge anyị nọ ebe ahụ, Odira Kwuru na obi na-egbu ya mgbu.

Anyị kpọgara ya n'ụlọọgwụ ebe ndị ọrụ ahụike nọ wee nyochaa ya ma chọpụta na ọ na-enwe ọbara mgbali elu bekee kpọrọ 'high blood pressure'. Ndị ọrụ ahụike kwuru na BP ya ruru 175/105", Ọkaiwu Chukwudi kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ ahụike nyochara Odira ma nye ya ọgwụ. Ha gwakwara ya ka ọ ghara ịṅụ mmaya na-aba n'anya n'ihi ọgwụ ndị ahụ e nyere ya ka ọ na-aṅụ.

Ọkaiwu Chukwudi kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Sọnde ka Odira na onye ọzọ a maara dịka Untouchable nakwa ndị ọzọ sokwa ha mee njem ahụ, gara ogige nlegharị anya bekee kpọrọ 'park'.

Ka ha ruru ebe ahụ, Odira kwuru na ya achọghị ịbanye n'ime igwe 'merry-go-round' dị ebe ahụ maka na egwu na-atụ ya. O kwuru na ihe na-agba oke ọsọ na-atụ ya egwu.

Ndị enyi ya mechara gwa ya ka ọ banye na ya na-atụla egwu ọbụla. O mechara banye n'igwe merry-go-round ahụ. Ka ha hapụrụ ebe ahụ, Odira kwuru na obi na-egbu ya mgbu.

Oge Odira Nwobu nwụrụ

Foto Odira dịka ọ na-aza ekwentị

Ebe foto si, Odira Nwobu/Instagram

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ka ha hapụrụ ebe ahụ, ha gara ogige nkwari atọ bekee kpọrọ 'club' ije nwee aṅụrị.

Ọkaiwu Chukwudi kwuru na ọ bụ nwaafọ Naịjirịa nwee ụlọ oriri na nkwari 'The Zurich Garden Hotel' dị n'obodo Benoni kwadoro ha na klọb ahụ.

Oge ha hapụrụ ebe ahụ, Odira na onye a ma ama ọzọ aha ya bụ Untouchable enweghị ike ịlaghachite n'ụlọ anyị niile nọ maka na chi ejiela.

Ọ bụ nke a mere ka nwaamdị ahụ nwe ụlọ oriri na nkwari 'The Zurich Garden Hotel' ji nye ha ebe ha ga-arahụ n'abalị ahụ.

Ka ha ruru ebe ahụ, ha chọpụtara na Odira enweghịike iku ume nke ọma. Ọ malitere na-eku ume ka onye nwere ọrịa asthma.

"Oge nke a na-eme, ha kpọrọ m n'ekwe ntị banyere ọnọdụ Odira. A gwara m ha ka ha kpọọ ndị ọrụ ahụike ka ha bute ụgbọala ambulance ebe ahụ".

Amalitekwara m ịga ebe ahụ ha nọ ozigbo ozigbo iji mara ihe na-eme.

Oge ụgbọala ndị ọrụ ahụike na dọkịnta abụọ rutere, ha malitere ịgba mbọ ịzọ ya ndụ. Ha ji igwe 'defibrillator' eme ka ha mara ka ha ga-eme ka ọ malite iku ume ọfụma, mana oge adịghị anya, Odira kwụsịrị iku ume. Ọ bụ n'elekere atọ nke ụtụtụ ụbọchị Sọnde 23 Nọvemba 2025 ka nke a na-eme.

Ndị ọrụ ahụike ahụ kwuru na ha agaghị ebuga Odira n'ụlọọgwụ maka na ọ nwụọla.

Ihe anyị mere oge anyị chọpụtara na ọ nwụọla

Foto Odira yi uwe isiagu ọcha dịka ọ kwụrụ n'akụkụ ụgbọala na-acha ọbara ọbara

Ebe foto si, Odira Nwobu/Instagram

Oge Ọkaiwu Chukwudi sị na o rutere ebe ahụ, o kwuru na e jirila akwa kpuchie ozu Odira n'elu akwa.

"Ahụrụ m na Odira anwụọla, ngwangwa m tụgharịrị ya, ahụrụ m na ọ nyụrụ nsi ọkụ n'ahụ ya".

A kpọtụụrụ ndị uweojii. Ngwa ngwa ha rutere ebe ahụ, ha kpọrọ onye ọrụ 'coroner inquest'. Oge onye ahụ rutere, ọ kpọkwara ndị ọrụ gọọmenti Saụt Afrịka.

Ha sere ozu ya foto ma werekwa ụfọdụ ihe bekee kpọrọ 'samples' ma kwuo na ha ga-eme nnyocha 'autopsy' iji chọpụta ihe gburu ya.

Ha buuru ozu ya buga n'ọba ozu ma nara anyị akara ekwentị anyị nakwa ozi ndị ọzọ banyere anyị ma kwuo na ha ga-akpọtụrụ anyị banyere mpụtara nnyocha autopsy ahụ.

"Anyị ka na-eche mpụtara nnyocha ozu Odira".

Ọkaiwu Chukwudi kwuru na ha dị naanị mmadụ ise nọ n'ime ụlọ ebe ozu Odira dị oge ọ nwụrụ ma kwuo na ọ gbara ha gharị etu akụkọ ọnwụ nwaamdị si wee fesaa ebe niile.

O kwuru na ha mere nnyocha ma chọpụta onye izizi kesara onyonyo nakwa foto ozu ya n'akara soshal midia.

Ọ nwụrụ n'elu nwaanyị?

Odira Nwobu ji ekwentị ya n'aka ma kpuru okpu

Ebe foto si, Odira Nwobu/Instagram

Ọkaiwu Chukwudi kwuru na oge o rutere na The Zurich Garden Hotel', ebe ahụ Odira nọ nwụọ, ọ si na ọ chọpụtara na enweghị ihe ọbụla gosiri na ya na nwaanyị nọ oge ọ nwụrụ.

"Ihe onyonyo CCTV ogige The Zurich Garden Hotel' nke ndị uweojii hụrụ, gosiri oge naanị Odira banyere n'ime ụlọ e nyere ya, enweghị oge ọbụla ihe onyonyo ahụ gosiri onye ọzọ batara n'ime ụlọ ya"

"Ihe onyonyo ahụ gosiri oge Odira pụtara n'ime ụlọ ma gwa onye ọrụ 'receptionist' ka e nye ya ihe ọ ga-eji tinye ekwenti ya n'ọkụ latrik

"Ihe m hụrụ n'ime ụlọ ya bụ uwe ya, ekwentị ya, ihe olu ya, mgba n'aka ya na mmiri dị n'elu tebulu".

"Ahụghị m ọgwụike ọbụla maọbụ ọgwụ na-akwalite ịkwa iko".

O kwuru na ọ bụrụ na e nwere nwaanyị ya na ya nọ oge ọ nwụrụ, ndị uweojii ga-ejide onye ahụ ma gba ya ajụjụ ọnụ.