Rita Daniels: Aniọma bụ Igbo, onye na-aza aha Igbo sị na ya abụghị Igbo amaghị ntọala ya

Ebe foto si, Rita Daniels
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Ibrahim Haruna
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Onye ejije Nollywood a ma ama bụ Rita Daniels ekwuola na ọ bụghị ya kwanyere nwa ya nwaanyị bụ Regina Daniel ka ọ lụọ omeiwu na-anọchiteanya 'Delta North' n'Ụlọomeiwu Sinet bụ Sinetọ Ned Nwoko.
Nke a bụ ọsịsa mbụ Daniels bụ onye nne nakwa onye nhazi (manager) Regina Daniels na-asa ebubo ụfọdụ ndị mmadụ na-ebo ya na ọ kwanyere nwaa ya lụọ Sinetọ Nwoko.
N'ọsịsa ajụjụ ma Anioma abụ ndị Igbo, Daniels kwuru sị na ọ bụ omenala ndị aha, asụsụ, nri na ejiji so na ihe e ji ama ndị bụ Igbo.
"Anịọma bụ Igbo. Ka m na-aza Onyinye, ndị Bini ha na-aza Onyinye ka ọ bụ ndị Kalaba na-aza Onyinye?"
"Ị gaazasị aha Igbo sị na ị bụghị Igbo? Ha ga jụọ ndị mụrụ ha onye ha bụ."
"Omenala anyị, ihe anyị na-erị bụ niri Igbo, omenala Igbo.
"Anyị na-asụ nrị, anyị na-adọna ala asụ nri. Mana o nwere ndị na-akwụ ọtọ asụ nrị , ha sị na ọ bụ omenala ha. I ba tee ofe ọgbọnọ, tee ofe onugbu, tee ofe ọha, anyị erie ya. O nweghị ofe ndị Igbo na-eri anyị anaghị eri. Anyị ncha bụ ndị Igbo. Ihe m na-arụ ana m asụ Kalaba?"

Regina Daniel lụrụ Ned Nwoko n'afọ 2019 oge ọ gbara afọ 18, ebe Nwoko gbara afọ 59 nke kpọtụrụ akpọtụ na soshal midia dịka ụfọdụ na-akatọ alumdinanwunye ahụ n'ihi ndi iche dị n'afọ ha abụọ.
Ọtụtụ tara nne Regina ụta mana na mkparịtaụka Rita Daniels and BBC nwere na nsonso a, o kwuru sị na aka ya adịghị ya.
"Mgbe Regina lụrụ di, ụmụ ụwa kpụ m n'ọnụ. Ha sị na ọ bụ m dunyere ya di okenye, m ji kpọrọ ya ga resị agadi nwoke."
"Ihe ha aghọtaghị bụ na amaghị m mgbe ha abụọ bidoro ikwu okwu alụmdi."
"Ihe niile na-eme, mụ onwe m bụ onye ikpeazụ ghọtara ihe na-eme."
Ọ rụtụkwara aka n'ihe mere o ji azọ ọkwa onyeisi otu jikọrọ ndị ejije na Naijiria a kpọrọ 'Actors Guild of Nigeria' na Bekee.
" Ihe m ga-eme dị ọtụtụ. Iweta, njịkọta (unionism) a na-ekwu maka ya, weta ọdịmma ndị ihe ejije, a gaa ọrụ ka ndị ejije 'obere' nwee ike ị na-eriju afọ, na-enye ha ọrụ nke ha, ka nwa obere nke ha rụtara, ka a kwụọ ha ụgwọ."
"Iwetakwa otuobi na ịfụnanya, ka anyị niile na-ekwurịtakọ ọnụ."
Nke bụ nke bụ ebe ndị aka ochie nọ, onye rụchaa ọrụ, o nwee ezumike."
O doro m anya na ndị aka ochie anyị, onye rụchaa, kaa nka, o nweghị ụgwọ ezumike ọbula.
"Ihe ndị a bụ ihe m sị na m ga-etinye anya, onye rụọ n'anwụ, ka o rie na ndo."

Ebe foto si, Rita Daniels/Facebook
Onye bụ Rita Daniel?

Ebe foto si, Rita Daniels/Instragram
Rita Daniel bụ Onye ejije Nollywood a ma ama ma bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ọ bụ onye Ọgwashiukwu dị na Delta Steeti.
Ọ lụrụ di ma mụta ụmụ isii gụnyere onye ihe ejije Nollywood bụ Regina Daniel.
O sonyere n'ihe ejije dị iche iche gụnyere Nkoli Nwa Nsukka, The Enemy I know, Ominili wgz.
Kirie ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo dị n'akụkọ a:






