E nwereike ịtụ 'Diddy' mkpọrọ afọ isii maọbụ asaa n'ebubo ịtụ mgbere ndị akwụna

Diddy yi uwe ọcha n'ime ma yikwasị ya uwe 'suit' na-eji oji nwere akara ogologo dị ọcha.

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Otiegwu mba Amerịka a ma ama bụ Sean 'Diddy' Combs wuchiri n'ụlọikpe dị n'obodo New York bụ ebe a ga-enye ya ntaramahụhụ maka ịtụ mgbere ndị akwụna.

A mara ya ikpe maka ịtụ mgbere ndị mmadụ site n'obodo dị iche iche n'Amerịka maka mmekọrịta ahụ nke ọ kpọrọ "freak-offs", nke gụnyere ndị ọyị ya nwaanyị na ụmụnwoke na-agba akwụna.

Ndị ọkaikpe kwuru na e nwereike ịtụ Combs mkpọrọ ruru afọ isii maọbụ asaa n'usoro iwu na-achịkwa ịma mmadụ ikpe.

Ndị na-ama ya ikpe chọrọ ka ọ nọọ opekatampe ihe ruru afọ iri na otu n'ụlọmkpọrọ, mana ọkaiwu Combs rịọrọ ka e nye ya naanị mkpọrọ ọnwa iri na anọ.

A na-atụ anya na Combs ga-akwa ndị ọkaikpe ahụ okwu tupu e kwupụta ntaramahụhụ ya

N'akwụkwọ ozi Sean "Diddy" Combs degaara ụlọikpe, ọ rịọrọ ụlọikpe ka a gbaghara ya maka agwa ọjọọ ọ kpasịrị ọyị ya nwaanyị bụ Cassie Ventura.

O dere akwụkwọ tupu ụbọchị a ga-ekwupụta ntaramahụhụ ya, ma sị na o kwetere na ụta dịịrị ya n'ihe ọjọọ niile o mere n'oge gara aga.

"N'ezie a nabatara ụta n'ihe ọjọọ niile m mere n'oge gara aga. Nke a bụ afọ abụọ kachasị sie ike na ndụ m, o nweghi onye m na-ata ụta maka ọnọdụ m nọ n'ime ya ugbua na-abụghị onwe m," ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

Diddy gara n'ihu rịọ ọyi ya nwaanyị Cassie Ventura arịrịọ maka iti ya ihe nakwa otu nwaanyị ọzọ gbara ama megide ya a kpọrọ 'Jane'.

Lee ikpe ndị a mara Sean "Diddy" combs

Sean "Diddy" Combs bụ oti egwu a ma ama e boro ebubo ịtụ mgbere nwaanyị maka mmekọahụ mana ụlọikpe sị na aka ya dị ọche n'ebubo ahụ mana ọ dara iwu n'ebubo ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọikpe ekwuola na ikpe amaghị oti egwu a ma ama bụ Sean "Diddy" Combs n'ebubo ime mpụ (racketeering) na ịtụ mgbere maka mmekọahụ (sex trafficking) nke Casandra Ventura na nwaanyị ọzọ.

Kama na ikpe maara ya n'ebubo ịkpọkọta ndị mmadụ maka ịgba akwụna nke metụtara ụmụnwaanyị abụọ a – E nyebeghi ya ntaramahụhụ mana onye dara iwu a nwereike ịga mkpọrọ ruru afọ iri.

Ọkaiwu Casandra bụbu ọyị nwaanyị Diddy kwuru na obi dị ya ụtọ na Diddy bụ onye e ji eji kamgbe ọnwa Sepụtemba a nwuchiri ya ka nwere ohere ịga mkpọrọ.

Mmadụ iri atọ na anọ gbara akaebe n'ikpe a nke gụnyere onye bụbu ọyị ya nwaanyị, ndị ọrụ ya, ndị na-eche ya nche nakwa ndị ọrụ nchekwa gọọmentị.

Ndị na-eleba anya n'ikpe ya a kpọrọ 'jury' mere mkpebi banyere ebubo anọ n'ime ebubo ise e boro "Diddy".

Ezinaụlọ "Diddy" gụnyere nne ya na ụmụ ya bịara n'ụlọikpe ịnụrụ mkpebi ụlọikpe banyere ebubo ndị e boro ya.

Ọtụtụ na-ahụ mkpebi ụlọikpe banyere okwu nwamadị a dịka ihe mmeri nye ya maka na ikpe amaghị n'ebubo ndị ntaramahụhụ dị ukwuu nke bụ ịtụ mgbere maka mmekọahụ a kpọrọ 'sex trafficking'.

Ụlọikpe ga-ekpebi ma a ga-akpọghachị ya n'ụlọmkpọrọ ebe ọ nọ kamgbe ọnwa Sepụtemba a malitere okwu a nke a sị ọnọdụ ya dị ọjọọ.

Ama Cassie Ventura ọyị nwaanyị "Diddy" na ndị akaebe gbara n'ụlọikpe

Sean Diddy Combs

Ebe foto si, Getty Images

Mmadụ atọ gụnyere enyi ya nwanyị ochie agbaala akaebe n'ihe ha ma n'ikpe a na-ekpe otiegwu 'hip-hop' a ma ama bụ Sean 'Diddy' Combs na New York maka ebube ịgba mgbere ụmụnwaanyị maka iji ha agba akwụna.

Cassie Ventura bụ onye anya mmiri juru anya oge ọ na-ekwu okwu gwara ụlọikpe etu o si mata Combs ka ọ dị afọ 19 nakwa ụdị ihe Combs na amanye ya mee.

O kwuur na ọ bụghị mmasị ya isonye na ịkwọkịrịkwọ Comb na-ehibe nke ọ kpọrọ 'Freak offs' mana na ya na-eso nye malite oge ya dị afọ 22 n'ihi ịhụnanya ya nwere ebe Combs nọ nakwa egwu ihe o nwere ike ime ya ma ya jụ.

Ventura kwụrụ na a na-akwụ nwoke ụgwọ ya dịna ya , ebe combs ga na-ekiri ha, ma na-agwa ha ihe ha ga na-eme.

O kwuru na ọ bụ maka na "ahụrụ ya n'anya nke ukwuuu ma chọkwa ịna-eme ya obiụtọ."

O kwuru na egwu na atụ ya ihe o nwere ike ime ya ma ya jụ ime ihe ọ chọrọ.

Ọ gwakwara ụlọike na Combs na-eji ihe onyonyo mmekọ ndị o sere ya amaja ya ime ọzọ.

Ọ gwakwara ụlọikpe etu Comb si akụ ya ihe kwa mgbe kwa mgbe.

Ọ sịrị, Ọ na-akụ ihe n'isi, tie m duka duka."

Onye mbụ nyere akaebe bụ nwoke bụbụ nwa mgbaọtọ a kpọrọ, Daniel Philips bụ onye kwuru na Combs kụrụ Cassie Ventura bụbụ enyi ya nwaanyi ihe ugboro abụọ n'ihu ya.

Ụnyahụ912/5/2025),Daniel Phillip, gwara ụlọikpe etu Cassie Ventura na Combs si kwụọ ya ụgwọ ka ya na Cassie mekọọ, ebe Combs na-ekiri ha ma na-ese ha onyonyo ka ha na-emekọ.

Ndị ọkaiwu Combs gbarlịrị ịjụ Phillip ajụjụ iji mee ka a hụta ya ka onye ekweghị iji okwu ya kpọrọ ihe nakwa iji gosi na Ventura ji anya ya oge ọ na-eme ihe ọ na-eme.

Ọkaiwu Combs bụ Xavier Donaldson jụrụ Philip ma Ventura adị ka onye ṅụrụ ọgwụ ike oge ha zutere, mana Phillip sara sị, "mba."

Donaldson jụkwara Philip sị, "Ọ dabara ịsị na ọ ji anya ya mgbe ihe nile na-eme?"

Philip sara ya sị, "Agaghị m ekwuli otu ahụ."

Ikpe Sean 'Diddy' Combs amalitela n'Amerịka

Sean 'Diddy' Combs

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Sean 'Diddy' Combs

Ikpe onye egwu 'Hip hop' a ma ama bụ Sean 'Diddy' Combs amalitela dịka a na-ekpe ya ikpe na New York.

Ikpe Combs nke Ọkapikpe Arun Subramanian, nọ n'isi ya bụ maka ebubo ịgba mgbere ụmụnwanyị maọbụ ị zịga ha ọrụ akwụna, nakwa ịkpa nkata banyere ya.

Ndị ntaakụkọ BBC bụ Sakshi Venkatraman na Madeline Halpert nọ n'ụlọikpe kwuru na e nwere ogologo ahịrị toro gafe ọtụtụ ụlọ dịka ọtụtụ ndị mmadụ gwunyere kemgbe Ụbọchịụka iji nweta ebe ha ga-anọ.

Ikpeazụ a hụrụ Combs anya bụ izuụka gara aga dịka a na-ahọpụta ndị ga-etinye ọnụ n'ikpe ahụ.

O yi uwe ndị mkpọrọ ma kpuru ugegbe anya. A họpụtara ndị nile ga-etinye ọnụ (jury) n'ikpe ahụ n'izuụka gara aga.

Ebubo ndị ọzọ a na-ebo ya gụnyere ịtọ mmadụ, itinyere ụmụnwanyị ọgwụ ike n'ihe ha riri maọbụ ịmanye ha n'ime mekọrịta nakwa iji ngwaọgụ yie ha egwu.

Mana, Combs agọla n'aka ya dị ọcha n'ebubo ndị a ma jụ ịrọ onye ọbụla biko.