Iji aka ekpe nye maọbụ nara mmadụ ihe ọ bụ arụ?

- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Lagọs
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Etu e siri nwee mba, agbụrụ na asụsụ dị iche iche ka e sikwa nwee omenala na usoro dị iche iche e si eme ihe.
Na mpaghara Afrịka gụnyere Naịjirịa, ọtụtụ mmadụ anaghị anabata ya mgbe mmadụ ibe ha ọkachasị ndị ha tọrọ ji aka ekpe nye maọbụ naara ha ihe.
Ụfọdụ mmadụ na-ahụta nke a dịka enweghị nsọpụrụ ebe ndị ọzọ na-ahụta ya dịka enweghị ezi ọzụzụ n'ezinaụlọ.
Nke a mere iji aka ekpe nye maọbụ nara mmadụ ihe ji akpalite ọtụtụ nsogbu n'etiti mmadụ na ibe ya n'ihu ọha.
Nnoycha BBC mere gosiri n'agbanyeghị ihe ọtụtụ mmadụ chere banyere okwu a, e nwere ndị na-ahụta aka ekpe dịka aka ịhụnanya na aka nkwanyeugwu.
Kedụ etu omenala Igbo ụfọdụ si ahụta aka ekpe?
Oge BBC kpọtụụrụ Ọkankụzi Chigozie Nnabuihe, onye ihe omenala doro anya nke ọma n'ekwentị, o kwuru na mba Chaịna na-ahụta aka ekpe dịka aka ịhụnanya mana mba ndị ọzọ na-ahụta aka ekpe dịka aka na-ezughị oke maọbụ aka rụrụ arụ.
"N'obodo Mbaise dị n'Imo steeti, mgbe ọbụla ị ga-enye Ndị Ichie ọjị, mmanya na ịgọ ọfọ, anyị na-eji aka ekpe. Anyị na-eji aka ekpe agọ ọfọ mana Igbo ndị ọzọ na-eji aka nri agọ ọfọ."
O kwuru na ndị Mbaise na-eji aka ekpe atụ mmanya mana Igbo ndị ọzọ na-eji aka nri.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"Dịka ndị ọzọ na-ahụta aka ekpe dịka aka rụrụ arụ, ndị Mbaise na-ahụta ya dịka ebe obi mmadụ dị. Ọ bụkwa n'aka ekpe ka imeju mmadụ dị."
"Ndị Mbaise kwenyere na ndị nna nna ha nọ na mmụọ, Ndị Ichie na ndị di ndụ na-ahụ onwe ha dịka mkpụrụobi na imeju. Imeju anaghị egbu mkpụrụobi, mkpụrụobi anaghị egbu imeju."
Ọkankụzị Nnabuihe gara n'ihu kwuo na nwunye mmadụ na-anọ ya n'aka ekpe, mana ọ pụtaghị na nwoke kpọrọ nwunye ya asị. Ihe nke a pụtara bụ na nwunye nwoke ọ bụla bụ obi ya, n'ihi na ọ bụ n'aka ekpe ka obi di.
O kwukwara na mgbe a na-enye ndị dị ndụ ihe, a na-eji aka ekpe ma were aka nri kwado.
"Nke a pụtara na a na-eji aka abụọ enye ndị dị ndụ ihe mana mgbe ha adịzighị ndụ e were aka ekpe na-enye ha ihe. Ndị Mbaise na-eji aka ekpe enye Ndị Ichie nwụrụ anwụ ihe ma jiri aka nri nye ndị dị ndụ ihe."
O kwuru na a na-enye onye dị ndụ ihe, na ọ dị mma iji aka nri maka na ọ bụ ọgbọ gị mana mmadụ na-enye okenye ihe, ọ ga-eji aka abụọ.
O kwuru na nke a pụtara na aka ekpe bụ maka ịkwanye ugwu ebe aka nri na-egosi na ọ bụ okenye maọbụ mmadụ dị ndụ.
Mana ndị ọzọ na-ahụta ya na ọ bụ aka nri ka e ji akwanye ugwu ma a na-enye mmadụ ihe.
Ihe dị mkpa mere n'Akwụkwọ Nsọ gbasara aka ekpe na aka nri
Akụkọ ụfọdụ ihe ndị mere n'Akwụkwọ Nsọ na-egosi na e nwere ihe dị iche n'etiti aka nri na aka ekpe. Akwụkwọ Nsọ gosiri aka nri dịka aka nwere ngọzị karịa.
Nke a pụtara ihe n'ihe onye ụkọchukwu Enoch Adeboye kwuru. O kwuru na aka nri mmadụ nwere nnukwu ngọzị karịa aka ekpe ya.
Akwụkwọ Nsọ kwuru na oge Joseph kpọtaara nna ya Jacob ụmụ ya nwoke abụọ - Ephraim na Manasseh - n'akwụkwọ Genesis ka nna ya Jacob gọzie ha.
Joseph nyefere Manasseh bụ nwoke mbụ ya n'aka nri nna ya ma nyekwa Ephraim n'aka ekpe nna ya. Mana Jacob tụgharịrị aka were tụkwasị aka nri ya n'isi Ephraim ma tinye aka ekpe ya n'isi Manasseh.
Akwụkwọ Nsọ gara n'ihu kwuo na Ephraim na Manasseh malitere inwe ọganihu mana Ephraim nwetere ọganihu jiri ugboro iri karịa nke nwanne ya nwoke Manasseh.
Lee ihe ndị okpukperechi Islam kwuru maka okwu a
Otu onyeisi ndị ndu Alakụba n'Imo steeti "chief Imam" bụ Imam Njoku kwuru na nkụzi nke Prophet Mohammed, onye ozi chineke sịrị ka anyị were aka nri na-eri nri, na anyị ejila aka ekpe eri nri ọgwụla maọbụ onye nwere nsogbu n'aka nri ya.
O kwuru na Prophet Mohammed gwara otu nwatakịrị ọ hụrụ ji aka ekpe eri nri ka o were aka nri rie nri.
Ọ kọwara na nkụzi ahụ na-egosi na ọ dịghị mma ka mmadụ were aka ekpe na-enye maọbụ anara mmadụ ibe ya ihe.
Onye ọbụla bụ onye Alakụba enweghị omenala ọzọ n'ihi na ọ bụ nkụzi nke Prophet Mohammed bụ omenala nke anyị.
"Ihe ọbụla ọ kụziri anyị ka anyị na-eso n'ibi ndụ anyị. N'ihi nke a, ọ bụ ihe na-adịghị mma ka mmadụ were aka ekpe nye maọbụ nara mmadụ ihe n'ihi na o sonyeghị na nkụzị nke Islam.
Imam Njoku kwuru sị "na nhụta nkem, o nweghị ihe mebiri emebi iji aka ekpe nye mmadụ ihe maka aka nri na aka ekpe bụ ahụ mmadụ".
Ọ gara n'ihu kwuo na iji aka nri nye mmadụ ihe na-eweta obi aṅụrị mana iji aka ekpe nye ihe na-akpalite echiche na o nwere ihe onye ahụ bu n'obi.
Ihe ndị mmadụ gwara BBC na soshal midịa banyere aka ekpe
Mgbe BBC jụrụ ndị mmadụ ajụjụ na soshal midịa maka ihe ha chere banyere iji aka ekpe nye maọbụ nara ha ihe, ọtụtụ n'ime ha katọrọ omume ahụ ma kọwaa ya enweghị nsọpụrụ.
Nwosu Amaechi Chimezie kwuru na iji aka ekpe nye maọbụ nara mmadụ ihe abụghị arụ, kama ọ na-egosi enweghị nsọpụrụ.
"Onye nwere naanị otu aka nwereike inye mmadụ ihe site n'aka ekpe. Mana onye nwere aka abuo na ejighị ihe n'aka nri ya kwesịrị ịrịọ mgbaghara tupu o were aka ekpe nye mmadụ ihe. Ọ bụrụ na onye ahụ emeghị nke a, ọ na-egosi enweghị nsọpụrụ maọbụ nlelị anya.
Chimezie gara n'ihu kwuo na ọ bụ aka nri ka ndị Igbo ji arụ ọrụaka, ekwe n'aka ma na-edekwa ihe odịde.
Onye ọzọ kwuru ihe o chere bụ Lambert Kenneth Chibuzo. Ọ sịrị na iji aka ekpe enye maọbụ nara ihe na-egosi enweghị nsọpụrụ.
Nancy Ebube Alex kwuru na ọ dịchaghị mma dịka o kwuru na ọ bụ mkpaarị n'ala Igbo.
Alex kwuru: "Ị chọgodu ime ya, ị ga-asi onye ahụ biko."
N'aka nke ọzọ, Martin Uzoekwe kwuru na ọ na-egosi enweghị nsọpụrụ maọbụ ejighị mmadụ kpọrọ ihe.
Emmmanuel Chinonyerem kwuru na: "Iji aka ekpe enye mmadụ ihe na-egosi enweghị nkwanye ugwu. Ọ na-egosikwa na onye ji aka ekpe nye mmadụ ihe "amaghị ihe".
Cletus Obiagwu kwuru: "Ọ bụchaghị ihe ọma iji aka ekpe anara ihe, ọkachasị onye tọrọ gị. Jeso gwara onye nke nọ ya n'aka nri, taa ị ga-anọnyere m n'ala eze ma ọ gwara onye nke nọ ya n'aka ekpe okwu mgbawa obi".
Stan Omenka kwuru na ndị Arabụ kwenyere na aka ekpe kachasị mma iji nye maọbụ naara mmadụ ihe ọ bụla bụ ego.
Mana Nduka Egwuatu kwanyere na aka bụ aka. Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghị ihe ọjọọ dị n'aka mmadụ jiri nye maọbụ nara ihe. "Ihe kachasị mkpa bụ obi e jiri nye gị ihe."
Onete Okoh kwuru na "Ọtụtụ ndị n'akụkụ ụwa anyị kwetara na ịnara maọbụ nye ihe n'aka nri na-eweta ihu na ihe ọma na-egosi nkwanyeugwu na ihe ndị ọzọ."
Mana Ken Uche Ezenma kwuru na ọ bụ ihe mkpaarị na mpaghara Afrịka mana ala Bekee ọ bụghị ihe ọ bụla.









