Etu obodo dị iche iche n'ala Igbo si edu nwaanyị na-ala di ụlọ

Ebe foto si, Doris Agba
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Idu ụlọ bụ otu ihe ndị Igbo na-eme bụ ihe na-enye aka ịkwalite mmadụ, ọkachasị onye ọbụla ritere uru na ya.
Nkọwa idu ụlọ pụtara na obodo maọbụ ezinaụlọ ga-ejikọ aka ọnụ nye nwaada ha na-ala be dị ya onyinye, ihe ga-enyere ya aka ibido ezinaụlọ nke ya.
Cheta dịka ndị Igbo na-edu onye ọbụla mụrụ ọrụ n'aka ha ụlọ, n'ọtụtụ omenala n'ala Igbo ha na-edukwa nwa ha nwaanyị na-ala be di ya ụlọ.
N'akụkọ a, Agba Doris Ukamaka (nee Okpara) nakwa Ijeoma Marizu kọwaara anyị etu ndị obodo ha, ezinaụlọ na ụmụnne ha siri duo ha ụlọ n'oge ha gbachara nkwụ.
Ijeoma Marizu bụ onye Awka dị na gọọmenti okpuru ọchịchị Dunukaofia, n'Anambra steeti, ebe Agba Doris bụ onye Urualla, Ideato, gọọmenti okpuru ọchịchị Nọt dị n'Imo Steeti.
Etu ndị obodo m, ụmụnne m na nna m siri duo m ụlọ - Doris, Ijeoma

Ebe foto si, Doris Agba
Agba Doris Ukamaka gosiri BBC Igbo foto nakwa ihe mere n'oge ezinaụlọ ya duru ya ụlọ n'abalị abụọ nke ọnwa Jenuwari, afọ 2024.
Onye ọzọ gwara BBC Igbo okwu bụ Ijeoma Marinze bụ onye Ifutedunu mana be di ya bụ Umuchu dị n'Anambra steeti.
Dịka Doris Agba na Ijeoma Marinze siri kwuo, obodo ha enweghị usoro ọdịnala ha maara yibere etu e si eme ọgọ mara be maọbụ idu nwaanyị ụlọ.
Dịka Ijeoma Marizu sị na ya lụrụ di n'afọ 2012, gbaa nkwụ n'oge ahụ ma mekwaa emume abụọ ndị ahụ bụ ọgọ mara be nakwa idu ụlọ, mana Doris Agba mere nke ya n'afọ 2024.
N'okwu Ijeoma "e nwere ihe ndị be anyị na-akpọ ọgọ mara be. N'obodo anyị, ọ bụ oge a na-eme ọgọ mara be ka anyị na-edu nwaanyị ụlọ".
"N'oge nke m, ụmụnne m na ụmụnna m bịara mara obodo di m. Ha jiri onyinye dị icheiche bụ ihe e ji ebi n'ụlọ bịa".
Uru ihe niile e nyere m n'oge e duru m ụlọ baara

Ebe foto si, DORIS AGBA
Dịka Ijeoma siri kwuo, Doris Agba gwara anyị sị "ọtụtụ n'ime onyinye ndị ahụ ụmụnne na ụmụnna m zụtara ma wetere anyị n'oge ha bịara ị mara obodo di m bụ nke anyị na-akpọ ọgọ mara be baara anyị uru".
"Ihe ha zụtaara m bụ ihe e ji esi nri nakwa ọtụtụ ihe e ji ebi n'ụlọ. Ọtụtụ n'ime ha bidoro ozugbo ozugbo baara m uru".
"Nke a nyeere mụ na di m aka, ọ bụghị ihe niile e ji esi nri ka anyị gara ahịa zụta".
"Ọtụtụ ndị bịara n'oge ahụ zụtaara m ite, ma efere, ma akwa, ma akwa e ji ehi ụra na ihe ndị ọzọ dị iche iche".
Mmadụ abụọ bụ Ijeoma na Doris kọwara na e wekwara ndị nyere ha ego n'oge a na-eme ọgọ mara be na idu ha ụlọ.
Ihe jikọrọ idu nwaanyị ụlọ na ọgọ mara be
E nwere ihe a na-akpọ ọgọ mara be n'ala Igbo. Nke a bụ emume ndị ọgọ ji aga ịmara ebe nwa ha nwaanyị na-alụ di.
N'ala Igbo, ọ bụ e mechaa ịgbankwụ na ihe niile gbasara ịlụ nwaanyị ma ịkwụ ụgwọ isi ya, emume ikpeazụ na-abụ ọgọ mara be.
Mana nke a abụghị iwu na a ga-eme ya dịka o siri hara ịbụ iwu na a ga-edu nwaanyị ụlọ na ọ na-ala be di ya.

Ọgọ mara be na idu nwaanyị ụlọ bụ mmemme abụọ n'ala Igbo ndị mmadụ adịghị ekwu maka ya, mana ọ bụ ntọnaala Igbo na-enyere aka eme ka ezinaụlọ kwụrụ chimchim.









