Mgbe nkwa ịlụ di maọbụ nwunye nwereike itinye mmadụ n'ụlọnga - Ọkaiwu
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ịlụ di na nwunye na-ebido mgbe e were onye kwere nwanne ya nkwa sị na ya chọrọ ịlụ ya.
N’omenala Igbo, ọ bụ ụmụnwoke ka a maara dịka ndị na-ekwe nwanyị nkwa ịlụ ya. Nke a apụtaghị na-enweghị ọnọdụ nwanyị nwereike ikwe nwoke nkwa ka ha abụọ lụọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ nwere ike ị na-ajụ na e nwere mgbe nkwa ịlụ di na nwunye nwereike ịbụ mpụ ma ọ bụ usoro e ji mee mpụ?
Ọnọdụ mgbawa obi dị na ikwe nkwa alụm di na nwunye

Ebe foto si, Getty Images
Umunwoke ma umunwanyị na-enwete mgbanwa obi n’udi dị icheiche ka ha kwetere na nkwa alụm di na nwunye.
Ọnọdụ ndị ahụ na-ebute iseokwu ọkachasị mgbe e ji ohere ahụ nwere awụwọ napụ otu onye ihe di icheiche.
Ọtụtụ ụmụnwanyị ka e dobere n’ọnọdụ mere ha ekweteghị umunwoke ndị ọzọ na abịara ha dị mana n’ikpeazụ ha a bụrụ ndị na-enweghị dị.
Ụmụnwoke ụfọdụ bụkwa ndị zụrụ nwanyị n’ụlọakwụkwọ maka na ha chọrọ ịlụ ha mana mgbe nwanyị ahụ gụchara akwụkwọ ọ ju na ya a agaghị abụ nwunye ya.
Ọzọ bụ ndị a gbanyere ọlọ aka, nke mere ha ji nọrọ na be nna ha ihe dịka afọ anọ, ọtụtụ bụkwa ndị nọrọ afọ asaa ma mechaa onye kwere ha nkwa agbawaa ha obi.
Ajuju gbasara ọnọdụ ndị a niile bụ ihe onye ọkaiwu Nnenna Anozie ga-enye anyị ọsịsa ya ma kọwaa ka iwu Naịjirịa si ahụ ya.
Lee ka iwu Naịjirịa si ahụ ikwe nwaanyị nkwa hara ịlụ ya
Ọkaiwu Nnenya Anozie kwuru na ọnọdụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ikwe nkwa n’ọha ma hara ịlụ onye ahụ abụghị mpụ ma ọ bụ ịda iwu.
N’okwu ya “iwu Naịjirịa akpọghị ihe nke a mpụ. Iwu Naịjirịa enweghị mgbe o mere ịgbawa mmadụ obi mpụ”.
Anozie na akọwa na e nwere ihe ndị ọzọ dị icheiche ga-eme ọ bụrụ mpụ nwere iduba mmadụ ụlọikpe.
O kwuru na ọnọdụ ndị ahụ nwekwere ike ime onye e mejoro agba akwụkwọ n’ụlọikpe.
Mgbe ikwe nwaanyị nkwa ma hara ịlụ ya bụ mpụ?
Nnenna Anozie kwuru na ebe mpụ sị bata na ya bụ oge o doro anya na ebumnobi nwoke ahụ ma ọ bụ nwanyị ahụ bụ ka o jiri awụwọ na ya chọrọ ịlụm di na nwunye napụ onye nke ọzọ ihe dịka ego na ihe ndị ọzọ.
N’okwu ya “ọ ga-abụ mpụ ma ọ bụrụ na naanị ihe nwoke ahụ bu n’obi oge ọ na-ekwe nkwa ịlụ nwanyị ahụ bụ ka ọ napụ ya ihe. Mana nke a bụ ihe ị ga-eme ka o doo ụlọikpe anya.”.
“Ebe nwoke ma ọ bụ nwanyị jị awụwọ napụ onye nke ọzọ ego, ma ọ bụ ihe dịka ụlọ na ihe ndị ọzọ maka na ọ kwere ya nkwa ịlụ ya bụ ebe ịwụ Naịjirịa ga-abata na ya”.
Nnenna kọwara na ihe iwu Naịjirịa na ahụ oge ahụ bụ “iji awụwọ napụ mmadụ ihe, ma na ọ bụghịzị nkwa ịlụ dị na nwunye”.
Etu onye e mejoro ga-esi nwete ikpe ziriezi n’ụlọikpe
Oge ịhụnanya dị, ọtụtụ ndị mmadụ adaghị edeko ihe ha nyere ma ọ bụ ihe mere onye ha hụrụ n’anya.
Mana ọ bụrụ na onye e mejoro chọrọ ịga ụlọikpe ka o nweike ịnapụta ihe e ji awụwọ napụ ya, o kwesiri na mbụ, ọ ga-enweta ihe aka ebe.
Anozie kwuru na “Ọ bụrụ nwanyị, ọ ga-enwete ihe gosiri na e kwere ya nkwa ịlụ ya ma go ihe onyonyo, foto ma kpọtakwa ndị aka ebe nọ oge nwoke ahụ kwere ya nkwa”.
“Ọ ga-eme ka ụlọikpe mara, ghọta ma hụ na ọ bụ awụwọ ka nwoke ahụ jiri kwee ya nkwa, napụ ya ego ma hara ịlụ ya ga lụọ onye ọzọ”.










