Groom and wedding guests deaths: "Anyị gbachara nkwụ lọta n'ụlọ hie ụra m wee tetazie n'ụlọọgwụ"
Otu nwaanyị a lụrụ ọhụrụ nke gbanahụrụ ọnwụ gburu mmadụ ise n’ime ụlọ ebe ha na-ehi ụra akọwaala ihe o nwereike ichetanwu banyere ihe a mere.
N’ajụjụ ọnụ ọ zara BBC Igbo n’elu ute ọrịa ya n’ụlọọgwụ, nwaanyị a sị na ha richara ihe lakpuo ụra n’abalị mgbe o tetara na ọ hụzie onwe ya n’ụlọọgwụ.
Dọkịta na-elekọta ha n’ụlọọgwụ Igwe Agbata Memorial dị n’Adani bụ Godson Chinedu Ezugwu sị na ọ bụ mmadụ iri na ise ka e butere n’ụlọọgwụ.
Na mmadụ ise n’ime ha anwụọla, ụfọdụ ha anwụchaala tupu ebute ha. Ọ sị na mmadụ asaa agbakeela ma lawa n’ụlọ ha.
Ọ sị na nwoke gbara akwụkwọ ahụ anwụọla kama na a gwabeghi nwunye ya.
Na nnyocha na-aga n’ihu ịchọpụta kpọmkwem ihe gburu ndị a.
Dọkịta a sị na o dobeghi anya ma ọ bụ ikuku nwụrụ gburu ha ka ọ bụ nsi gburu ha.

'Nwanne m nwoke nwụrụ bụ ide ji ụlọ anyị'

Ebe foto si, Obinna Dieke
Chinedu Dieke, nwanne nwoke otu nwoke ya na mmadụ ise ndị ọzọ nwụụrụ dịka lọtara ebe ha gara ịlụta nwaanyị atụọla arịrị na ọdachi ahụ tara isi onye bụ bụ na ezinaụlọ ha na-eri.
Na ngwụcha izuụka, otu nwoke a kpọrọ Obinna Dieke, onye Aka-Utara n' Adani dị n'Okpuru Ọchịchị Uzo-ụwani Enugwu steeti na mmadụ ise ndị ọzọ nwụrụ ka ha lọtara alụmnwaanyị ha gara n'Obollo-Eke dị n' n'okpuru ọchịchị Udenu dịkwa n'Enugwu steeti.
Ụfọdụ ndị na-ebo ebubo na ọ bụ nsi ka ha riri mana ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha ka na-eme nnyocha ịmata ihe mere mmiri ji banye opi ụgbọgụrụ.
Nwanne nwoke nwụrụ anwụ bụ Chinedu Dieke gwara BBC Pidgin na nwanne ya bụ Obinna bụ ojiegoachụego bi na Benue Steeti.
Chinedu tụrụ arịrị na nwanne ya nwoke a nwụrụ bụ ya na-akpata ihe ezinaụlọ ha na-eri.
Ọ gbara ama na nwunye nwanne ya nwoke a gara lụta bụ Nebechi nakwa nwanne ya bụ Goodness Dieke so na mmadụ asatọ ndị ọzọ e bugara ụlọọgwụ na-azọ ndụ ha.
O kwukwara na ọgọ ha nwoke bụ Joseph Ogbonna, na ụmụ ya nwoke abụọ bụ Chijindu na Obinna Ogbonna nwụrụ n'ọdachi ahụ mana nne ụmụaka ahụ dị ndu ma soro na ndị nọ n'ụlọọgwụ.

Ebe foto si, Getty Images/BBC
Ka a gbawara ụzọ ka a hụrụ ozu di, ndị ọbịa ise si mmemme alụmdi lọta' - Igwe obodo Adani
Igwe obodo Adani bụ ebe otu nwoke na-akwado ịlụ nwaanyị nakwa mmadụ ise ọzọ nwụrụ n'ụzọ ezighi ezi etinyela ọnụ n'okwu ahụ.
Igwe Ezeudo Patrick Okafor gwara BBC sị "ọ bụghị agbamakwụkwọ ka ọ gara, ọ bụ ịga debe ego be ndị ọgọ ya na ọ ga-abịa lụrụ nwa ha".
Ọ bụ ya bụ mmemme ka ha si na ya laghachite, na-aṅụkọ mmanya were si ebe ahụ nabaa ụra.
Dịka o si kọ, anụghị lu ndị ahụ n'ụtụtụ nke mere ka agbawaa ụzọ, ma chọta ebe ụfọdụ nwụrụ ma ụfọdụ dị ndụ. Ha kpọziri ndị uweojii bịara nye aka buga ndị ahụ ụlọọgwụ.
"Anyị amaghị ihe mere mana ugbua ndị uweojii tinyere anya na ya, anyị nwereike ịchọpụta ihe mere n'ezie" ka o kwuru.

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe edepụtala akwụkwọ ozi maka ọnwụ mmadụ isii nwụrụ n'obodo Adani.
Ha kwuru na gụnyere mmadụ isii ahụ nwụrụ, mmadụ asatọ ọzọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ n'ihe ahụ mere nke dị n'okpuruọchịchị Uzo-Uwani, Enugwu Steeti n'ụbọchị Satọde.
Kọmịshịna steeti ahu bụ Ahmed Ammani ekwuola ka amalite nyocha ngwa ngwa banyere ya bụ ọdachi mere.
Cheta na akụkọ kwuru na onye agbataobi chọtara mmadụ asaa gụnyere di na nwunye na ndị ọbịa ha ebe ha kubiri n'imeụlọ dịka ha si emume alụmdinanwunye ha lọta.
Onye agbataobi ahụ tipuru mkpu enyemaka nke mere ka eburu ndị ahụ gawa ụlọọgwụ ebe nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ na mmadụ ise ọzọ nwụrụ.
Akụkọ kwukwara na nwunye ọhụrụ ahụ so na ndị na-anata ọgwụgwọ n'ụlọgwụ dị icheiche na steeti ahụ.
Ihe ndị uweojii chọpụtarala
- Ọnwụ mmadụ isii a ezighị ezi, ọbụghị chi ha gburu ha.
- Otu onye n'ime ndị a nwụrụ bụ Obinna Dike dị afọ iri atọ na otu, ọ mechara ịgba nkwụ ya n'ụbọchị 26 nke ọnwa Ọgụstụ a.
- Mgbe ọ mechara, ya na ezinụlọ ya na ndị enyi ya lara n'ụlọ ma na-enwe kwa aṅụrị.
- Dịka chi foro, enweghị onye ọbụla n'ime ha pụtara ezi n'ụtụtụ.
- Nke a mere ka a gbaaka ụzọ ha, were hụ ka ha tọgbọ ma ihe ọfụfụ juru ha n'ọnụ.
- E buuru ha gawa ụlọọgwụ ebe ekwuru na mmadụ isii n'ime ha anwụọla.
- Mmadụ asatọ ndị nke ọzọ na-anata ọgwụgwọ nke ọma n'ụlọọgwụ
Ammani tiri ndị ezinụlọ ya bụ ihe metụtara aka n'obi ma sị ka mmadụ niile dere duu ma nyere ndị uweojii aka na nyocha ha.










