Valentine Messages: Lee di na nwunye birila ruo afọ 70 ka na-eme 'Love nwantịntị'

Aha onyonyo, Valentine's Day: Lee di na nwunye birila ruo afọ 70 ka na-eme 'Love nwantinti'

James na nwunye ya bụ Elisabeth Ani ebiela ka di na nwunye ruo afọ iri asaa ma nwee ezigbo ifunanya nye onwe ha.

Ha bụ ndị Amankpu, Obinagu-Uwani, Akpugo, Enugu steeti.

James kwuru na ọ bụ ebe ha na-egwu ọnwa ka ọ hụrụ nwunye ya Elisabeth.

O kwuru na ọ bụ n'afọ 1951 ka ọ lụrụ nwunye ya mana ụmụ ha kwuru na ha alụọla tupu afọ ahụ.

Elisabeth nwunye ya kwuru na ọ na ya na di ya na-ebi n'udo na-eweghị nsogbu ọbụla.

Otu nwa ha nwoke bụ Sunday Ani kwuru na ha abụọ mụrụ ụmụ iri na abụọ mana mmadụ asaa n'ime ha nwụfuru.

N'ọnụ Sunday, "nne m na nna m alụọla ruo ihe karịrị afọ iri anọ na ụma tupu ha agba akwụkwọ n'ụlọụka n'Eprelu 2007."

"Ọ bụ ezigbo agwa ha na-akpa mere ka ha nọrọ ruo ugbua dịka di na nwunye."

Ihe ndị ọzọ ha kwuru dị n'ime ihe nkiri a dị ebe a.

Ihe mere akụkọ a ji dị mkpa

Akụkọ a di mkpa dịka a na-eme emume Valentine, nwoke ụwa mara dịka onye gosiri ihunanya nke ukwu dịka akụkọ ifo si kwu.

Mana Chika Okpalike bụ ụkọchukwu na ọkammụta n'African Traditional Religion gwara BBC okwu maka onye bụ Valentine a ụwa kpụ n'ọnụ ma na-ekwu na enwere ọtụtụ akụkọ so ya.

O di mma ka ndị ntoroọbịa mara udiri ihunanya ha kwesiri ịṅyomi karịa ma nke nwerike ibutere ha ọghọm.