St Valentine's Day: Akụkọ St Valentine bu akụkọ ifo - Ụkọchukwu Katọlik

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị Valentine bụ ụbọchị eji egosi ịhụnanya ọkachasị n'etiti nwoke na nwaanyị.
Ọtụtụ ndị na-eji onyinye maọbụ were ihe na-acha ọcha maọbụ ihe na-acha mme mme echeta ya bụ ụbọchị.
Anyị na Chika Okpalike Ụkọchukwu na ọkammụta n'African Traditional Religion' tinyere anyị ọnụ na ya bụ okwu.
Kedụ onye bu Saint Valentine a?

Ebe foto si, Getty Images
Chika Okpalike kwuru na akụkọ maka Saint Valentine dịka nkọmịrịkọ na nkọkịrịkọ nke bekee nwereike ịkpọ Myth maọbụ Legend.
Nke a pụtara na-enweghị ihe a na-atụzịrị aka were sị maọbụ eziokwu maọbụ asị.
Kama o kwuru na a na-anabata ya site n'okwukwe na ọ bụ etu o siri mee.
Akụkọ maka Valentine dị ọtụtụ
Okpalike kwuru na enwere ọtụtụ akụko maka onye bụ Saint Valentine kama ọ bụ abụọ ka ndị mmadụ kacha akọ.
Saint Valentine nke Emperor gburu
Okpalike gwara anyị na ụfọdụ na-akọ na Saint Valentine bụ nwa okorobịa bụ onye nke Kraịst ejidere ka egbuo n'oge ihe dịka 4th century.
Ọ kọwara sị " kama oge ahụ nwa onye ọchichị bụ Emperor nọ n'ọrịa mana Valentine kpere ekpere were gwọọ nwatakịri ahụ ọrịa ya".
O kwuru na akụkọ ga-kwara n'ihu sị na mgbe Valentine gara ị nara ikpe ọnwụ ya, ọ dere nwatakịrị agbọha ahụ akwụkwọ ozi iji kosi ya na ya hụrụ ya n'anya.
Saint Valentine nke gbara ndị agha akwụkwọ
Chika Okpalike kọwara na-enwere akụkọ ọzọ bụkwa na-enwere Saint Valentine ọzọ onye ụkọchukwu na-agba ndị agha akwụkwọ oge Rome nọ n'ọchịchị ebe dị ukwu.
Okpalike kwuru sị, " Saint Valentine na-agba ndị agha akwụkwọ na nzuzo n'ihi na gọọmentị Rome akwadoghị ndị agha ha ịgba akwụkwọ oge ahụ".

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ọ mere nke a amaka ihunanya ọ na-ahụ n'etiti ndị a.
Akụkọ ndị a na ndị ọzọ bụ nkọmịrịkọ na nkọkịrịkọ
Mmeme ochie nwereike ị bụ ebe emume valentine siri bido
Emume Lupercalia: Okpalike kọwara na nke a abụ mmemme ndị Rome na-eme oge gboo.
Okplaike kwuru sị, " Aha Lupercalia sitere n'okwu latin abụọ nke otu n'ime ya bụ Lupus".
O kwuru na Lupus pụtara nkịta ọhịa nke bụ Wolf n'okwu bekee.
Ọ kọwara sị, "Rome oge gboo na-eche na ọ bụ Lupus a zụlịtere ndị chọpụtara mba Rome aha ha bụ Romulus na Remus".

Ebe foto si, Getty Images
Kama Okpalike kọwara na nyocha agba ọhụrụ na-egosi na Wolf nereike ị bụ ụkpụrụ ezoro ezo nke bụ Code n'okwu bekee.
Ọ sị, "Lupus a pụtara onye akwụnakwụna n'ụzọ ụkpụrụ zoro ezo bụ code".
O kwuru na ihe nke a pụtara n'akụko Lupus nwereike ị bụ na ọ bụ ndị akwụnakwụna zụlitere mmadụ abụọ a chọtara mba Rome.
Okpalike kọwara na Lupercalia bụ mmemme ndị Rome na-eme n'ọnwa Febuwarị iji cheta ihụnanya nkịta ọhịa a gosiri Romulus na Remus ndị ha si chọtara mba ha.
Okpalike kwuru sị, "Ọ na-adanye karị sitye n'ime ụbọchị iri na atọ ruo ụbọchị iri na ise nke Febuwarị".
O kwuru sị, "Ọ bụ chị ha na-efe maka ọmụmu (Fertility) na chi ha na-efe maka ahụike ha ka ha na-emere mmemme a".
Okpalike kwuru na a na-eji uhie ọcha nke pụtara ị dị ọcha na uhie mmemme eme emume Lupercalia mgbe ochie.
Ndị BBC depụtara na emume Saint Valentine danyere n'oge eji echeta ọmụmụ na ihunanya ma gụnye kwa na ọ bụ kwa oge a na-echeta chi Zeus na Hera.
Ihe jikọrọ emume valentine na-etu aha ọnwa Febuwarị siri bịa
Okpalike kọwara na "Februa bụ aha ụtali esi n'akpụkpa ewu emepụta".
O kwuru na a ụmu nwoke na-eji ya bụ Februa apịatụ ụmụ nwaanyị ndị na-achọ nwa ,
Ha na-eche kwa na nwa okoroọbịa were ụtalị metụ nwaanyị n'ahụ na nwaanyị ahụ ga-ahụ ya n'anya.
Etu Cupid siri bata emume Valentine

Ebe foto si, Getty Images
Okpalike kọwara na Cupid bụ chi Ịhụnanya ndị Greek.
Okpalike kọrọ akụko were sị, "Cupid hụrụ chi ha ọzọ aha ya bụ Apollos n'anya".
O kwuru na akụkọ na-ekwu na Cupid gbara Apollos ụta n'obi ka ọ were hụ ya n'anya.
Nke mere na ọtụtụ kwenyere na ọbara si na obi Apollo pụta gosiri ịhụnanya ọ bụ ya mmere eji uwe na ihe na-acha mmemme eme emume Saitn Valentine.

Ọ bụ ya mere iji ahụkarị obi na-acha mme mme maọbụ onye ji ụta agba na ya bu obi.
Pope hiwere mmemme Saitn Valentine
Chika Okpalike kọwara na ọ bụ bụ pope Galacius nke mbụ bụ onye bidoro mmemme Saint Valentine n'afọ 496 AD.

Ebe foto si, Getty Images
ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Pope Gelacius wetara emume Lupercalia were nke Saitn Valentine dochie ya.
Kama enweghị kwa ihe a ga-eji kwado na ya bụ ihe bụ eziokwu.
Kedụ ụka ndị na-eme emume Saint Valentine.
Ndị ụka nke CMS bu Angịkan, ndị orthodox na ndị nke Luther na-eme emume Valentine.
Ndị ụka katọlịk a na-eme emume Saint Valntine?
Ọ bụ emume ncheta Saint Cyril ma Saint Methodius ka ndị ụka katọlịk na-eme.

Ebe foto si, Getty Images
Na-agbanyeghị na Saint Valentine nọ na Kalenda ndị Saint a na-echeta n'ụbọchị ahụ, ndị ụka katọlika anaghị eme mmemme Saint Valentine n'ụbọchị ahụ.
Kedụ ka ihe dị ugba?
Ọkammụta Okpalike kwuru na ugbụa ị ga-ahụta emume ndị Rome ochie ma hụta kwa emume ndị nke Kraịst n'oge valentine ugbua.
Okpalike kwuru ma kwusie ya ike were sị na okpukpere chi nke Kraịst anaghị akwado ịhụnanya mmekọrịta ma ọ bụghị n'etiti di na nwunye.

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru sị, " Ugbua, ihe a na-eme bụ mmekọrịta ihunanya ma nke ụka kraịst na-akwado bụ mgbe nwoke na nwaanyị lụrụ onwe ha".
Kama onye ụkochukwu Katolịk ọzo nke ngalaba Dominican bụ Felix Udolisa kwuru na emume Valentine bụ emume eji echeta ịhụnanya.
Udolisa kọwara sị, "na-agbanyeghị na ọtụtu na-eji ya echeta ihụnanya nke mmekọrịta ahụ, ọkachasị n'etiti ndị ntoroọbịa. E nwere ike iji oge emume valentine kuziere ndị ntorobia ihe bụ ihunanya".
Ọ kọwara na ndị ntorobia a ga-emecha bụrụ nne ma o bụ nna nke mere na ọ ga-ebido n'oge kuziere ha maka ihunanya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
- Lekki Toll Gate: Ndị uweojii ekwuola na ọbụ maka ịda iwu Covid ka e ji nwuchie Mr Macaroni na ndị ọzọ
- Baboon in Awka: Ejidela enwe 'JohnBull' tara nwata akwụkwọ n'Awka, Anambra State
- Etu ndị omekome si gbagbuo mmadụ atọ n'ọgbakọ emere na Nkpor - Ndị uweojii Anambra steeti
- Eastern Security Network: A kpọrọ ya ESN maọbụ Amọtekun, ha niile bụ maka nchekwa onwe - Enyinnaya Abaribe













